Montell Jordan
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
| Aha enyere | Montell |
| Aha ezinụlọ ya | Jordan |
| Aha pseudonym | Montell Jordan |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Disemba 1968 |
| Ebe ọmụmụ | Los Angeles |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, odee egwu, onye na-emeputa ihe ndeko |
| Ebe agụmakwụkwọ | Pepperdine University, Junípero Serra High School |
| Oge ọrụ ya (mmalite) | 1994 |
| Ụdị olu | tenor |
| Ngwa egwu | olu egwụ |
| Diskografi | Montell Jordan discography |
| Onye òtù nke | Kappa Alpha Psi |
| Ụdị | R&B dị ugbu a |
| Akara ndekọ | Def Jam Recordings |
| Webụsaịtị | https://montellandkristin.com |

Montell Du'Sean Barnett Jordan (amụrụ, na Disemba 3, 1968) bụ ónyé ụkọchukwu America, ónyé na-agụ egwu, ónyé na'ede egwu, na ónyé na-emepụta ihe ndekọ. A maara nke ọma màkà egwu ya nke 1995 "This Is How We Do It", Jordan bụ onye isi nwoke na-eme ihe nkírí na Def Jam's Def Soul ruo mgbe ọ hapụrụ akara ahụ na 2003.
N'afọ 2010, Jordan hapụrụ azụmahịa egwu iji bụrụ onye ndụ ofufe na Victory World Church na Norcross, Georgia.[1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Montell Jordan na South Central Los Angeles na Elijah na Deloris Jordan. A mụrụ ya n'ezinụlọ Baptist, Jordan gara ụka ya ugboro ugboro mgbè ọ bụ nwatakịrị, ebe nne ya na nnà ya rụrụ ọrụ dị ka dikọn. Ka ọ na-etolite, Jordan na-akpọ piano màkà ụka ya dị ka onye na-eti egwu. N'etiti afọ 1980, Montell gara Junipero Serra High School na Gardena California, yana Mahadum Pepperdine na Malibu, California, ebe ọ nwetara nzèrè bachelọ na nkwukọrịta.[2] Ọ ghọrọ onye otu Kappa Alpha Psi fraternity n'oge opupu ihe ubi nke afọ 1989. Jordan gụsịrị akwụkwọ na 1991.
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Montell Jordan Leaving Entertainment Behind For Good?! Taking on the Ministry!. UrbLife.com (December 1, 2010).
- ↑ (2000) in Colin Larkin: The Virgin Encyclopedia of Nineties Music, First, Virgin Books. ISBN 0-7535-0427-8.