Khanyi Mbau

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Khanyi Mbau
Websitehttps://mykhanyimbau.com
Khanyi Mbau
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha ọmụmụKhanyisile Mbau Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Ọktoba 1985 Dezie
Ebe ọmụmụSoweto Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, socialite, model, omee ihe nkiri Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2004 Dezie
Ọrụ ama amaObi Ụtọ bụ Okwu nwere mkpụrụedemede anọ Dezie
onye nlereranyaDylan Kardashian Dezie
webụsaịtịhttp://www.mykhanyimbau.com/ Dezie
nọchitere anya yaDylan Kardashian Dezie

Khanyisile Mbau (amụrụ 15 Ọktoba 1985), onye amara aha ya dị ka Khanyi Mbau, bụ onye ome ihe nkiri South Afrika, onye ọbịa telivishọn na onye ọrụ nka. Nzụlite ya na Soweto, Mbau tolitere bụrụ onye ama ama wee bụrụ aha njirimara dịka Doobsie nke abụọ na SABC 2 soap opera Muvhango (2004–2005); [1] dị ka Mbali na SABC 1 soap opera Mzansi na SABC 1 nke obere usoro bụ After Nine . Dịka mgbe 2018, ọ bụ onye ọbịa nke ihe nkiri ntụrụndụ SABC nke atọ bụ The Scoop, The Big Secret on BET Africa ma gosiputa dị ka Tshidi na Mzansi Magic's Abomama . [2]

Mmalite Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Khanyisile Mbau n'abali iri na ịse nke ọnwa Ọktoba nke afọ 1985. Nne ya, Lynette Sisi Mbau, rụrụ ọrụ na ngalaba ego nke ego ezumike nka na Barclays Bank . Nna ya, Menzi Mcunu, [3] alụghị nne ya n'oge ahụ n'ihi na di na nwunye ahụ na-akpa. Mcunu enweghị ihe njide aka ọ bụla n'aka gbasara nwata ahụ mana ọ kpọrọ ya aha: Khanyisile, onye na-eweta ìhè. Mbau zawara aha nna nne ya. N'oge na-adịghị anya Lynette hapụrụ Khanyi nye nne na nna ya na Mofolo, Soweto wee laghachi n'ọrụ, ma hapụ nne nne ya ka ọ na-azụ ya.

Nne na nna Mbau bụ ndị ọdịda anyanwụ nke ukwuu n'ụdị ejiji ha na ka ha si ahụ ụwa. Mbau siri, “Gladys (nne nne ya) ga-aapịa gi ụtarị gi ma i daa iwu. O ji ihe ndozi na nlebara anya na nkọwa nke Obi Buckingham Mbau n'ịhụnanya kpọrọ ya "Queen of England" [ . [4]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Igwe onyonyo[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 2004, Mbau nọchiri onye na-eme ihe nkiri Lindiwe Chibi n'ọrụ Doobsie na Muvhango [5] mgbe enyi ya nwoke Dan Mokoena gbagburu Chibi. Otu afọ ka e mesịrị, a chụrụ ya n'ọrụ, a kọrọ na ọ na-etinye oge dị ukwuu na-eme orir na ọṅụṅụ na ọ pụta ìhè na Sunday tabloids. Na 2006 Mbau sonyeere usoro ihe nkiri ejije SABC 1 kpu ọkụ n'ọnụ bụ Mzansi, [6] na oge nke abụọ ya, dịka Mbali. SABC 1 emeharịghị ihe ngosi ahụ maka oge nke atọ. Mgbe e mesịrị na 2007 Mbau rụrụ ọrụ dị ka Zee na SABC 1 mini-series After 9 .

Na 2012 ọ bụ onye ọka ikpe ọbịa na oge nke abụọ nke SABC 1 's Turn It Out . N'afọ 2013 ọ gbara n'ime ihe nkiri usoro ihe nkiri anthology nke E.TV, Ekasi: Akụkọ anyị . [7] O gosikwara na DStv Vuzu documentary, A bụ m, wee gosi Sindisiwe Sibeko na DStv's Mzansi Magic mini-series Like Father Like Son . [8]

N'ọnwa ọgọstụ afọ 2012, Mbau wepụtara akụkọ ndụ ya Bitch, Biko! Abụ m Khanyi Mbau, [9] nke onye odeakụkọ Lesley Mofokeng dere.

