Kehinde Fadipe
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Kehinde |
ụbọchị ọmụmụ ya | 17 Jụn 1983 |
Ebe ọmụmụ | Port Harcourt |
Asụsụ obodo | Bekee |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | omee, onye nhazi ndu ihe nkiri |
ebe agụmakwụkwọ | Royal Academy of Dramatic Art |
Kehinde Fadipe onye amụrụ na abalị iri na asaa n’ime onwa isii n'afo 1983 bụ onye omee Britain.
Ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Kehinde Fadipe na ụlọ ọgwụ St Mary London na 1983. O nwetara BA (Hons) na English Literature & Language tupu ọ gụọ akara nke abụọ na Royal Academy of Dramatic Art nke ọ gụchara na 2009. [1]
Ọrụ mbụ ya bụ na 2009 mgbe ọ pụtara na ihe nkiri ejije Lynn Nottage bụ Ruined nke meriri nrite Pulitzer . Akụkọ Nottage gbakwasara ukwu n'ikpali mmekọahụ n'ike na Democratic Republic of Congo . Na 2011 o sonyere na akụkọ gbasara mpụ nke BBC televishon bụ The Body Farm nke gbadoro ụkwụ na akwụkwọ Patricia Cornwell na 1994 The Body Farm. O sonyeere usoro nke atọ nke ihe nkiri ụmụaka na-eto eto Misfits ebe ọ gosipụtara dị ka Melissa onye bụ nwanyị nwere otu akparamagwa dị ka nke nwoke bụ Curtis. Nathan Stewart-Jarrett gosipụtara akparamagwa curtis.
N’afọ 2013 alụm dị na nwunye nke ya na Wole Olufunwa bụ nke channels Tv Metro file bipụtara ma Kesaa.. [2]
Ọ́ nwere ụmụ abụọ
Nrụtụaka
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ RADA: The Royal Academy of Dramatic Art - Student.
- ↑ METROFILE: Kehinde Fadipe and Wole Odufunwa Get A Dream Portugese [sic] Wedding, Metrofile, Retrieved 3 February 2016