Marie E. Johnson-Calloway

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Marie Edwards Johnson-Calloway (April 10, 1920 na February 11, 2018) bụ ónyé America na-ese ihe. Ọ rụrụ ọrụ n'ọhịa nké eserese na ngwakọta mgbasa ozi.[1][2]

A mụrụ Marie Edwards na Pimlico, Baltimore, ónyé Africa America Johnson-Calloway gara kọleji ndị nkụzi nke Coppin State.[3] Edwards kụziri na Baltimore School District ruo ọtụtụ afọ. N'afọ 1952, ọ nwetara nzèrè Bachelor of Arts na Morgan State College, Baltimore, Maryland, na agụmakwụkwọ nka.

N'afọ 1968 ọ natara Master of Arts na eserese site na Mahadum San Jose State dị ka ónyé nkụzi nwéré ahụmahụ na Graduate Studies. Ọ kụziri na mahadum na kọleji dị na Bay Area ruo mgbè ọ lara ezumike nká na nkụzi na 1983.

Johnson-Calloway arụwo ọrụ na Bay Area Women Artists nke Northern California na ọrụ obodo. Ebe ngosi nka Oakland so n'etiti ụlọ ọrụ ndị nwere ihe atụ nke ọrụ ya.[4] Johnson-Calloway akụzikwaara na Mahadum San Francisco State na California College of Arts and Crafts .[3] Alụrụ di ugboro abụọ (Arthur Johnson, MD na Charles Calloway. M.D.), o nwere ụmụ abụọ (nwa nwanyị April Watkins, na nwa nwoke, Art Johnson), na ụmụ ụmụ anọ, ma bírí na Oakland, California. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche nke San Jose nke NAACP, ọ nọkwa na-arụsi ọrụ ike na ikike ọbọdọ.[1]

Johnson-Calloway nwụrụ na Febụwarị 2018 mgbè ọ dị afọ 97.[3][5]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Marie Johnson Calloway: Legacy of Color - MoAD Museum of African Diaspora. Archived from the original on 13 March 2017. Retrieved on 27 January 2017.
  2. Marie Johnson Calloway | Now Dig This! digital archive (en). Hammer Museum. Retrieved on 2019-04-02.
  3. 3.0 3.1 3.2 Marie Johnson-Calloway - The HistoryMakers. Retrieved on 27 January 2017.
  4. Jules Heller (19 December 2013). North American Women Artists of the Twentieth Century: A Biographical Dictionary. Routledge. ISBN 978-1-135-63882-5. 
  5. Calloway (April 1, 2019). Marie Johnson Calloway Obituary. Legacy.com.