Mervat Tallawy

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mervat Tallawy
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEgypt Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1937 Dezie
Ebe ọmụmụMinya Dezie
Asụsụ obodoEgyptian Arabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Egyptian Arabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụdiplomat, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
onye were ọrụMba Ndị Dị n'Otu Dezie
Ọkwá o jiambassador of Egypt to Japan Dezie
ebe agụmakwụkwọThe American University in Cairo Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịEgyptian Social Democratic Party Dezie
Mervat Tallawy

Mervat M. Tallawy (Egyptian Arabic; amụrụ n'afọ 1937) bụ onye nnọchi anya mba ọzọ na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke obodo Ijipt.

Mervat Tallawy nwere B.A. na sayensị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nchịkwa azụmahịa site na Mahadum America dị na Cairo. Ọ gụchara akwụkwọ na Graduate Institute of International Studies (HEI) na Geneva, Switzerland. N'afọ 1963, ọ sonyeere Ministri Na-ahụ Maka Ihe Ndị Na-eme ná Mba Ọzọ nke obodo Ijipt.

Site na afọ 1985 ruo afọ 1988, Ms. Tallawy bụ osote onye nduzi nke United Nations International Research and Training Institute for the Advancement of Women (UN-INSTRAW). N'ikpeazụ, ọ bụ onye nnọchi anya Ijipt na Vienna, Austria, ruo afọ 1991. Site na afọ 1991 ruo afọ 1993, ọ bụ osote minista mba ọzọ. Site na afọ 1993 ruo afọ 1997, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nnọchi anya Ijipt na Japan. Ms. Tallawy rụrụ ọrụ dị ka Minista na-ahụ maka ịnshọransị na mmekọrịta ọha na eze nke Ijipt site na afọ 1997 ruo afọ 1999.

N'abalị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 2000, a họpụtara Mervat Tallawy ka ọ bụrụ osote odeakwụkwọ ukwu nke United Nations na odeakwụkwọ ukwu ya nke United Nations Economic and Social Commission for Western Asia (ESCWA).[1] N'afọ 2007, Bader Al-Dafa si Qatar nọchiri ya.

Tallawy bụ onye otu Sawiris Foundation for Social Development na onye isi nke afọ 2011 e guzobere n'aka ekpe nke Egyptian Social Democratic Party.

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

  • Usoro nke Rising Sun, Gold na Silver Star (2017)

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. The Biography of Mervat M. Tallawy, UN.org. Retrieved on 10 Sep 2011.