Lateefat Okunnu
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Disemba 1939 |
| Ọrụ ọ na-arụ | civil servant, official |
| Onye were ọrụ | University of Lagos |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Lagos, Methodist Girls' High School |
| Okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
Lateefat Modupe Okunnu ⓘ (3 Disemba 1939) bụ onye ọrụ gọọmentị lara ezumike nká na onye nchịkwa bụ osote Gọvanọ nke Lagos Steeti site na 1990 ruo 1992. Ọ bụ onye isi oche nke National Republican Convention na 1993.
Okunnu bụ onye guzobere Federation of Muslim Women's Associations in Nigeria (FOMWAN).[1][2]
A mụrụ Lateefat Modupe Okunnu na Lagos wee gụọ akwụkwọ na Okepopo Primary School, Lagos Island, Methodist Girls' High School na Queens College, Yaba.[1][2] O nwetara nzere bachelọ nke Arts na Geography wee nweta diplọma postgraduate na Education na Mahadum Lagos na 1968.[3] Site na 1967 ruo 1970, Okunnu rụrụ ọrụ na Mahadum Lagos dịka onye enyemaka nkuzi. O sonyezie na gọọmentị Legọs steeti dịka onye ọrụ agụmakwụkwọ. Ọ nọgidere na ọchịchị steeti ruo n'afọ 1980, mgbe nke ahụ gasịrị, ọ kwagara na gọọmenti etiti dị ka onye isi odeakwụkwọ na Federal Ministry of Agriculture. Na 1986, ọ ghọrọ odeakwụkwọ na-adịgide adịgide na Council of State.[4] Okunnu so na umunwanyi ama ama hibere otu Federation of Muslim Women's Associations na Naijiria. Ọ bụ osote onye isi oche (amirah) nke nzukọ ahụ ma bụrụkwa onye isi oche nke Lagos State Chapter. O tinyere aka na ihe gbasara agụmakwụkwọ n'ime Lagos State isi nke FOMWAN ma kwado ka e were ala alakụba dịka ụlọ akwụkwọ ọta akara na guzobe kọmitii mmụta na ụlọ alakụba. N'afọ 1989, ọ ghọrọ onyeisi oche nke FOMWAN. N'afọ 1987, dịka onye ọrụ obodo, Okunnu bụ onye so na kọmitii mmadụ itoolu e hibere ileba anya n'atụmatụ 1986 Political Bureau. N'afọ 1990, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote Gọvanọ Lagos, ya na Pamela Sadauki nke Kaduna Steeti, bụ ụmụ nwanyị mbụ nwere ọkwa osote Gọvanọ na Nigeria.[6]