Khanyisile Litchfield-Tshabalala

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Khanyisile Litchfield-Tshabalala
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jimember of the National Assembly of South Africa Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Cape Town Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịEconomic Freedom Fighters Dezie
ọkwa aghaadmiral Dezie
kọwara na URLhttps://www.pa.org.za/person/khanyisile-litchfield-tshabalala/ Dezie

Khanyisile Litchfield-Tshabalala bụ onye bụbu onye isi ndị agha mmiri mba South Africa. O mechara bụrụ onye omeiwu maka Economic Freedom Fighters.[1]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Soweto[2] ma mesịa sonye na Umkhonto we Sizwe na Angola. Mgbe ọ laghachiri South Africa, ọ gụsịrị akwụkwọ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ihe nkiri na Mahadum nke Cape Town na nzere nsọpụrụ na criminology.[2]

Ọrụ ụgbọ mmiri[dezie | dezie ebe o si]

Ọ sonyeere ndị agha mmiri South Africa na 1 Eprel, na afọ 1997 wee bụrụ nwanyị mbụ e buliri n'ọkwa Rear Admiral (Junior Grade) mgbe ọ malitere ọrụ nke Director Fleet Force Human Resources na Fleet Command na 1 Jenụwarị na afọ 2004.[2][2] O mechara gbaa arụkwaghịm mgbe ụlọ ikpe ndị agha mara ya ikpe maka ịkọ akụkọ aghụghọ banyere izu ohi laptọọpụ. A chọtabeghị laptọọpụ furu efu ma ọ gọnahụrụ na ọ chepụtara ohi ahụ.[3]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị[dezie | dezie ebe o si]

Ọ banyere na ndị omeiwu dị ka onye otu EFF na-esote ntuli aka nke afọ 2014.[4]

Na 3 Juun, na afọ 2015 ọ sonyeere United Democratic Movement (UDM), ma nye ya ọrụ ozugbo dị ka onye nhazi mba. N'ọnwa Disemba afọ 2015, a họpụtara ya dịka osote onye isi oche nke UDM. Na ngwụcha Septemba na afọ 2016, ọ hapụrụ UDM, na-ekwu na ọ chọrọ ịga n'ihu na agụmakwụkwọ, mana ndị na-akọwa ihe na-ekwu ete ya na Holomisa sere okwu.[5]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 2014 elections: List of EFF MPs elected to the National Assembly. Politicisweb.co.za (May 17, 2014). Retrieved on October 6, 2014.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Welcome aboard, Admiral Khanyi. IOL (August 8, 2003). Retrieved on October 6, 2014.
  3. Navy admiral quits after laptop fraud. Defenceweb (March 19, 2009). Retrieved on October 6, 2014.
  4. 2014 elections: List of EFF MPs elected to the National Assembly - DOCUMENTS | Politicsweb. www.politicsweb.co.za. Retrieved on 19 April 2018.
  5. Nini. "Deputy president dumps UDM as infighting claims surface", DispatchLIVE, 22 September 2016. Retrieved on 19 April 2018.