Nagwa Khalil

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nagwa Khalil
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEgypt Dezie
Aha enyereNagwa Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Asụsụ obodoEgyptian Arabic Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaArabic, Egyptian Arabic Dezie
Ọrụ ọ na-arụcivil servant Dezie
ebe agụmakwụkwọCairo University Dezie

 

Nagwa Hussein Khalil bụ minista na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze na mkpuchi n'Ijipt. E duru ya n'iyi ọrụ ka O soro na ndị òtù ọrụ praịm minista Hesham Qandil n'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2012, mgbe mgbanwe ọchịchị nke Ijipt wepụrụ onye isi ala Hosni Mubarak.[1] Ọ bụ otu n'ime ndị minista nwere onwe ha na kansụl, yana naanị otu n'etiti ụmụ nwanyị abụọ nọ na kansụl.[2][3]

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Khalil nwetara nzere Ph.D. ya na Mahadum Cairo, ebe akpọrọ thesis ya "Nsogbu nke ndị Ijipt ka Agha mba Ụwa nke Abụọ gasịrị".[4]

Ọrụ na-abụghị nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya[dezie | dezie ebe o si]

Khalil jere ozi dị ka onye otu kọmitii na-achọpụta eziokwu, nke e nyere iwu ịchọpụta ihe ike maọbu ihe ize ndụ ndị mere n'oge Mgbanwe Ijipt nke afọ 2011.[4]

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya[dezie | dezie ebe o si]

E wepụrụ Ministri n'ahụ maka mmekorita mmadụ na ibe ya n'ime obodo na nkpuchi (Ministry of Social Affairs and Insurance) afọ isii tupu mgbanwe ọchịchị nke Egypt nke afọ 2011, mana e weghachiri ya n'oge ọchịchị nwa oge[2] nke praịm minista nke oge ahụ bụ Kamal Ganzouri.[4][3] Khalil jere ozi dị ka minista na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze na mkpuchi na òtù ndị ọrụ Ganzouri.[2] N'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 2012, e duru Khalil n'iyi ọrụ.[1] Nkwupụta mbụ Khalil kwuru mgbe a họpụtara ya bụ na ọ ga-arụ ọrụ iji mụbaa ụgwọ a na-akwụ́ ndị lara ezumike nká n'Ijipt.[4]

Na ngwụcha ọnwa Ọgọstụ, Khalil gwara Al-Masry Al-Youm na ụfọdụ ndị otu Ụmụnne ndị Alakụba bịakwutere ya iji mee ka òtù ndị Ụmụnne Alakụba bụrụ nke iwu kwadoro, nke ga-enye ha ohere ime ka ọnọdụ ya bụrụ nke iwu kwadoro ma kwụsị esemokwu banyere okwu ahụ. Otú ọ dị, Khalil kwuru na ha etinyeghị arịrịọ n'ụzọ o kwesịrị, n'ihi na ha na-atụ egwu n'ihi "ọnụ ọgụgụ ndị otu ya, isi mmalite ego na ebumnuche iwu na-akwadoghị ga-ekpughe".[5]

  1. 1.0 1.1 Egypt’s president swears in new Cabinet; Tantawi to remain defense minister. Al Arabiya (2 August 2012). Retrieved on 8 August 2012. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Sworn in" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 Egypt's Newly Appointed Cabinet Ministers. American Chamber of Commerce in Egypt. Retrieved on 30 August 2012. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "acc" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 El-din. "Egypt PM Qandil makes some surprise, controversial ministerial choices", Al Ahram, 3 August 2012. Retrieved on 2 September 2012. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Kamal" defined multiple times with different content
  4. 4.0 4.1 4.2 4.3 "Meet the ministers: A thumbnail guide", Al Ahram, 7 December 2011. Retrieved on 30 August 2012. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "alahram2011" defined multiple times with different content
  5. "Brotherhood official hopes new bill will legitimize group", Egypt Independent, 27 August 2012. Retrieved on 2 September 2012.