N'afọ 2013 Mbau pụtara na usoro ihe onyonyo docu-reality Reality Check na E.tv. N'otu afọ ahụ, Mbau malitere ihiwe ihe ngosi okwu nke ya na OpenView HD channel eKasi+, akpọrọ Katch It With Khanyi . Emegharịrị ihe ngosi ahụ maka oge nke abụọ na ngwụcha afọ 2014. Ọ ruru nọmba nke mbụ na òkè ndị na-ege ntị maka ihe ngosi okwu, gafere oke nke SABC 2's Motswako . Katch It With Khanyi nke aruputara nwere ọgọ nlele nke ndị na-ekiri ya pụtara puku asaa na iri asatọ na ise 7, nke ruru ogo otu nde na puku isii na iri isii na itoolu n'izu mbụ nke ọnwa Nọvemba nke afọ 2014. [10] N'ime oge nke abụọ nke ihe nkiri ahụ, a họpụtara ya maka ihe nkiri South Africa na ihe nkiri TV 2015.

Na 2014, Mbau gbara asọmpi na oge nke asaa nke Strictly Come Dancing . N'ime izu asaa ya na onye mmekọ Quintus Jansen enwetaghị votu zuru oke iji nọgide na asọmpi ahụ, ewepụrụ ya. Enwere esemokwu mbụ na soshal midia ka ndị na-akwado Mbau kwuputara mmechuihu ha ma na-agbagha maka izi ezi nke usoro ịtụ vootu. [11] N'ọnwa Julaị afọ 2015, MTV Africa malitere ịlụ ọgụ egbugbere ọnụ, Mbau welatara ihe nrite ahụ ụlọ.

N'ọnwa Epril nke afọ 2015, Mbau wetere ọrụ nkwado nke "Pinky" na telenovela nke mbụ E.tv, Ash to Ashes . Na Nọvemba 2015, a họpụtara ya maka "Akaụntụ Instagram Kachasị Mma" na Channel24 Online Awards, nke na-akwanyere ndị egwu obodo, ndị àmà ama na ndị ọha na eze nwere ọnụnọ dị ike na ntanetị ugwu.

N'onwa Maachị nke afọ 2016, Mbau nwetara ọrụ dị ka Palesa Simalane n'usoro ihe nkiri telivishọn ama ama Umlilo ; agwa ahụ bụ onye ọka iwu steeti kloset lezibianu nke batara n'alụmdi na nwunye nke amụrụ ọtụtụ nwanyị nke naanị ebumnuche ya bụ ịmụ ụmụ. N'ọnwa Julaị afọ 2016, Mbau wetara ihe ngosi onyonyo ọhụrụ na SABC 3 akpọrọ The Weekend Edition tinyere redio na onye ọbịa TV bụ Phat Joe. Duo ahụ kwadoro ihe ngosi obibi ndụ n'ụtụtụ izu ụka, nke emere na Cape Town.

N'ọnwa Julaị afọ 2017, Mbau pụtara na ihe ngosi ihe nkiri ọhụrụ akpọrọ The Scoop nke ekesara na SABC 3 dịka akụkụ nke usoro akụkọ nke channel ahụ. N'ọnwa Septemba nke afọ 2017, Channelu BET Africa kwuputara usoro eziokwu nke akụkụ iri na atọ ọhụrụ akpọrọ The Big Secret, nke Mbau kwadoro. N'ime usoro a, ọ na-enweta ndị sonyere ka ha kwuputa ihe nzuzo ha kachasị njọ. Ihe ngosi a malitere n'ikuku n'abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Ọktoba , 2017 wee jiri akụkụ abụọ nke njikọta ọnụ mechie.

