Joy Ogwu

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Joy Uche Angela Ogwu (amụrụ n'Ọnwa asatọ n'afọ 1946) bụ bu onye n'anọchite anya obodo Naịjirịa n’ịhe gbasara obodo ndị ọzọ. N’afọ 2008, ọ bụkwa ya bụ onye nnọchite anya Naịjịrịa n’ọgbakọ nke ndị bekee kpọrọ United Nations, na mba New York.[1][2] Ọ bụ ya bụ nwaanyị nke mbụ nke jidegoro okwa nnọchite anya Naịjịrịa n’ọgbakọ United Nations. [3]Tupu ya e were ọkwa dị ka onye nnọchite anya, Ogwu, onye nke si na Delta Steeti arụọla ọrụ dika onye isi ụlọ-ọrụ ihe gbasara Naịjịrịa na mba ndi ọzọ.[4]


Ogwu bụ onye na-enye ndị United Nations ndụmọdụ n’ihe gbasara ị webilata aka na ngwa agha, ma dekwaa ọtụtụ akwụkwọ nke na akwalite mba Afrịka n’ihe gbasara mba Latin Amerịka. O bụkwa, n’oge gara aga, onye isi oche nke ndị nlekọta ụlọ ọrụ a na-akpọ United Nations Institute for Disarmament Reasearch (UNDIR) na bekee.[5] She is the former Chair of the Board of Trustees of the United Nations Institute for Disarmament Research (UNIDIR).[5]

N’ọnwa nke asatọ n’afọ 2006, onye isi ala Naịjịrịa n’oge ahụ, bụ Olusegun Obasanjo, nyere ya ọkwa nke onye nnọchite anya obodo n’ihe gbasara mba ndị ọzọ.

N’afọ 2008, Ogwu were okwa dika onye n’anọchite anya obodo Naịjịrịa na United Nations dị na New York. N’ọnwa nke asaa n’afor 2010, ya na nke iri n’afọ 2011, Ogwu bu onye isi nke ndi United Nations n’ihe gbasara nchekwa obodo.

O nwetara akwụkwọ asambodo nke mbụ nke a na akpọ Bachelors na bekee; ya na asambodo nke abụọ nke a na akpọ Masters na bekee na mahadum Rutgers. Mgbe o mesiri, o nwetara asambodo dokinta na Mahadum nke Legos din a Naịjịrịa. Nafọ 1977; n’out aka ahu ọ banyere n’otu ihe gbasara ndi mba ọzọ na mahadum Legos.

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Home", Permanent Mission of Nigeria to the United Nations, New York. (in en-US)
  2. "New Permanent Representative of Nigeria Presents Credentials". (in en-US)
  3. Joy Ogwu | Ambassador Series Lecture (en-US).
  4. III, Editorial (2019-04-27). Joy Ogwu, Bolaji Akinyemi: Where are they now? (en-US).
  5. 5.0 5.1 Joy Ogwu: Quintessential Diplomat (en-US) (2014-07-19).