Monica Ogah
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | Naijiria |
| Aha n'asụsụ obodo | Monica Ene Ogah |
| Aha ọmụmụ | Monica Ene Ogah |
| Aha enyere | Monica |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 7 Ọgọọst 1990 |
| Ebe ọmụmụ | Makurdi |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | singer-songwriter |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 2011 |
| Ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
| Ụcha ime anya | brown |
| Ngwa egwu | olu egwụ |
| Ụdị | rhythm and blues |
| Nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Monica Ene Ogah ⓘ (amụrụ n'August 7, 1994), nke a maara dị ka Monica Ogah, bụ onye na-agụ egwu Naijiria, onye mmeri nke afo 2011 nke mbipụta nke anọ nke MTN Project Fame West Africa.[1][2] Dị ka ihe nrite, e nyere Ogah nkwekọrịta ndekọ na abọm mbụ ya, Sometime na Ọgọstụ, ka ewepụtara n'ọnwa Ọgọustụ afọ 2013.[3]
Ndu Mmalite
[dezie | dezie ebe o si]Nwa ikpeazụ n'ime ụmụ isii, a mụrụ Monica Ogah na August 7,afo 1994 na Makurdi, Benue State.[4] Ọ na-eto nne ya, onye na-agụ egwú, dị ka otu n'ime mmetụta mbụ ya. O kwuru n'ajụjụ ọnụ ya na Thisday News: "[Nne] ga-echetara m otú olu m si dị ụtọ mgbe m mere mkpu ndị ahụ na-enweghị ihe ọ bụla nke o kwenyere na olu Chineke nyere. " Ọ gara n'ihu kpughee na nna ya nwere olileanya na ọ ga-abụ onye nọọsụ ma ọ gaghị akwado ọchịchọ egwu ya ruo mgbe ọ ga-abanye na ihe ngosi nke Project Fame ebe ọ ga-apụta site na ndị ikpeazụ a ma ama dị ka onye mmeri.[4]
Ogah gụrụ akwụkwọ na Bammco Nursery na Primary Skool. O mechara gaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụmụ nwanyị Methodist na Otukpo, Benue Steeti. E bu ụzọ nụchaa nkà ịbụ abụ ya n'oge ụlọ akwụkwọ Sọnde na chọọchị ọ bụ nwata.[5]
Ọrụ
[dezie | dezie ebe o si]Monica Ogah gara nyocha maka mbipụta nke anọ nke Project Fame West Africa n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2011. Ọ gafere n'ọkwa nyocha ma soro na ndị asọmpi iri na itoolu sonye na ụlọ akwụkwọ egwu. Ogah na-enwu gbaa n'oge niile ọ nọ na ihe ngosi ahụ, na-enweta okwu ọma site n'aka ndị ọkàikpe, bụ ndị toro arụmọrụ ya.[6] Na onwa Disemba 18, 2011, a mara ya dị ka onye mmeri, na-eme ka ọ bụrụ nwanyị nke abụọ na-esote Chidinma iji merie asọmpi ahụ.[7] Dị ka ihe nrite maka mmeri ahụ, Ogah natara nkwekọrịta ndekọ na Ultima Studios mgbe ụlọ ọrụ Goretti na-achịkwa ya.[8][7]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Iyabo, Aina (September 20, 2013). "Originality will differentiate me from other artistes – Monica Ogah". Vanguardngr.com. Retrieved April 15, 2014.
- ↑ "Monica Ogah:My Best Yet To Come". P.M. News. December 30, 2011. Retrieved October 16, 2014.
- ↑ Oogbodo, Oseyiza (September 28, 2013). "Life after Project Fame hasn't been easy –Monica Ogah". National Mirror. Archived from the original on October 2, 2013. Retrieved October 16, 2014.
- 1 2 "My Story Monica Ogah: Dad Wanted Me To Be A Nurse". Thisday. August 24, 2013. Archived from the original on April 16, 2014. Retrieved April 15, 2014.
- ↑ "Naija Star, Monah Ogah Taking Africa By Storm". Vibeweekly.com. n.d. Archived from the original on March 5, 2016. Retrieved April 15, 2014.
- ↑ "Final 19 Contestants: Monica Ogah". Projectfamewestafrica.com. n.d. Retrieved April 15, 2014.
- 1 2 "The Nation – Monica Ogah wins MTN Project Fame". The Nation. December 18, 2011. Retrieved April 15, 2014.
- ↑ "How Monica Emerged Project Fame Winner". P.M. News. December 11, 2011. Retrieved October 16, 2014.