Ijipùtù Ọkpụ
Oge/afọ mmalite | 4. millennium BCE |
---|---|
kọntinent | Eluàlà |
mba/obodo | Egypt |
historical region | Ancient Near East, Nile Valley Civilizations |
nhazi ọnọdụ | 29°48′0″N 31°18′0″E |
na-esochi | Prehistoric Egypt, Predynastic Period of Egypt |
oge obidoro | 4. millennium BCE |
oge ngwụcha | 395 |
mụrụ ya | Egyptology |
dissolved, abolished or demolished date | 30 BCE |
ọdịdị ala nke isiokwu | geography of Ancient Egypt |
akụkọ ihe mere eme nke isiokwu | history of ancient Egypt |
Akụ na ụba nke isiokwu | economy of Ancient Egypt |
udi maka maapụ | Category:Maps of ancient Egypt |
Ijipùtù Ọkpụ bụ̀ òbìbiị̀hè Òlìleanyanwụ̄ Afụ̀rịkà. Ọ nọkwùsàrà ụkwụ Ànyị̀m̀ Naị̀lụ̀, nọdokwa nà ebe bụ òbòdò Ijipùtù ụ̀gbụ̀ â. Òbìbiị̀hè Ijipùtù Ọkpụ sò Ijipùtù m̀buụ̀zọ̀ị̀ta àzụ bị̀a, ya à yịkọta nà ogè gbara AO (afọ̀ ochie) 3100 gburù (nà òtù a sì gụrụ afọ̀ nà ndoziogè Ijipùtù nà ǹkịtị̀), m̀gbè ọ̀chịchị yị̀kọ̀tàrà Ijipùtù Elu nà Àlà nà òkpurù ọchịchị Menēzụ̀ (onye a nà a màkwa kà Namà). Ijipùtù mèrè nwe usòrò ọchịchị ezè doro è do, mànà ùkè dàkwara ha na ọ̀tụtụ èhì ha mà kà Èhì Àdịnàètitì, ǹke bụzị: Ọchịchịezè Nka ǹkè Èhì Òze Gboo, Ọchịchịezè Ètitì ǹkè Èhì Òze Ètitì nà Ọchịchịezè Ọhụrụ ǹkè Èhì Òze Ìkpeàzụ.
Ijipùtù rùrù isi ike ya nà Ọchịchịezè Ọhụrụ m̀gbè ọ chị̀chàrà oke ibe àlà Nubiyà nà òkè àlà Ọ̀wụ̀waanyanwụ̄ Ǹso ǹkè ukwu, ya e sozị nà o jì nwanyọ̀ ba èhì ndara ike ya. Nà ọdịdị ya, Ijipùtù dàrà nà òkpurù mbìchi ọ̀tụtụ ndị ọbị̀à merịrị ha, ndị bụrụ ndị Hikusoòsù, ndị Libiyà, ndị Nubiyà, ndị Àsịriyà, ndị Pezhìà Àkimīnìdì, nà ndị Màsèdoniyà nà òkpurù Àlèzandà Ọ̀kààkâ. Ndị Gùriìkì Ọchịchịezè Tọ̀lèmeè bị̀kọ̀tàrà nà mmecha ọnwụ Àlèzandà Ọ̀kààkâ, dùo Ijipùtù ruo afọ̀ AO 30 m̀gbè, nà òkpurù Kùlìyòpatụ̄rà, ọ dàrà nà aka ndị Àgbàtàike Roòmụ̀ bụzịe ibeòbòdò Roòmụ̀.
Ǹgàn'ihu òbìbiị̀hè Ijipùtù ọkpụ sìtù ike ya ị gbanwè sòo ọnọ̀dị ìyere Ànyị̀m̀ Naị̀lụ̀ nà ihì ǹnyèmaka ọrụ ugbo. Ìdèjummiri amààma nà ndozima ndere ubì mmiri nà ìyere dị ọmụmụ bubàtàrà ọkụkụ njuka, ǹke mere kà mbà ko è kò.