Ijeoma Oluo

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Ijeoma Oluo
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereIjeoma Dezie
aha ezinụlọ yaOluo Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Disemba 1980 Dezie
Ebe ọmụmụDenton Dezie
nwanneAhamefule J. Oluo Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, activist Dezie
ụdị ọrụ yaoru nta akuko, feminism, women's rights, social justice, Racism Dezie
ebe agụmakwụkwọLynnwood High School Dezie
Ebe ọrụSeattle Dezie
webụsaịtịhttps://www.ijeomaoluo.com/ Dezie

Ijeoma Oluo ( /ɪ dʒ i oʊ m ə oʊ l ụ oʊ / ; a mụrụ ya na afọ1980) bụ onye edemede Naijiria-American. Ọ bụ ya dere edemede So You Want to Talk About Race [1] Ọ na edee kwa ra ndi The Guardian , Jezebel, The Stranger, Medium edemede, na The Establishment, ebe ọ bụkwa onye na nchịkọta akụkọ gburugburu . [2] [3] [4] [5] [6]

Amụrụ ya na Denton, Texas ma na ebe ọ bi bụ Seattle, Washington. Na afọ 2015, a kpọrọ Oluo aha di'ka otu n'ime ndị mmadụ kacha wee di'nkpa na Seattle, Na afọ 2018, a họọrọ ya di'ka otu n'ime ụmụ nwanyị iri ise kachasị ike na Seattle. [7] Oluo na ede edemede gbasara misogynoir, intersectionality, online harrassment, na Black Lives Matter Movement, agbụrụ, akụnụba, ịzụ ụmụ, Feminism, na -elekọta mmadụ ikpe ziri ezi . [1] [8]

Ijeoma Oluo

Ọtụtụ n'ime akụkọ edemede ya nke na-akatọ agbụrụ na nkpuchi nnabata olu ụmụ nwanyị agago gburugburu n'mba ni'le nke bekee na akpo viral, dịka egosiri na akụkọ nke mkparịta ụka ya na Rachel Dolezal . [9] [10] [11] Oluo etinyela aka na arụmụka banyere echiche ya maka ịkpa oke si'te na agbụrụ nke wunyere awunye na ka esi achi obodo. [12]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ mbụ[dezie | dezie ebe o si]

Ijeoma Oluo bidoro ọrụ ya na teknụzụ na izu ahịa na ntanetị nke bu digital marketing . [5] Ọbido ide ihe mgbe agba chara afọ iri atọ [13] mgbe Trayvon Martin nwụrụ na afọ 2012, onye nke ya na nwa ya nwoke, Malcolm, n'otu afọ n’oge ahụ. Egwu bara ya ahu maka nwa ya nwoke na nwanne ya nwoke nke obere, ndi na eti egwu ma na-aga njem oge ahu. Oluo malitere ịkekọrịta echeche di ya na'obi ogologo oge site na blọgụ ọ na ede mbu mbu maka nri. Ọ kowaa malite akụkọ ndị a dịka mmetụta dị ukwuu na ụdị edemede ya. Na'oge ahụ, o nwe kwa olile anya na akụkọ gbasara onwe ya ga-abụ ụzọ iji jikọọ ma ke'kọ ya na ndị ọcha na obodo Seattle. Oluo choputata na obi adịghị ya mma na nzaghachi o nwetara na mbụ, maka na ọtụtụ ndị enyi ya gbahapuru ya ka'ma ha ga etinye ọnụ n'okwu ndị ọ malitere. Agbanyeghị nkaa, ọtụtụ ụmụ nwanyị ndi ojii ndị ọ maghi ndi ha wu, kpọrọ ya na igosipụta ekele ha. Dị ka nke a na'eme, a bịara mara ya nke ọma. Ọzọkwa, n'ihi nke a ọtụtụ mmadụ chọrọ ịkekọrịta ederede ya ma chọọkwa ka ọ dee ihe ndị ọhụrụ.

Ode akwukwo akuko na nkowaa[dezie | dezie ebe o si]

Ndekọ Podcast ahụ Lovett or Leave it na Jenụwarị 27, 2018 na aterlọ ihe nkiri Moore na Seattle. Jon Lovett (n'aka ekpe) na Akilah Hughes (nke abụọ site n'aka ekpe), ya na ndị ọbịa Lindy West (nke abụọ site n'aka nri) na Ijeoma Oluo (n'aka nri).

