Mubarak Shaddad

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Mubarak Shaddad
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSudan Dezie
Aha enyereMubarak Dezie
aha ezinụlọ yaShaddad Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1915 Dezie
Ebe ọmụmụBarah Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1980s Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysician, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
ebe agụmakwụkwọFaculty of Medicine University of Khartoum Dezie

Mubarak al-Fadil Shaddad' (Àtụ:Lang-ar; (1915–1980) bụ ọkachamara ahụike na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Sudan. Ọ rụrụ ọrụ dịka ọkachamara na obstetrics na Gynaecology|gynecology, mechaa bụrụ onye isi na Omdurman Teaching Hospital. Ọ sonyeere na Òtù ndị ọrụ ahụike mba Sudan wee soro na Nnwogha nke Ọktoba 1964, bụ maka mgbanwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Sudan. Shaddad jere ozi na Second Sudanese Sovereignty Council wee jide ọkwa onye isi ala obere oge. Ọ bụkwa onye isi oche nke Constituent Assembly mana ndị [[w:|1969 Sudanese coup d'état|ịchụpụ n'oche ọchịchị n'ike nke afọ 1969] kwaturu ya.

Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Mubarak Al-Fadil Shaddad n'afọ 1915, na Barah, Sudan.[1] O nwetara nzere Diploma site na Ụlọ Akwụkwọ Ahụike Kitchener n'afọ 1934, wee rụọ ọrụ na Omdurman, Khartoum, Juba, Yei, Sinja, Sennar, Ad-Damazin, Gedaref and El-Obeid.

Ọrụ ahụike Ya[dezie | dezie ebe o si]

Shaddad rụrụ ọrụ na Omdurman Teaching Hospital 1961-1964 ebe ọ ghọrọ ọkachamara dị elu na ngalaba obstetrics na gynecology, wee bụrụ onye isi. Ntinye n'ọrụ ya ruru na Kansụl nke Òtù ndị Ahụike mba Sudan, bụ ebe ọ na-ekere òkè na-arụsi ọrụ ike maka ọtụtụ nnọkọ site na 1961 ruo 1964.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị Ya[dezie | dezie ebe o si]

E wezụga mbọ ahụike ya na agụmakwụkwọ ya, ọ nọrọ n'ọkwa ndị dị mkpa dịka odeakwụkwọ nke Graduates' General Congress (GG) na Juba site na 1939 ruo 1940, na Onye isi òtù ahụ site na 1943 ruo 1945. Òtù GGC ahụ depụtara akwụkwọ nkokọ mbụ n'afọ 1942, na-achọ nnwere onwe pụọ n'aka Òtù ndị ọrụ Anglo-Egypt. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi obodo El-Obeid ma jidekwa ọkwa onye isi oche nke Sudan Football Association site na 1951 ruo 1956.[2][3]

The Second Committee of Sovereignty (3 December 1964–10 June 1965) from left to right: Tigani El Mahi, Mubarak Shadad, Ibrahim Yusuf Sulayman, Luigi Adwok Bong Gicomeho and Abdel Halim Mohamed[4]

Shaddad bụụrụ ótù n'ime ndị nnọchianya nke Doctors Syndicate mgbe a na-eme Nnwogha nke ọnwa Ọktoba 1964 , ama ama, na-anọ n'ihu ihu na ihe omume ahụ nke dubara na mgbanwe pụtara ìhè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Sudan.[5] Akpọrọ ya ka o were ọkwá ịbụ eze, mana ọ jụrụ ya n'ihi ịbụ onye isi ala nke Lieutenant General Abboud mgbe ahụ .[6][7] N'esote mwepụ nke Abboud, ọ weere ọrụ na Sudanese Sovereignty Council nke abụọ, na-eje ozi dị ka onye òtù, ma mesịa dị ka onye isi oche ngagharị site na 3 Disemba 1964 ruo 10 June 1965 [8] Ọ bụ onye isi oche nke Kansụl ahụ, wee bụrụ onye isi steeti n'etiti 1–31 Jan 1965 na 1–10 June 1965. .[9] Shaddad ghọrọ onye isi oche nke Constituent Assembly maka nnọkọ 1966–1968, bụ nke nchụpụ n'oche ọchịchị n'ike nke afọ 1969 mba Sudan mechara gbasasịa. [10]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. المبارك شداد..البرلماني الطبيب (ar) (2022-02-18).
  2. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified (ar).
  3. Fadl, Omer (2009-07-23). Abdel Halim | Obituary (en).
  4. مجلس السيادة الثاني 1964-1965 م » Présidence de la République - Palais présidentiel.
  5. Obituary: Abdel Halim Mohammed Abdel Halim (2009).
  6. Daftar Presiden Sudan | UNKRIS | Pusat Ilmu Pengetahuan.
  7. Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specifiedMahmoud.Munir. (ar).
  8. Daftar Presiden Sudan | UNKRIS | Pusat Ilmu Pengetahuan.
  9. Sudan (The): Sovereignty Council: 1964-1969 - Archontology.org.
  10. المبارك شداد..البرلماني الطبيب (in Bekee), retrieved 2023-06-02