Jane Egerton-Idehen

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jane Egerton-Idehen
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereJane Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụinjinia Dezie
ụdị ọrụ yaelectronics Dezie
ebe agụmakwụkwọHarvard Business School Dezie
Jane Egerton-Idehen na Singapore
Jane Egerton-Idehen

Jane Egerton-Idehen bụ onye isi ụlọ ọrụ Avanti Communications. na Nigeria ma burụkwa Direktọ na-ahụ maka azụmahia na West Afrika. [1] Ọ sobụ n'otu ndi nnukwu ndi isi na Ericsson na Ghana na Liberia. [2] [3] O nwetara digiri nke injinia site na University of Nigeria, Nsukka,nakwa digiri nke MBA site na Warwick Business School ọzọ kwa o nwetara digiri nke akpọrọ executive education site na Harvard Business Schoo . E dere aha ya dika otu n' ime # 50LeadingLadiesinCorporateNigeria n'afọ 2019. Ọ so n'otu ndi bidoro otu IEEE Women in Engineering (WIE) na Nigeria, Nke a bụ otu na-ahụ ma na-achịkọta ụmụ nwaanyị bụ injinia na ndị gụrụ sayensị nakwa inyere ụmụ aka na-eto eto iji hụ na ha gbasoro agụ akwụkwọ iji bụ injinia. [4]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Dika anyi kwuru na mbụ Egerton-Idehen nwetara nzere digiri Bachelor of Engineering na Electronic engineering site University of Nigeria, Nsukka n'afọ 2001. Ọ gara Mahadu Havard di na Warwick ebe ọ gụrụ maka ka esi azụ ahia, akpata ego n'afọ 2007 wee nwet nzere nke MBA n'afọ 2010. O nwetakwara nzere digiri ọzọ nke Education site n'otu ụlọ akwukwọ Havard ahụ.[5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Egerton-Idehen bidoro ọrụ ya dị ka Injinia nguzo ụwa akpọrọ 'Earth Station Engineer n'ụlọ ọrụ Spar Aerospace Limited di na Lagos, Nigeria ozugbo ọ gụchara Mahadum. Ọ gara ụlọ ọrụ Ericsson,dị na Nigeria be ọ rụrụ dika Manaja na-ahụ maka mmepụta ngwaahịa n'afọ 2003 wee gba maka nchekwa ego azumahia ụlọ ọru a bido n'afọ 2008 ruo 2010. Ọ were ọkwa dika onye isi na-ahụ maka mmekọrita ụlọ ọru MTN Nigeria nakwa ndị na-azụ ya ahia tumadị Nokia Siemensn'afọ 2010 wee ruo 2012 mgbe ọ laghachiriazụ na Ericsson dị ka nnukwu onye isi nke na-ahụ maka ego Ericsson nke Ghana na Liberia ji azụkọrita ahia site n'afọ 2013 ruo 2017 tuppu ọ laghachite azụ na Nigeria dika onye isi na anọchịte anya ndi Avanti Communications na Nigeria. . [6]

Ndụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Egerton-Idehen alụọla di ma mụta ụmụ abụọ, Otu nwoke na otu nwaanyị. [7]

Nsinweta[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Rural connectivity can drive e-commerce, agric – Avanti boss", 6 August 2019. Retrieved on 8 August 2019.
  2. "LLA 50 leading ladies in corporate Nigeria", 18 May 2019. Retrieved on 8 August 2019.
  3. "Ericsson Ghana empowers female student engineers", 11 March 2015. Retrieved on 8 August 2019.
  4. "#LLACareerQuestionnaire Country Manager at Avanti Communications Ltd. Says 'Ruby Woo' By MAC is Her Go To For That "Badass" Feel!", 6 May 2019. Retrieved on 8 August 2019.
  5. "LLA 50 leading ladies in corporate Nigeria", 18 May 2019. Retrieved on 8 August 2019.
  6. "TELECOMWhy Government Should Encourage Telcos in Nigeria- Jane Egerton-Idehen", 11 October 2017. Retrieved on 8 August 2019.
  7. https://agln.aspeninstitute.org/profile/1196