Kema Chikwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Jump to navigation Jump to search

Kemafo Nonyerem "Kema" Chikwe, Ph. D. buburu Minista nke njem ugbo elu. O bu onye isi ndi nwanyi na pati ndorondoro ochichi nke PDP.

Chikwe bidoro akwukwo n'Aba n'ihe bu Abia Steti nke ugbua mgbe O gbara afo ise. O guru asusu French na Advanced Teachers' College n'Owerri. O gara Queen's College nke mahadum New Yok a na-akpo City University of New York ebe o guru asusu French. O mechakwara guo na mahadum Nsuka ebe o nwetere asambodo Dokita Mmuta na mpaghara Ihe Nkuzi na Mmuta.  O nwurukwara onye ochuakuko na nchikota akuko. O nwere mgbe O bu onye isi oru ndi Prime Time Limited, ndi na-eweputa akwuwko magazin a na-akpo Ash Magazine. O deputala akwukwo ato, ma tuleekwa otutu akwukwo na ihe ndeputa di iche iche.[1]

O tinyela aka na otutu otu na abughi nke gomenti, ndi oru ha bu i nyere oha aka n'uzo di iche iche; mana o buru uzo banye ochichi n'usoro ochichi nke abuo. Pati nke o dinyere ukwu bu pati Nashonal Pati nke Nigeria, ebe o siri banye NRC, si ya baa UNCP, ma si kwa ebe ahu banye pati  PDP, ebe o no ugbu a. Onye isi ala Nigeria bu Prezident Olushegun Obasanjo buru uzo mee ya minista nke njem elu ala, tupu o mee ya minista nke njem ofufe n'elu, nke o hapuru n'onwa May 2003. O zoro ochichi govano nke Imo Steti. n'afo 2009, mana o merighi. Emechakwara hoputara ya ka onye nchekwa udo obodo Nigeria na obodo ndi ozo, a na-akpo Ambasado, na obodo Ayaland (Ireland).                               [2]


O bu ya muru onye oku egwu Nigeria a na-akpo Naeto C..[3]

References[mezie | dezie ebe o si]

  1. Kema Chikwe. Online Nigeria. Retrieved on 2010-02-16.
  2. Yetunde Oladeinde (May 25, 2004). I’m not Obasanjo’s girl – Kema Chikwe. Daily Sun. Archived from the original on January 1, 2007. Retrieved on 2010-02-16.
  3. Babajide Okonrende (22 August 2008). The Big Deal about Naeto C. Retrieved on 2010-02-16.