Gaa na ọdịnaya

Khaled Elleithy

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Khaled Elleithy
mmádu
Ụdịekerenwoke Dezie
Mba o sịEgypt Dezie
Aha enyereKhaled Dezie
Aha ezinụlọ yaKhaled Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaEprel 1960 Dezie
Asụsụ obodoEgyptian Arabic Dezie
Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Egyptian Arabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụọkà mmụta sayensị, university teacher Dezie
Onye were ọrụKing Fahd University of Petroleum and Minerals, University of Bridgeport Dezie
Ebe agụmakwụkwọUniversity of Louisiana at Lafayette Dezie
Onye ndụmọdụ doctoralMagdy Abd El-Aziz Bayoumi Dezie
Ihe nriteFellow of the African Academy of Sciences Dezie
Nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Khaled Elleithy bụ ọkammụta si mba Ijipt n'isi ọmụmụ Sayensị Kọmputa na Injinịa. Ọ bụ onye isi nọ n'oche ugbu a na College of Engineering, Business, and Education na-ejekwa ozi dịka Osote onye isi oche nsonye maka ọmụmụ ndị nweterela nzere mbụ na Mahadum Bridgeport.[1][2][3][4]

Agụmakwụkwọ Ya

[dezie | dezie ebe o si]

O nwetara nzere mbụ ya n'isi ọmụmụ sayensị kọmputa na njikwa akpaaka n'afọ 1983 na Mahadum Alexandria. O nwetara nzere M.Sc ya n'isi ọmụmụ netwọkụ kọmputa site n'otu mahadum ahụ n'afọ 1986. O nwetara nzere M.Sc ọzọ n'isi ọmụmụ Sayensị Kọmputa n'afọ 1988 na nzere Ph.D. n'afọ 1990 sitere na Center for Advanced Computer Studies, Mahadum Louisiana, Lafayette.[3][1][2][5]

Ihe Ntinye Ya na Ngalaba Sayensị

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ chọtara ngwa ọhụrụ maka teknụzụ ikuku wee wuo ngwaọrụ nchọpụta ọrịa akwụkwụ nke nwere ike ịchọpụta mgbaàmà tupu mwakpo ahụ.[6]


Mmekọrịta Ya na Òtù Ndị O sogasị na Ha

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye isi òtù kọmputa IEEE. N'afọ 1990, ọ ghọrọ onye òtù Association for Computing Machinery (ACM) na onye òtù Special Interest Group on Computer Architecture. N'afọ 1983, ọ ghọrọ onye òtù Egypt Engineering Syndicate ruo mgbe ọ ga-anwụ. N'afọ 1988, ọ ghọrọ onye òtù IEEE Circuits & Systems Society na òtù kọmputa IEEE. N'afọ 2018, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye òtù Academy of Sciences nke Africa [4][1][3]

Edensibia

[dezie | dezie ebe o si]