Margaret Simwanza Sitta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Margaret Simwanza Sitta
Margaret Simwanza Sitta
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịTanzania Dezie
Aha enyereMargaret Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya24 Julaị 1946 Dezie
Ebe ọmụmụNjombe Dezie
Asụsụ obodoSwahili Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Swahili Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the National Assembly of Tanzania Dezie
ebe agụmakwụkwọMzumbe University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịParty of the Revolution Dezie
kọwara na URLhttp://www.parliament.go.tz/mps-list Dezie

Margaret Simwanza Sitta (Amụrụ na 24 Julaị 1946) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Tanzania nke so n'òtù Chama Cha Mapinduzi na-achị, A họpụtara ya dị ka onye otu ndị omeiwu maka Urambo, na-eje ozi site n'afọ 2015 ruo afọ 2020.[1][2] Ọ rụrụ ọrụ dị ka Minista nke Mmụta na Ọzụzụ Ọrụ na Minista nke Mmepe Obodo, Mmekọahụ na Ụmụaka.[3] Tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi n'ụlọ akwụkwọ gọọmentị.[3]

A mụrụ Margaret Simwanza Sitta n'ụbọchị 24 Julaị 1946.Ọ gụrụ akwụkwọ na Tabora Town Primary School site n'afọ 1954 ruo afọ 1957, wee gaa Ussoke Girls Middle School site n'afọ 1958 ruo afọ 1961. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Tabora Girls Secondary School n'afọ 1965 wee nata asambodo nke Grade "A" site na Mpwapwa Teachers College n'afọ 1967; o mechara nweta diplọma ya n'otu kọleji ahụ n'afọ 1985. O mechara nweta Ba ED Hons-Degree na Mahadum Dar es Salaam n'afọ 1988[3]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị - na Tabora Girls, Azania, Mwanza na Forodhani n'ime afọ 1968 ruo 1980.[3] N'afọ 1980, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi agụmakwụkwọ distrikti nke Urambo, Moshi na Kinondoni Municipal site n'afọ 1990 ruo 1995.[3] N'afọ 1996, ọ ghọrọ Onye isi nke Ngalaba Mmụta Ndị Ọrụ- DSM, nke Trade Unions Confederation of Tanzania bụ TUCTA) Institution nọchiri ebe ọ rụrụ ọrụ afọ anọ kemgbe afọ 1996, n'afọ 2000, ọ rụrụ ọrụ na Ministry of Education and Vocational Training dị ka onye isi-ọfịs nke Kọmishọna nke EducationDSM, Ọ ghọrọ onye minista nke Education na Vocational Training site n'afọ 2006 ruo afọ 2008, Ọ gara n'ihu na-ejide ọkwa minista ya mana n'oge a bụ nke Ministry of Community Development, Gender and Children site n'ọfịs site n'ụbọchị 2008 ruo afọ 2010.[3]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. History. 24 Julai 1946 - Margaret Simwanza Sitta, mwanasiasa wa #Tanzania na Mbunge wa Urambo anazaliwa. #TanzaniaHistorypic.twitter.com/he28zBDlwh. twitter.com. Archived from the original on 8 March 2018. Retrieved on 8 March 2018.
  2. Member of Parliament CV. Parliament of Tanzania. Archived from the original on 5 March 2013. Retrieved on 30 March 2013.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 Profile. parliament.go.tz. Archived from the original on 1 September 2017. Retrieved on 2018-03-08. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "parliament.go.tz" defined multiple times with different content