Kwacoco

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Kwacoco, mgbe ụfọdụ a na-asụ kwa-coco, bụ nri nke ndi Obodo Cameroon nke nwere ede dị ọcha (ihe ọkụkụ mgbọrọgwụ sitere na Central na South Amerika) nke a na-ekpuchi ma na-esi ísì ụtọ na akwụkwọ unere. Ọ bụ agbụrụ dị iche iche si obodo Cameroon na-eri ya, ọkachasị ndị Kwe, bụ ndị nri ọdịnasal na-ejikarị kwacoco na banga, nke bụ ofe e ji mkpụrụ osisi nkwụ mee, na azụ a na-ami n’ anwụrụ. A na-akpọ ya kwacoco bible mgbe a na-agwakọta cocoyam na ihe ndị ọzọ dịka spinach, azụ a na-ami n’anwụrụ, mmanụ na-acha ọbara ọbara na ihe na-esi ísì ụtọ, a pụkwara inye ya na ọtụtụ ofe na ofe ndị ọzọ.

Eba (Garri si Cassava) na ofe Fresh fish banga (Palm Kennel) n'ime ite ụrọ

Njikọ nke kwacoco na banga bụ nri bụ isi maka obodo ndị dị n'ime ime obodo na Cameroon, ndị na-adabere na abụba na carbohydrates nke nri ndị a na-enye iji bie ndụ. N'oge nsogbu nri ụwa nke afọ 2008, a gbara ndị ọrụ ugbo ume ka ha mepụta ede ndị ọzọ, a gwakwara ndị na-azụ ahịa n'obodo ukwu ka ha kwalite oriri ya karịa nri ndị si mba ọzọ.

Hụkwazi[dezie | dezie ebe o si]

 

  • Ndepụta nke nri a na-etinye na steam

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]