Malamba (ihe ọṅụṅụ)

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

Malamba (ihe ọṅụṅụ)

Malamba bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n'anya nke ọdịnaala na obodo Cameroon, Equatorial Guinea, ya na Gabon nke a na-eme site na ịgba mmiri okpete. A na-egbutu osisi ndị ahụ n'ime ụrọ, a na-ahapụkwa mmiri ahụ ka ọ gbaa ruo ihe dịka izu abụọ.[1] Nri na ọdịdị ya yiri ihe ọṅụṅụ Latin Amerika guarapo. Iji mee ka usoro ịgbaze ngwa ngwa, a pụrụ itinye ụgbụgbọ osisi sitere na Garcinia kola (bitter kola na Bekee, nke a maara dịka plaster maọbụ onaé na Cameroon) na mmiri ahụ.[2][3] A na-agbakwunye ọka mgbe ụfọdụ n'oge usoro ịgbaze iji mee ka mmanya na-aba n'anya dịkwuo ukwuu. Na Gabon, a makwaara ihe ọṅụṅụ ahụ dịka musungu maọbụ vin de canne (cane wine) na French.[4]

Hụkwazi[dezie | dezie ebe o si]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Bokesa (1987). Voces de espumas (in es). Centro Cultural Hispano-Guineano. ISBN 978-84-398-9331-8. 
  2. Tekam (2016-01-07). Cameroun : le marché prospère des liqueurs traditionnelles (fr-FR). Pressenza. Retrieved on 2022-10-25.
  3. Lepengue (2020-06-19). "Effet de Garcinia kola (Clusiaceae) dans les processus de fermentation du vin de canne à sucre (Saccharum officinarum; Poaceae) au Gabon" (in en). International Journal of Biological and Chemical Sciences 14 (3): 1074–1084. DOI:10.4314/ijbcs.v14i3.33. ISSN 1997-342X. 
  4. Lemps (2001). Boissons et civilisations en Afrique (in fr). Presses Univ de Bordeaux. ISBN 978-2-86781-282-8.