Miriam Onuoha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Miriam Onuoha
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereMiriam Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya18 Septemba 1965 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jionye otu ulo nnochite anya Naijiria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Lagos, University of Abuja Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Princess Miriam Odinaka Onuoha bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke All Progressives Congress si Steeti Imo, Naijiria . Ọ bụ onye otu Ụlọ nnọchiteanya Omebe Iwu Naijiria si Ọwụwa Anyanwụ Okigwe Federal constituency. [1] Ọ meriri na ntuli aka elu ọzọ na ụlọ ndị nnọchi anya omebe iwu gọọmentị etiti na ọnwa Jenụwarị afọ puku abụọ na ịrị abụọ (2020). [2] E kwuputara Obinna Onwubuariri nke PDP dịka onye meriri na ntuliaka nke puku abụọ na ịrị na iteghete (2019), mana ụlọ ikpe mkpesa nhọpụta nke ọgbakọ omebe iwu na Owerri na Septemba afọ puku abụọ na iteghete (2019), chụrụ Obinna Onwubuariri, ma nye iwu ka e mee ntuliaka ọhụrụ maka Jenụwarị 2020. [3] Ọ meriri ntuliaka ọzọ mgbe ụlọ ikpe mkpesa ntụliaka nọ na Ọgọst 2020 kwadoro mmeri ya na ntuliaka Jenụwarị 2020. [4]

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Princess Miriam bụ onye Umunachi Osu-Ama na Insiala Mbano Loca Govamenti Area nke Steeti Imo . Ọ malitere akwụkwọ nwata ya na Central School Umunachi Osu-Ama mesia gaa Tilley Gyado College Markudi na Steeti Benue . Ọ gara Aquinas Model Sekọndri Skuul Osu-Ama na ebe ahụ ka o nwetara akwụkwọ satifiketi sekọndrị ya. Ọ gakwara n'ihu ịgụ akwụkwọ na Mahadum Lagos wee gụchaa nweta nzere na Esteti Manejiementi. Ọ gara mahadum nke Abuja wee gụchaa nzere masta na Nhazi gburugburu ebe obibi na Nchekwa. [5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Tupu ọ banye n'ụlọ ndị nnọchi anya gọọmentị etiti, ọ rụrụ ọrụ dịka onye enyemaka pụrụiche nye Gọvanọ Bayelsa steeti n'ihe gbasara mmepe mba ụwa n'etiti ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ gara aga. [6]

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. Akinsola. "APC wins Imo rerun election", Today Nigeria, 26 January 2020. Retrieved on 21 November 2020.
  2. Nseyen. "Imo: INEC issues Certificate of Return to Miriam Onuoha", Daily Post, 29 January 2020. Retrieved on 21 November 2020.
  3. Olafusi. "Tribunal sacks 36-year-old PDP federal lawmaker, orders fresh poll", The Cable, 18 September 2020. Retrieved on 21 November 2020.
  4. Anonymous. "Okigwe North: Election tribunal affirms APC Rep. Miriam Onuoha’s election", Sun News, 8 August 2020. Retrieved on 21 November 2020.
  5. Anonymous. "Princess Miriam Onuoha: New Dawn Beckons For Okigwe North", Leadership, 18 November 2018. Retrieved on 21 November 2020.
  6. Anonymous. "Princess Miriam Onuoha: New Dawn Beckons For Okigwe North", Leadership, 18 November 2018. Retrieved on 21 November 2020.