N'ọnwa Maachị afọ 2018, Mbau sonyeere ndị na-eme ihe nkiri South Africa ihe nkiri TV kaacha ekiri,bụ Uzalo, na SABC 1, na-egosi ọrụ dị ka go-getter Dinekile aka Lady Die bụ onye na-ere ahịa ma na-achọ ibi ndụ dịka nwa nwanne nna ya bụ MaNgcobo. N'ịbụ onye nọọrọ obere oge n'ụlọ mkpọrọ maka obere mpụ ma mara ụzọ ya gburugburu ụwa, ọ nwetachabeghị ihe ọ chọrọ. N'ọnwa Julaị afọ 2019, Mbau kwuputara nlọghachi ya na ihe ngosi maka oge nke ise ya. [12] N'ọnwa Epril 2018, Mzansi Magic wepụtara ụzọ usoro ọzọ maka usoro ihe nkiri ọhụrụ ha, Abomama, nke na-enyocha ma na-agbagha echiche nke okwukwe na mmehie. Mbau narị dị ka onye isi ndu n'egosipụta dị ka Tshidi, onye na-achọ nsokwunyere bụbu eze nwanyị ghetto ghọrọ nwunye nke lụrụ dọkịta a ma ama nke Leroy Gopal gosiputara. Ihe ngosi a nwere nruputa nke ndi nkiri ihe karịrị otu nde, nke mere ka ọ bụrụ ihe ngosi nke atọ a kacha elele na DSTV. [13]

Redio[dezie | dezie ebe o si]

Na 2016, Mbau ghọrọ onye ọbịa nke ihe ngosi redio na Metro FM,Whose Show is it anyway, tinyere ndị na-eme ihe nkiri Somizi Mhlongo na Ntombi Ngcobo. Ihe ngosi a malitere na mba N'abalị iri na asatọ nke ọnwa Julaị nke afọ 2016, wee Megide ruo mgbe ọ bịara na njedebe na ngbanwe nke nguzoharị ọwa ngosi ya [14]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ihe nkiri mbụ Mbau mere, Hapiness is a Four-letter Word, ewepụtara N'abalị iri na itoolu nke ọnwa Febụwarị afọ 2016. Ọ rụrụ ọrụ dị ka Zaza, nwunye trophy nye Bheki (Simo Magwaza), nne ụmụ abụọ, na onye nwe ụlọ ahịa akpụkpọ ụkwụ. Emere ihe onyonyo a site na ọnụọgụ ndị na-emebi i igbe wee gaa n'ihu na nnata ụlọ ọrụ karịrị R7 nde n'ime izu nke atọ ya na sekyutt sinima. N'onwa Ọktoba 2016, Johannesburg Film Festival kpọrọ Mbau n'etiti mmadụ iri kacha bụ ndị South Africa ndị na-eme ihe nkiri na ihe nkiri, nke ọganihu nke Hapiness is a Four-letter Word wetara .

Ihe nkiri Mbau nke abụọ, ihe nkiri akpọrọ The Red Room, ka edobere maka mwepụta sinima na 2018.

N'afọ 2017, Mbau malitere imepụta ihe nkiri nke atọ ya na enyemaka nke onye na-emepụ ihe nkiri na onye na-eme ihe nkiri ntọọchị bụ Leon Schuster, Frank and Fearless, bụ nke edobere maka mwepụta sinima na 2018.

Ntinyeaka Azụmahịa[dezie | dezie ebe o si]

N'ọnwa Nọvemba afọ 2018, Mbau kwuputara mwepụta nke gin nke ya akpọrọ I Am Khanyi - Millennial Shimmer Gin. [15]