Edemede Oluo na akụkọ ya pụtara na akwụkwọ akụkọ The Guardian na The Stranger si na afọ 2015 ruo 2017, o dekwaarala akwụkwọ maka Jezebel, Medium na The Establishment, akwụkwọ di'na Medium nke Oluo nyeere aka ịmalite; ọ bụ onye nchịkọta akụkọ-na-gburugburu. Ya ede mkpuchite isiokwu dị ka misogynoir, intersectionality, mmaja nmadu na ntanetị , na Black Lives Movement, agbụrụ, akụ na ụba, ịzụ ụmụ, Feminism na mmadụ ikpe ziri ezi .

Ọtụtụ n'ime akụkọ ya erutela akụkụ uwa ni'le, n'ihi nnukwu uru na ebumnuche di'mkpa ọ'na kọwata maka agbụrụ ya na ka esi nhichapu olu na uche nke ụmụ nwanyị ojii na United States, dị ka akọwapụtara na ajụjụ ọnụ Oluo nke Eprel na afọ 2017 nke Rachel Dolezel . [9] [10] [11]

Oluo kwụsịrị ide ndi The Stranger edemede na July afọ 2017. Ebumnuche ya maka nkaa gụnyere mkpebi akwụkwọ ahụ iji bipụta edemede banyere ntughari nmadu si na nwoke fe nwanyi nke Oluo kwuru na "nwanyị cis dere edemede ahụ enweghị ihe nmụta zụrụ oke na asụsụ dị mkpa iji kpachara anya na-ekwu banyere isiokwu ahụ n'ụzọ na-agaghị etinye nkewa na ịkpa ókè. Edemede ahụ gbakwunyere uche otu dọkịta kwenyesiri ike maka sayensị njakịrị, yana ama ama maka nkewa na ịkpa ókè ndi kwenyere na ntughari nmadu si na nwoke fe nwanyi.” Agbanyeghi na Oluo gbadoro ukwu na ikwu okwu maka otutu nsogbu ndi mmadu, okwuru na ndi na na-eso ma'na ekwenye na ụzọ ya kwesiri inwere onwe ha na ikwuputa ma kwuo eziokwu banyere njehie dika na ihe gbasara agwa nwoke na nwanyi, ịkpa oke agbụrụ ma ọ bu nkewa site n’aka ndi ama ama, n’enweghi nkatọ maka na onye obuna nwere ike ime njehie. Ọ sịrị na anyị onwe anyị na emejọ níme ihe ahụ anyị na-rụtụ aka na ndị ọzọ. O dere na afọ 2015 na " e bụ onye na anaghi akpa ókè agbụrụ apụtaghị na ị naghị eme ya mgbe ụfọdụ, kama ọ pụtara na ị ga-amata ma na-alụ ọgụ maka ịkwụsị ịkpa ókè agbụrụ na níme onwe gị ka ị na-alụso otu ihe ahụ agha na ndị ọzọ". Ọ gara n’ihu ikwu banyere mkparịta ụka banyere eziokwu na-egbu mgbu na-obi nke di n'ime akwụkwọ ya ọ dere na afọ 2018. Ọ sịrị n'ime akwụkwọ ahụ na, "Nke a apụtaghị na ị ga-apịa onwe gị ihe rue mgbe ebighi ebi maka n'ka."

Oluo dere na blọgụ ya na Nọvemba afọ 2017 na USA Today rịọrọ ya ka o dee op-ed (nkea bu uche ya) mana naanị na ọnọdụ na okwu edemede Oluo na-arụ ụka maka usoro ziriezi maka ikpe gbasara arụrụala mmekọahụ karịsịa okwu banyere okwu metụtara ihe gbasara ndi Me Too Movement, nke mere na ndị nchịkota okwụ ahụ gwara ya na ha "chọrọ mpempe edemede na-ekwu na ya ekwenyeghị n'usoro ikpe, na ọ bụrụ godi na achụọ ụmụ nwoke ole na ole na-emeghị ihe ọjọ ọbụla na ihụ ọrụ ha, ọ bara uru maka ichebe ụmụ nwanyị." Oluo di njikere ịgbahasị isiokwu ndi USA Today na ndị eboro ebụbo nọ na nnukwu ihe egwu dị ize ndụ na ikike mmadu ha n'ihi adịghị eso usoro dị mma. Oluo gara n'ihu kwuo na o ọ gaghị eme ihe ha cho maka an okwenye na ikike mmadu na usoro dị mma. Ka Oluo dechara banyere ka nya na ndi USA Today si wee ga, Washington Post zaghachi site n'aka Christine Emba nke kwupụtara ma kwusie ike na ọnọdụ Oluo na oke ngabiga nke usoro a bụ ihe na emebi ikike nke ndị a na-amaja na agọnarị ikpe ziri ezi kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ gara n'ihu n'okwu na ngagharị iwe nke di ka Oluo kwuru bụ "ịgba mbọ idozigharị uche maka ụmụ nwoke". Na mbụ, Oluo ekwuola na ebumnuche dị otú a maka usoro kwesịrị bụ ka, "egbochie ụmụ nwanyị ịbịa n'ihu tupu ọtụtụ ụmụ nwoke ga-aza ajụjụ maka omume ha".

