Nọọsụ na-amụ nwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

 

onye nọọsụ na-amụ nwa bụ ma onye nọọsụ (na-abụkarị onye nọọchị edebanyere aha) na onye na-amụ ime, ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nọọsụ ma na-amụ ụmụ nke na-eduga n'ịrụ ọrụ dị ka onye nọọlụ na-amụmụ nwa mgbe ụfọdụ na-enweta asambodo na nka. Ndị nọọsụ na-ahụ maka ịmụ nwa na-elekọta ụmụ nwanyị n'oge ndụ ha niile, gụnyere n'oge ime na oge ha amuchara, yana nlekọta ụmụ nwanyị na igbochi ọmụmụ.[1]

Omume[dezie | dezie ebe o si]

Ndị nọọsụ na-amụ nwa nwere ike ịrụ ọrụ dị ka ndị na-ahụ maka ahụike maka ụmụ nwanyị ma na-enyekarị nlekọta ahụike maka ndị inyom nwere ahụike, ndị a na-ewere ahụike na ọmụmụ ha dị ka ihe na-enweghị mgbagwoju anya karịa nnukwu ihe ize ndụ, yana ụmụ ọhụrụ ha. Ụmụ nwanyị nwere nnukwu ihe ize ndụ nke ime ime nwere ike ịnata uru nke nlekọta ịmụ nwa site n'aka onye nọọsụ na-amụ nwa na mmekorita ya na dọkịta. Nọọsụ na-amụ nwa nwere ike ịrụkọ ọrụ ọnụ ma ọ bụ na mmekorita ya na onye na-ahụ maka ịmụ nwa na onye na'ahụ maka ụmụ nwanyị, onye na-enye ndụmọdụ na enyemaka nye ndị ọrịa na-enwe nsogbu ma ọ bụ nwere Akụkọ ahụike dị mgbagwoju anya ma ọ bụ ọrịa. Ha na-enye nlekọta ahụike maka ahụike mmekọahụ, ebe ha na-ahụkwa ụmụ nwanyị maka nyocha oge niile ma nwee ike ịmalite ụdị mgbochi afọ ime niile.

Ndị nọọsụ na-amụ nwa na-arụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ na ụlọ ọgwụ onwe onye ma nwee ike ịmụ ụmụ n'ụlọ ọmụmụ ma gaa ọmụmụ n'ụlọ. Ụfọdụ na-arụ ọrụ na ụlọ ọrụ agụmakwụkwọ dị ka ndị prọfesọ. [2]Ha nwere ike ide ọgwụ, ọgwụgwọ, ngwaọrụ ahụike, usoro ọgwụgwọ na nyocha. Ha nwekwara ike inye ụmụ nwanyị nlekọta ahụike site na oge uto site na nsọpụ, gụnyere nlekọta maka nwa ọhụrụ ha (neonatology), antepartum, intrapartum, postpartum na nlekọta gynecological na-abụghị nke ịwa ahụ. [3][4]N'ọnọdụ ụfọdụ, ndị na-amụ nwa nwekwara ike ilekọta nwoke nke nwanyị ha na-arịa ọrịa n'akụkụ ọrịa na-ebute site na mmekọahụ na ahụike ọmụmụ. Na United States, ihe na-erughị otu pasent nke ndị nọọsụ na-amụ nwa bụ ụmụ nwoke.[5][6]

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Mary Breckinridge, Onye guzobere Ọrụ Nọọsụ FrontierỌrụ Nọọsụ Na-ahụ Maka Ógbè
  • Nọọsụ nwere asambodo (United States)
  • Ịmụ Nwa
  • Doula
  • Nọọsụ
  • Nọọsụ na-amụ nwa

Ihe odide[dezie | dezie ebe o si]

  1. Nurse Midwife. Mayo Clinic College of Medicine and Science. Retrieved on 10 July 2020.
  2. The Role of a Certified Nurse Midwife. University of Cincinnati Online Master of Science in Nursing. Archived from the original on 2017-05-09. Retrieved on 2019-08-03.
  3. 18.4. Midwife practice guidelines.. The Pennsylvania Code. Retrieved on 24 September 2014.
  4. 49 Pa. Code § 18.4. Midwife practice guidelines.
  5. Pilkenton (February 2008). "Midwifery: A career for men in nursing". Men in Nursing. DOI:10.1097/01.MIN.0000310888.82818.15. 
  6. Travel Nurse Company. Friday, 9 April 2021

Àtụ:Nursing