Mariam Nalubega
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Uganda |
| Aha enyere | Mariam |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 27 Novemba 1981 |
| Ebe ọmụmụ | Uganda |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
| Ọkwá o ji | Member of Parliament of Uganda |
| Ebe agụmakwụkwọ | Makerere University Business School |
| Ebe obibi | Kampala |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2001 |
| Okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
Mariam Patience Nalubega bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Uganda. Ọ bụ nwanyị omebe iwu, na-anọchite anya mpaghara Butambala na omebe iwu nke Uganda. A họpụtara ya n'ọkwa ahụ na Machị 2011.[1] Tupu nke ahụ, site na 2005 ruo 2011, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye National Female Youth Member of Parliament na Uganda.[2]
Mmalite na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ ya na Butambala District, Central Uganda, na 27 Nọvemba 1981 na Saidi Lubega na Jalia Nakayange.[1] Ọ gara Makerere University Primary School, tupu ọ gaa Butawuka Secondary School maka ọmụmụ O-Level ya. Ọ gara St. Francis Secondary School na Mengo, maka agụmakwụkwọ A-Level ya. Nalubega nwere nzere Bachelor of Public Administration, nke ọ nwetara na Mahadum St Lawrence, A Certificate of Public admistration and Management do (mahadum Makerere). O nwekwara diplọma na Iwu, nke ọ nwetara na Law Development Centre na Kampala.[2]
Ahụmahụ ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Site na 2001 ruo 2006, Mariam Nalubega bụ onye otu Mpigi District Council, na-eje ozi dị ka odeakwụkwọ distrikti maka ahụike site na 2003 ruo 2006. N'afọ 2006, a họpụtara ya dị ka onye National Female Youth Member of Parliament, na-eje ozi n'ọkwa ahụ ruo n'afọ 2011. N'oge ahụ, ọ rụrụ ọrụ na kọmitii ndị omeiwu na akụ na ụba na kọmiti Information and Communications Technology. N'afọ 2011, a họpụtara ya dị ka onye otu ndị omeiwu nke mpaghara nwanyị, maka mpaghara Butambala nke e mepụtara ọhụrụ.[2]
Ọrụ ndị ọzọ
[dezie | dezie ebe o si]Mariam Nalubega bụ nne na-alụbeghị di nke ụmụ anọ, ọ bụ onye Rotarian, onye ọchụnta ego na-achụso diplọma na nchịkwa ọha na eze ugbu a[1]
Hụkwa
[dezie | dezie ebe o si]- Nzukọ omeiwu nke Uganda
- Mariam Najjemba
- Ógbè Butambala
Ebensidee
[dezie | dezie ebe o si]- 1 2 3 Namaganda (9 April 2011). How They Beat Political Giants To Win: Mariam Nalubega. Retrieved on 5 February 2015.
- 1 2 3 Profile of Nalubega Mariam Patience: Female Youth Member of Parliament. Parliament of Uganda (2005). Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 5 February 2015.