Nwa oge nkwụsị Facebook[dezie | dezie ebe o si]

Ndi Facebook kwụsịtụrụ Oluo ide ihe ebe ahụ na nwa oge na afọ 2017. O jiri mkparị amu na njakiri kwuo otú ọdịghị enwe nmasi na obi ịru ala ịnọ n'akụkụ ndị ọcha na-eyi okpu 'cowboy' na Twitter oge mbụ ọ jere na Cracker Barrel Na nzaghachi, ọ natara ọtụtụ narị iihe ozi egwu na ozi metutara na ịkpa ókè agbụrụ na Twitter yana akaụntụ Facebook ya. [14] [15] Twitter kpochapu ru tweets ndi ahụ ma machibido ndị na-emebi usoro ọrụ ya, mana Oluo kwuru na Facebook emeghị ihe ọ bụla ruo ụbọchị atọ. A kwụsịrị akaụntụ ya mgbe Oluo zipụrụ nseta ihuenyo nke ozi ahụ, na egosi na Facebook adịghị eme ihe ọ bụla iji nyere aka. Facebook mechara rịọ mgbaghara ma nwetaghachi akaụntụ ya, na-ekwu na nkwụchi ahụ bụ ihe na-ezighi ezi. Oluo kwuru na agbachila ihe ndekọ Facebook nke ọtụtụ ndị isi ojii ndi ọzọ maka otu ihe ahụ ma na oge ọ bụla Facebook kwuru na ọ bụ mmeghe, na ha amaghi ụma eme ya. [16]

Akwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

The Badass Feminist Coloring Book[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2015, Oluo bipụtara akwụkwọ Badass Feminist Coloring Book jiri Amazon's CreateSpace . [17] Ihe oru ngo a bidoro site na Oluo ise oyiri nke ndi nwanyi huru ihe gbasara onwe ha n'anya dika ndi kwesiri nnwere onwe. Ndị enyi gbara ume, ọ bidoro mkpọsa Kickstarter iji mepụta akwụkwọ osise ihe iri anọ na ise. [18] Tupu oge a gafere, oru ahụ wetara ihe karịrị ebumnuche ya okpukpu ahụ. [19]

Ndi Feminist gosipụtara na Akwụkwọ Badass Feminist Coloring Book gụnyere Lindy West (nwunye nwanne nwanyị Oluo), [18] onye na akpa ọchị Hari Kondabolu, [19] onye edemede Feminista Jones na onye egwu Kimya Dawson (nke The Moy Peaches ). [20]

So You Want to Talk About Race[dezie | dezie ebe o si]

E bipụtara akwụkwọ Oluo So You Want About Race na ụbọchị iri na isii Jenụwarị na afọ 2018 site na akara ngosi nke Seal Press nke Perseus Books Group 's Da Capo . [21] [22] [23] [24] [25] [26] Na edemede '' New & noteworthy '', The New York Times kọwara akwụkwọ ahụ dị ka nke "na-anata ajụjụ ndị kasị njọ gbasara agbụrụ, site na obi ọjọọ ndị uwe ojii ruo onye nwere ike iji ikwu okwu ma obụ kpọ nmadụ okwu ọjọ ahụ bido na 'N'." [27] Oluo bidoro oru a na ntuzi aka nke onye nnochite anya ya, bu onye nyere ya ndụmọdụ ide akwụkwọ ntuziaka iji kparita ụka maka isiokwu ya ga na-ede mgbe nile. Oluo lara azụ na mbụ, na-enwe mmetụta na ọ kwuola ugboro ugboro maka agbụrụ karịa ka ọ chọrọ - ka chisi ka ọ na-agwa ndi edemede Bitch okwu, ọ sịrị, "Echee'm maka oge ole'm chọrọ iji nọrọ, dịka nwanyị ojii, na-ekwu maka agbụrụ, ma ya buru ịde otu akwụkwọ dum na-ekwu maka agbụrụ. Ọ siri m ike. " [13] Mana ka ọ tụlere echiche maka ihe ahụ, ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị mmadụ na aju ya ajuju di iche iche na isiokwu agbụrụ, ọ kpebiri na akwụkwọ nwere ike inyere ya aka ka ọ ghara ịza otu ajụjụ ahụ ọtụtụ ugboro; ọkachasị na akwụkwọ ga aka erute ndị mmadụ n'ụzọ dị iche karịa ọrụ ntanetị.

