Nadia Fares Anliker

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nadia Fares Anliker
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEgypt, Switzerland Dezie
Aha enyereNadia Dezie
aha ezinụlọ yaFares Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya18 Septemba 1962 Dezie
Ebe ọmụmụBern Dezie
Asụsụ obodoEgyptian Arabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Egyptian Arabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ndu ihe nkiri, onye nhazi ederede, Odee akwụkwọ Dezie
ebe agụmakwụkwọNew York University Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1986 Dezie
Ihe nriteQ116601944 Dezie
ahọpụtara makaSwiss Film Award for Best Fiction Film Dezie
webụsaịtịhttps://www.nadia-fares.com/ Dezie
kọwara na URLhttps://www.swissfilms.ch/de/film_search/filmdetails/-/id_person/1CC8DBDEBE80408DBA6A06305C66722F Dezie
Nadia Fares Anliker
Born (1962-09-18) September 18, 1962 (age 59)



Bern, Switzerland
Nationality Egyptian-Swiss
Alma mater Cairo University



New York University
Occupation Film director, screenwriter
Years active 1986-present

Nadia Fares Anliker (a mụrụ na 18 Septemba 1962) bụ onye nduzi ihe nkiri na onye edemede ihe nkiri nke Egypt-Switzerland.

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Fares na Bern, Switzerland, nwa nwanyị nke nna Ijipt na nne Switzerland.[1] Ọ mụtara Arabic mgbe ọ na-agụ akwụkwọ na Cairo ruo otu afọ, ma gụsịrị akwụkwọ na Mahadum Cairo n'afọ 1986.[1][2] N'otu afọ ahụ, Fares duziri ihe nkiri mkpirikpi mbụ ya, Magic Binoculars, nke mbụ n'ime ọtụtụ mepụtara maka telivishọn Switzerland. Fares malitere ịga Mahadum New York n'afọ 1987 iji mụọ ihe nkiri. N'afọ 1991, o ritere ihe nrite site na Stanley Thomas Johnson Foundation maka obere ihe nkiri ya Sugarblues . Mgbe ọ nọ na Mahadum New York, Krzysztof Kieślowski duziri Fares ma jee ozi dịka osote onye nduzi maka ọtụtụ ọrụ ya.[1] O nwetara nzere masta ya na ọmụmụ ihe nkiri n'afọ 1995.[2]

N'afọ 1996, Fares duziri ihe nkiri mbụ ya, Miel et Cendres . Ọ na-agbaso njikọ nke ụmụ nwanyị atọ: dọkịta Naima, onye gụsịrị akwụkwọ Amina, na nwa akwụkwọ Leila. Miel et Cendres na-achọpụta njem ha ka ha na-agagharị n'etiti ọdịnala na ọgbara ọhụrụ.[2] Ọ natara onyinye iri na asatọ n'ọtụtụ mmemme ihe nkiri, gụnyere Oumarou Ganda Prize na Panafrican Film and Television Festival nke Ouagadougou.[2][3] Fares duziri ọtụtụ ihe nkiri dị mkpirikpi na isiokwu nke nsogbu mmekọrịta ọha na eze na ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka RTS / TV5 Monde.[2]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

  • 1986 : Magic Binoculars (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1986 : Akwụkwọ ozi si New York (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1987 : Projections on Sundays (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1987 : Semi-Sweet (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1988 : Charlotte's Empire (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1988 : 1001 American Nights (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1990 : Sugarblues (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1992 : D'amour et d'eau fraîche (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1993 : Made in Love (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1995 : Portrait of a HIV-positive woman (short film)
  • 1995 : Quand mon heure viendra (ihe nkiri dị mkpirikpi)
  • 1996 : Mmanụ aṅụ na ntụ
  • 2003 : Anomalies passagères (ihe nkiri TV)
  • ; 2011 Atụmanya

Edemsibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Hillauer (2005). Encyclopedia of Arab Women Filmmakers. American Univ in Cairo Press. ISBN 978-9-774-24943-3. 
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 Honey and Ashes. African Film Festival New York. Retrieved on October 8, 2020. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "honey" defined multiple times with different content
  3. Barlet (24 September 2002). Fespaco 1997 : le développement sera culturel ou ne sera pas. Africultures. Retrieved on 8 October 2020.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]