Kansụl Mba nke Ụmụ nwanyị (Chile)
E guzobere nzuko umu nwanyi n'uwa site na njikọta nke òtù ụmụ nwanyị abụọ e guzobere na 1915. Okirikiri igu akwukwo umunwanyi ma ọ bụ Círculo de Lectura de Senoras, nke Amanda Labarca guzobere na Santiago, na Club de Senoras (ogbako umunwanyi), otu ụmụ nwanyị na-agụ akwụkwọ nke ụmụ nwanyị nọ n'ọkwá dị elu guzobere. Ha abụọ kwalitere ikike ụmụ nwanyị nwere ịtụ vootu, mgbe ogbako umunwanyi rịọrọ ndị pati ndi nnọchiteanya ka ha kwado ikike ụmụ nwanyị, chọọchị ahụ yiri ha egwu ịchụpụ ha.[1] Mgbe nke a gasịrị, òtù ụmụ nwanyị abụọ ahụ jikọtara ọnụ iji guzobe nzukọ umunwanyi nke uwa 1919.
Ọ bụghị naanị nzukọ ụmụ nwanyị, dịka e guzobere Civico Femeninio (pati nke oha umunwanyi) n'otu afọ ahụ, mana ọ ga-abụ nzukọ ụmụ nwanyị kachasị na Chile. Ọ bụkwa nzukọ ụmụ nwanyị mbụ a haziri ahazi na Chile.
Ọ rụkwara ọrụ maka mgbanwe nke iwu obodo iji melite ikike ụmụ nwanyị, ọkachasị iji wepụ ikike nna, nke ụmụ nwanyị nọ n'okpuru nlekọta nke di ha.[1] N'afọ 1925, o nyere aka nweta iwu iwu a maara dị ka Maza Law (nke aha ya bụ Senator José Maza) na ukpuru iwu ndi oha nke gbochiri ikike nke nna maka nne. O mere ka ụmụ nwanyị nwee ike ịgba akaebe n'ihu iwu ma nye ụmụ nwanyị lụrụ di ikike ijikwa mkpụrụ nke ọrụ ha.
Ọ kwalitere ọganihu dị nro na nke na-aga n'ihu na-aga na nha nhata. N'ikwekọ na nke a, ha kwadoro ka e jiri nwayọọ nwayọọ webata ikike ịtụ vootu, na ikike ịtụ voutu nke obodo tupu ikike ịtụ voolu zuru oke.[1]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ 1.0 1.1 1.2 Tétreault, Mary Ann, Women and Revolution in Africa, Asia, and the New World