Bustle gụnyere So You Want to Talk about Race na ndepụta akwụkwọ iri na anọ na-atụ zi aka bu kwa akwụkwọ mbụ ụmụ nwanyị dere. Ha toro ka Oluo si ede edemede "n'ụzọ na - egosi obi ya dum",[28] yana tinye kwa akwụkwọ ahụ na ndepụta nke iri na isii akwụkwọ kachasị mma na akụkọ na-abụghị akụkọ ifo na Jenụwarị afọ 2018.[29] Harper's Bazaar kpọkwara ya aha na ndepụta nke akwụkwọ kacha mma iri nke afọ 2018 "Oluo na ede akwụkwọ na egosi ntuziaka kwụ ọtọ na mkparịta ụka gbasara agbụrụ na America."[30]

Ihe oru ndi ozo[dezie | dezie ebe o si]

Oluo rụkwara ọrụ dị ka ọkà okwu, onye akụkọ na onye na ákpa ọchị. [31] [32] A gbara Oluo ajụjụ ọnụ na obere nkowa akụkọ na afọ 2016 , Oh, I Get It na Slamdance, Seattle Lesbian & Gay Film Festival na ndị ọzọ, banyere ahụmịhe ya dịka onye na'akpa ọchị nwanyi idina nwanyi ma ọbụ nwoke idina nwoke.

Esemokwu[dezie | dezie ebe o si]

Oluo abanye go na ọtụtụ mgbagha na esemokwu banyere echiche ya maka ịkpa ókè agbụrụ nke wunyere awunye, si'te na echiche na ihe edemede So You Want to Talk About Race nke na-ekwu na ịkpa ókè agbụrụ ndi ọcha n'ebe mmadụ ndị ọzọ dị njọ ma bụrụ nke kachasị mkpa ka e'dozie karịa ịkpa ókè agbụrụ nke ndị ọzọ na -enwe na ebe ndị ọcha no ka Rod Dreher si wee na akatọ. [12]

Ntụrụ ụgo[dezie | dezie ebe o si]

Seattle Met kpọrọ aha Oluo di'ka otu n'ime ụmụ nwanyị iri ise kacha nwee mmetụta ọfụma na Seattle na afọ 2018. Seattle Magazine kpọrọ ya otu n'ime ndị mmadụ kacha nwee mmetụta na Seattle na afọ 2015, maka "mkparịta ụka ya nke na adaba n'ụzọ ni'le, ọchị dị egwu oji mkparịta ụka ya na oke iwe ọ na-egosi n'ụzọ ziri ezi n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ". Ha gara n’ihu ikwu na ọ bụ "otu n'ime olu kachasị ike na Seattle maka ikpe guzo ọtọ na-elekọta mmadụ." [7] Bustle gụnyere Oluo na "Ndị edemede iri na atọ ga-elele na 2018". [33]

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Amụrụ Ijeoma Oluo na Denton, Texas na (1980-12-30 ). Nna ya, Samuel Lucky Onwuzip Oluo si Nigeria, nne ya bụ Susan Jane Hawley onye ọcha si Kansas. Nwanne Oluo nke obere bu onye egwu jazz Ahamefule J. Oluo, onye luru onye ode akwukwo si na Seattle - Lindy West . Ijeoma Oluo lụrụ Chad R. Jacobson site na afọ 2001 ruo 2005, onye ọmụrụ nwa mbụ n'ime ụmụ ya abụọ. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Western Washington ebe ọ nwetara asambodo BA na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na 2007.

Ọrụ ndị a ma ama site n'aka Ijeoma Oluo gụnyere:

  • "The Heart of Whiteness: Ijeoma Oluo Interviews Rachel Dolezal, the White Woman Who Identifies as Black", Onye Ebube, Eprel 19, 2017
  • So You Want to Talk About Race, Da Capo Press, 2018, ISBN   So You Want to Talk About Race So You Want to Talk About RaceOCLC   986970684
  • Akwukwo ederede na Stranger (2015–2017)
  • Ndekọ edemede na The Guardian (2015–2017)
  • The badass feminist coloring book, CreateSpace Independent Publishing Platform, 2015, ISBN   The badass feminist coloring bookOCLC   941812206

