Gaa na ọdịnaya

Ifeoma Onyefulu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ifeoma Onyefulu
mmádu
Ụdịekerenwanyị Dezie
Mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereIfeoma Dezie
Aha ezinụlọ yaOnyefulu Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya31 Maachị 1959 Dezie
Ebe ọmụmụOnịchạ Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaEnglish Dezie
Ọrụ ọ na-arụodee akwụkwọ, children's writer, osee foto Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
Nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Ifeoma Onyefụlụ (amụrụ ya n’afọ 1959) bụ onye odee akwụkwọ ụmụaka nke Naịjirịa, onye odee akwụkwọ na ndị na-ese foto A maara ya nke ọma maka akwụkwọ eserese ya nke na-egosipụta foto banyere ndụ ime obodo n'Afrịka. [1]

A mụrụ Onyefụlụ na Ọnịcha, Anambra, Naịjirịa. [2] Ọ bụ onye so na agbụrụ Igbo nke Nigeria. O bi na UK. O tokwara na Naịjirịa. Ọ lụrụ di were kwaga na Britain na 1982. Ọ debanyere aha na ụlọ ọrụ ọzụzụ foto na Earls Court nke Britain. Ọ mechara hapụ usoro nlekọta azụmaahịa ọ na-agbaso, n'ihi ọ nwetara ọrụ foto na Britain. Ọ malitere site na ịselụ ndị ụlọ akwụkwọ akụkọ foto. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-ese foto na Caribbean Times site na 1986-87. [1] . Na 1991 ọ bidoro ịde ihe. [3] Ọ nwere ụmụ abụọ nke na-emetụta ihe ndị ọ na-ede. Mmekọrịta ya na ụmụ ya na oge agụmakwụkwọ ha mere ka ọ na-ede ihe gbasara ihe ụmụaka nke ọma. Na nchịkọta ihe ụmụaka na-amasị ya nke ọma. [4]

Akwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]
  • A Is for Africa: An Alphabet in Words and Pictures, Cobblehill Books (New York, NY), 1993.[5]
  • Emeka's Gift: An African Counting Story, Cobblehill Books (New York, NY), 1995.[6]
  • Ogbo: Sharing Life in an African Village, Cobblehill Books (New York, NY), 1996, published as One Big Family: Sharing Life in an African Village, Frances Lincoln (London, England), 1996.[7]
  • Chidi Only likes Blue: An African Book of Colors, Cobblehill Books (New York, NY), 1997.[8]
  • Grandfather's Work: A Traditional Healer in Nigeria, Millbrook (Brookfield, CT), 1998, published as My Grandfather Is a Magician: Work and Wisdom in an African Village, Frances Lincoln (London, England), 1998.[9]
  • Ebele's Favourite: A Book of African Games, Frances Lincoln (London, England), 1999.[10]
  • A Triangle for Adaora: An African Book of Shapes, Dutton Children's Books (New York, NY), 2000.
  • Saying Goodbye: A Special Farewell to Mama, Millbrook (Brookfield, CT), 2001.
  • Welcome Dede!: An African Naming Ceremony, Frances Lincoln (London, England), 2003.
  • Here Comes Our Bride!: An African Wedding Story, Frances Lincoln (London, England), 2004.
  • African Christmas, Frances Lincoln (London, England), 2005.

A họrọ akwụkwọ mbụ ya bl "A is for Africa" dịka ọkachamma akwụkwọ mmụta ụmụaka.[11] Ọ tụọla ugo mmeri ugboro abụọ nke gụnyere; The Children's Africana Book Award, maka akwụkwọ ya nke a "Here Comes The Bride" na 2004 ya na kwa akwụkwọ ya ọzọ bụ "Ikenna Goes to Nigeria" na 2008.[12]

Ebensidee

[dezie | dezie ebe o si]

mpụga ọzọ

[dezie | dezie ebe o si]