Mmiri

Water ma obu (Igbo: Mmiri) bu ihe a na'kpo na Igbo Mmiri. N' ala igbo a'na eji kwa mmiri eme ihe ịche ịche. Inwere Ike nnu mmiri ma obu-kwa jiri ya shie nri. Ndị ìgbo na ejikwa mmírí asa cha ma banye abacha (cassava) maka ime pụta akpu ana eriri nya'na abacha mmiri.
Mmiri na ọdịnana ndị ìgbo[dezie | dezie ebe o si]
Na oge gboo, na mpaghara ala igbo di iche iche, ebe obula enwere nnukwu mmiri a na-ahụ mmụọ mmiri nke ana-efe maka ịnye nwa, ọganihu na ịkọ ugbo ma ọbu izu ahịa. Ọmụmaatụ bu Ogbuide na Ụgwuta (Oguta), Urashi, Ota mmírí gbakwunyere Njaba nọkwa na Imo Steeti nya na Òrìmìlì, Omambala na Idemili dị na Anambra Steeti. N’ebe ụfọdụ na ala igbo, a na-awụsa mmiri n’ụkwụ nwanyị a na-alụ ọhụrụ ka ọ na-abanye n’ụlọ ọhụrụ ya. Nka'a na egosi nnabata nwanyi ahụ ka mbata ya ezi n'ụlọ ahụ bụrụ ije mmiri.

Ọnọdụ ịnweta mmiri na ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria n'oge ugbu a[dezie | dezie ebe o si]
Enwere ndị ọchịchị nchịkwa Osimiri (River Basin Authorities) Iri na otu dị na Nigeria. Emepụtara ha ka mee ka mmiri dị maka oru ugbo na ihe ndị ọzọ.Otu n’ime ha bụ Anambra - Imo River Basin Development Authority. Ọtụtụ obodo na ndịda ọwụwa anyanwụ (South East) Nigeria na-enwe ụkọ mmiri dị ọcha. Enwere ọtụtụ ihe kpatara na enweghị mmiri dị ọcha n’obodo mepere emepe na n’ime ime obodo na ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria.
Abọ foto[dezie | dezie ebe o si]
-
Mmiri Hoh na-agba n'elu
-
Mmiri ọgba warawara Hoh 2017 14
-
H2O Centro Comercial
-
Onye chọrọ igbanye mmiri n' efere mmiri