Ndepụta Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Television roles
Television Season Role Ref
2019 The Scoop Season 1 - 3 Host - herself
2014 -20 Katch It With Khanyi Season 1 - 3 Host - herself
After 9 Season 1 Zee
2018 Isithembiso Season 2 Herself
2015 - 2016 Ashes to Ashes Season 1 Pinki
aYeYe Season 1 Thenjiwe
Check - Coast Season 1
eKasi: Our Stories Season 5 Thabiso/Thandisiwe
I Am Season 1 Herself
Like Father Like Son Season 1 Sindisiwe Sibeko
Muvhango Season 1 Doobsie
2018 - 2019 Uzalo Season 4 -5 Dinekile aka Lady Die
My Perfect Family Season 3 Herself
Mzansi Season 2 Mbali
Mzansi Love - Kasi Love Season 2 Kgomotso
Mzansi Love - Big City Love Season 3 Lebo Kgosi
Reality Check Season 1 Herself
Scandal Season 1 Katlego
Skwizas Season 3 Mimi
Strictly Come Dancing Season 7 Celebrity dancer - herself
The Close Up Season 4 Herself
The Comedy Central Roast Season 7 Roaster - herself
The Lab Season 1 - 2 Kgomotso/Busi
The South African Film and Television Awards Season 8 - 10 Presenter - herself
The South African Music Awards Season 22 - 23 Host/presenter - herself
Tropika Island of Treasure - Thailand Season 3 Herself
Turn it Out - Street Battle Season 2 Guest judge - herself
Happiness Is a Four-Letter Word Zaza
2022 Young Famous & African Season 1 Herself

Ihe nrite na nhọpụta[dezie | dezie ebe o si]

South African International Film Academy Awards[dezie | dezie ebe o si]

Àtụ:Awards table |- |rowspan="2"|2019 |Red Room |South African International Film Academy Awards | Best Actress |style="background: #99FF99; color: black; vertical-align: middle; text-align: center; " class="yes table-yes2"|Merie[16] |}

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Karen (26 April 2019). Khanyi Mbau Biography: Age, Siblings, Daughter, Brother, Dresses, Cars, House and Net Worth. briefly.co.za.
  2. TshisaLIVE. "Khanyi Mbau to host new show that unveils dark secrets", Times Live, 31 August 2017. Retrieved on 23 March 2018.
  3. TshisaLive. "Khanyi Mbau to her dad: 'Thank you baba for being who you are'", 21 October 2017. Retrieved on 4 April 2018.
  4. Real Talk with Anele Season 3 Episode 42 - Khanyi Mbau. YouTube. Real Talk (1 June 2017). Retrieved on 13 July 2019.
  5. Bongiwe. "Khanyi Mbau was paid R80 000 for first acting role", Sowetan Live, 29 August 2014. Retrieved on 4 April 2018.
  6. TVSA. Mzansi. TVSA. Retrieved on 4 April 2018.
  7. Etv. "Fifth Season of eKasi: Our Stories Coming Soon", EBuzz, 11 June 2013. Retrieved on 4 April 2018.
  8. The Journalist. "Like father like son", Zkhiphani, 26 June 2013. Retrieved on 4 April 2018.
  9. Mofokeng (2012). "Bitch, please! I'm Khanyi Mbau", 1st, Cape Town: Tafelberg. ISBN 9780624056140. 
  10. Tinah. "Khanyi Mbau is officially SA's queen of talk!", Channel24, 13 October 2014. Retrieved on 4 April 2018.
  11. Channel24. "Khanyi Mbua exit from Strictly Come Dancing raises eyebrows", Channe24, 28 August 2014. Retrieved on 4 April 2018. (in en)
  12. Uzalo fans excited about Khanyi Mbau’s return to the show (en). Channel24 (2019-07-09). Retrieved on 2019-07-13.
  13. Zeeman (3 January 2019). This is how Abomama brought scandal to church (en-ZA). TimesLIVE. Retrieved on 2019-07-13.
  14. Somizi may be separated from Mbau in Metro FM ‘reshuffle’. citizen.co.za (20 March 2017). Retrieved on 2019-07-13.
  15. Jessica. "Khanyi Mbau enters the booze game, launches her own gin", Times Live, 20 November 2018. Retrieved on 20 November 2018.
  16. Magadla, Mahlohonolo (2019-09-30). Khanyi Mbau wins her first acting award (en).