Jacqueline Amongin

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jacqueline Amongin
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereJacqueline Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Jụn 1982 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the Parliament of Uganda Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịNational Resistance Movement Dezie

Jacqueline Amongin (amụrụ na 26 June 1982) bụ onye omeiwu Uganda. Ọ bụ onye otu National Resistance Movement, onye e nyere ihe nrite Mandela Leadership Prize maka "ịkwalite ezi ọchịchị na mmepe n'Africa".

Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Amongin n'afọ 1982. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Makerere na 2005 dị ka Bachelor of Environmental Management . Ọ rụrụ ọrụ na Pan African Movement dị ka onye ọrụ ǹkwukọrịta n'afọ sochirinụ ruo otu afọ, tupụ ọ bụrụ onye ọrụ mmemme Pan African Movment nke Global ruọ n'afọ 2010.[1]

N'afọ 2011, ọ sonyeere ndị omeiwu nke Uganda ma n'afọ 2013 ọ sonyeera ndị omeiwu Pan African.[1] Ọ na-anọchite anya Ngora District.[2] A họpụtara ya ọzọ na 2016 ebe ya na ndị omeiwu Ugandan anọ ndị ọzọ Anifa Kawoya, Prọfesọ Ogenga Latigo, Felix Okot Ogong na Veronica Babirye Kadogo nọ n'oche ya.[3]

N'afọ 2018, a họpụtara ya n'ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 5,000 ka e nye ya otu n'ime mmadụ iri na asaa Mandela Leadership Prize. E nyere onyinye ahụ maka ọrụ ya na ndị omeiwụ Pan African "na-akwalite ezi ọchịchị na mmepe n'Africa". Ọ bụ ụlọ ọrụ Mandela Institute dị na Paris nyere onyinye ahụ.[4] Ihe nrite ahụ kwuru na o guzobere "Jacquline Amongin Development Foundation" (JADEF) ma too ihe ọ rụzuru na ndị omeiwu.[5]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2020-02-28.
  2. Uganda- Rwanda tensions overshadow debate on EAC integration (en-US). The Independent Uganda (2019-11-15). Retrieved on 2020-02-28.
  3. Five Pan African Parliament MPs Sworn In – Parliament Watch. parliamentwatch.ug. Retrieved on 2020-02-28.
  4. MP Amongin awarded Mandela Leadership Prize (en). Daily Monitor. Retrieved on 2020-02-28.
  5. Parliament praises MP Amongin for winning Mandela Prize – theinsider.ug (en-US). Retrieved on 2020-02-28.