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Dubenko, Anna (April 21, 2017). Right and Left: Partisan Writing You Shouldn't Miss. Archived from the original on October 7, 2017.
  2. "Required reading: "So You Want to Talk About Race"", January 17, 2018.
  3. Ijeoma Oluo. Archived from the original on December 26, 2017.
  4. Oluo, Ijeoma (April 19, 2017). The Heart of Whiteness: Ijeoma Oluo Interviews Rachel Dolezal, the White Woman Who Identifies as Black.
  5. 5.0 5.1 Sanders, Julia-Grace. "Ijeoma Oluo: The Making of One of Seattle's Most Influential Voices", May 18, 2016.
  6. Botton, Sari (March 20, 2017). 'You Can Help in Ways That I Cannot': Ijeoma Oluo on Putting Your White Privilege to Work Against Racism. Archived from the original on December 22, 2017.
  7. 7.0 7.1 Norimine, Hayat (January 31, 2018). The 50 Most Influential Women in Seattle. Archived from the original on February 4, 2018.
  8. Enjeti, Anjali. "'I Might as Well Start a Fire': Author and 'Internet Yeller' Ijeoma Oluo on Talking About Race", January 12, 2018.
  9. 9.0 9.1 Hopper, Nate. "What Ijeoma Oluo's Interview With Rachel Dolezal Reveals About White Privilege", April 20, 2017.
  10. 10.0 10.1 Adeshina, Emmanuel. "Woman's Viral Tweets Calls Out White Liberal Women's Use of This Racially Coded Word", July 27, 2017.
  11. 11.0 11.1 Radke, Bill. "Rachel Dolezal 'erases black women.' Ijeoma Oluo takes the conversation back".
  12. 12.0 12.1 Dreher, Rod. The Pink Terror.
  13. 13.0 13.1 Dionne, Evette. "Ijeoma Oluo Wants to Help You Talk About Race", January 18, 2018. Retrieved on February 3, 2018.
  14. Oluo, Ijeoma (August 2, 2017). Facebook's Complicity in the Silencing of Black Women. Archived from the original on November 6, 2017.
  15. Guynn, Jessica. "Facebook apologizes to black activist who was censored for calling out racism", August 3, 2017.
  16. Coldewey, Devin (August 2, 2017). Another black activist, Ijeoma Oluo, is suspended by Facebook for posting about racism. Archived from the original on September 9, 2017.
  17. Groetzinger, Kate. "Never feel ashamed of coloring as an adult with this badass feminist coloring book", August 14, 2015.
  18. 18.0 18.1 Frank, Priscilla. "A Badass Feminist Coloring Book For The Powerful Ladies In Your Life", June 25, 2015.
  19. 19.0 19.1 Mosthof, Mariella. "Three Words: Feminist Coloring Book".
  20. Badal, Kelly Phillips. "'Badass Feminist Coloring Book' Raises $16K on Kickstarter", July 8, 2015. (in en-US)
  21. "Nonfiction Book Review: So You Want to Talk About Race by Ijeoma Oluo. Seal, $27 (256p) ISBN 978-1-58005-677-9", November 13, 2017. (in en)
  22. Ferguson, Jenny (January 19, 2018). So You Want to Talk About Race. Archived from the original on February 3, 2018.
  23. Harwood, John (January 14, 2018). So You Want To Talk About Race (en). Archived from the original on February 3, 2018.
  24. Keane, Erin. "Required reading: "So You Want to Talk About Race"", January 17, 2018. (in en-US)
  25. Beason, Tyrone. "Seattle author begins a crucial discussion in 'So You Want to Talk About Race'", January 20, 2018. (in en-US)
  26. Bhatt, Jenny. "REVIEW: An Incisive Look at Race -- and How We Should Be Talking About It", February 1, 2018. (in en-US)
  27. "New & Noteworthy", January 18, 2018. (in en-US)
  28. Miller, E. Ce. "14 Books By First-Time Women Authors To Look Out For In 2018".
  29. Long, Stephanie Topacio. "The 16 Best Nonfiction Books Of January Will Prepare You To Fight Back".
  30. Hubbard, Lauren. "10 New Books to Add to Your Reading List in 2018", November 30, 2017.
  31. Constant, Paul. "Your Week in Readings: The best literary events from May 17th - May 23rd", May 17, 2017.
  32. City Arts Staff. "'Fun Home' at the 5th, an exhibition of inflatable art, West Seattle Summerfest, a punk-rock private eye movie and more", July 10, 2017. (in en-US)
  33. Miller, E. Ce. "13 Authors That Have Big Things Coming In 2018".