Mmanya nkwụ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mmanya nkwụ
drink
obere ụdị nkealcoholic beverage, fermented food Dezie
mba osiIndonesia Dezie
catchphraseÉlému lo le mó iwe Dezie

Àtụ:Infobox Beverage

Ihe eji agbanye mmanya nkwụ

Mmanya nkwụ, nke eji aha di iche iche mara na ọtutu ebe, ọ bụ mmanya na-aba na-anya esi na-ahụ osisi nkwụ di iche iche gbapụta, dika Palmyra, nke a n'akpọ date palm, na osisi aki oyibo. [1] Eji aha dị iche iche mara ya na mpaghara dị iche iche ma bụrụkwa ihe a na-ahụkarị na mpaghara Eshia, Africa, Caribbean, South America na Micronesia .

Mmepụta mmanya nkwụ site n'aka ndị na agba mbọ na ndị ọrụ ugbo nwere ike ịkwalite nchekwa, otu a nkwụ na-aghọ isi iyi ego ezinụlọ na-akpata mgbe niile nwere ike ịba uru karịa ọnụ ahịa a na-ere osisi ndi ọzọ. [2]

Ịkụ ya[dezie | dezie ebe o si]

Ndị na-anakọta Toddy na-arụ ọrụ na nkwụ Cocos nucifera
Ntucha mmiri nkwụ na East Timor

A na-apịpụta sap ahụ ma kpokọta ya site na mpempe akwụkwọ ya. A na - anakọta sap ahụ site na ifuru osisi nkwụ. A na-ekechi otu akpa na ifuru ifuru iji kpokọta sap ahụ. Mmiri na-acha ọcha nke na-achịkọta na mbụ na-atọ ezigbo ụtọ n'anaghi aba na-anya (mmanya ókè) tupu ọ gbaa ụka . Uzo ozo bu ida nke osisi dum. Ebe a na-eme ihe a, a na-agbanye ọkụ mgbe ụfọdụ na ngwụcha ya iji kwado mkpokọta sap.

Nkwụ sap n'amalite ịgba ụka ozugbo ọgbakọtara, n'ihi yist a na-ahụ na mbara igwe (nke a na-etinyekarị yist fọdụrụ na ihe eji agbapụta ya). N'ime awa abụọ, ya igbaa ụka na-emepụta mmanya na-atọ ụtọ nke ihe dị ka 4% mmanya na-aba n'anya, na- egbu egbu ma na-atọ ụtọ. Enwere ike ịhapụ mmanya ka ọ gbaa ụka ogologo oge, ruo otu ụbọchị, iji mee ka uto ya sie ike, nke na-atọ ụtọ na agbaka nti, nke ụfọdụ ndị na-chọrọ. Oge igbaa ụka ya tee aka, ọ buru zie viniga na abụghi mmanya dị ike. [3]

Oriri site na mpaghara[dezie | dezie ebe o si]

Na Africa, akuku osisi nke ndi bekee n'akpọ sap ka mmanyị nkwụ n'esi agbapụta nke otutu mgbe n'esi na osisi ọhiadatepalms dị ka osisi nkwụ nke bekee n'akpọ silịva dat pam (Phoenix sylvestris), na Palmyra, na jaggery palm ( Caryota urens ), ma ọ bụ site na osisi mmanụ nkwụ dị ka nke a n'akpọ African Oil Palm (Elaeis guineense) ma ọ bụ site na osisi raffia, osisi nkwu kithul, ma ọ bụ nke nnipa. Na mpaghara obodo nke etiti na ọdịda anyanwụ Democratic Republic of Congo, a na-akpọ mmanyị nkwụ malafu . Ekwuru ihe gbasara mmanya nkwụ n'ime akwụkwọ ọgụgụ nke Things Fall Apart nke onye ode akwụkwọ Naijiria bụ Chinua Achebe dere ma bụrụkwa isi okwu nke atụmatụ akwụkwọ akụkọ Palm Palm Drinkard nke onye Naijiria onye edemede bụ Amos Tutuola dere. Nkwụ na-arụ ọrụ dị mkpa n'ọtụtụ emume na mpaghara Naịjirịa, dịka n'ala ndị Igbo, na ebe ndị ọzọ na mpaghara Etiti na Odida anyanwu Africa . A na-enye ndị ọbịa bịara oriri agbamakwụkwọ, mmemme ọmụmụ na olili olili ozu nkwụ nga oburu ibu. A na-etinyekarị mmanya nkwụ na ọgwụ iji dozie ọtụtụ mkpesa anụ ahụ. Dika ihe ngosi nkwanye ugwu nye ndi nna nna nwuru anwu, otutu oge a na-ebido iṅụ mmanyị nkwụ site na iwụpụ ntakịrị ya n'ala ( Kulosa malafu na Kikongo ya Leta ). Nwoke na ụmụ nwanyị na-enwe mmanya nkwụ, ọ bụ ezie na ụmụ nwanyị na ụmụ nwoke n'aṅu ya mana ụmụ nwanyị anaghi aṅụ kari ya na ọha.

N’akụkụ ndịda ọwụwa anyanwụ nke ala Naijeria, ya bụ ala ndi Igbo, a na-akpọ mmanya nkwụ “mmany ocha”, yana “ngwo” na “nkwu”. Ọ na-arụ oke ọrụ dị mkpa na ntọala ọdịnala ndị Igbo. Na Urualla, dịka ọmụmaatụ, na obodo ndị ọzọ “ideator”, ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya maka agbamakwụkwọ. Otu nwa okorobịa na-eme ikụaka-na-ụzọ na ebe ndi ọgọ ga eburiri mmanya nkwụ. Nwere ihe eji agbankwụ (galọn) di iche iche a chọrọ, nke a dabere na omenala ndi ala Igbo di iche iche. Enwere ike ihụ omenala a n'uzo yiri ya na mpaghara mgbago mgbago ugwu nke Cameroon. (North West Mpaghara). 

Enwere ụdị mmanya nkwụ anọ na etiti na ndịda Democratic Republic of the Congo. Site na mmanụ nkwụ bụ nke a n'akpo ngasi, dibondo si na raffia nkwụ, cocoti si na aki oyibo, na mahusu site na obere mkpụmkpụ osisi nke na-eto na mpaghara savannah nke ọdịda anyanwụ Bandundu na mpaghara Kasai .

Toddy-tapper na-arị ogologo nkwụ na Madras, ca. 1785
  1. Enjoying ‘tuak’ in Batak country by Wan Ulfa Nur Zuhra, NORTH SUMATRA, Feature, 21 January 2013 Jakarta Post
  2. Confirel:Sugar Palm Tree – Conservation of natural heritage. Retrieved 15 April 2012
  3. Fermented and vegetables. A global perspective. Chapter 4..