Naomi Jacobson
Ọdịdị
Naomi Jacobson
| Ụdịekere | nwanyị |
|---|---|
| Mba o sị | South Africa |
| Aha enyere | Naomi, Deborah |
| Aha ezinụlọ ya | Jacobson |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 1 Jụn 1925 |
| Ebe ọmụmụ | Windhoek |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 2016 |
| Ikwu | Stephen Hobbs |
| Asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | English |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye na-akpụ ihe ọkpụkpụ |
| Ebe agụmakwụkwọ | University of Cape Town |
| Ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Naomi Jacobson bụ onye na-akpụ ihe. A mụrụ ya na Windhoek na South West Africa n'ubochí izizi n'ọnwa Juun n'afọ 1925.[1] Nna ya bụ Israel Goldblatt, onye ọka iwu na onye na-akwado nnwere onwe Namibia.[1] Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Cape Town ebe ọ zutere ma lụọ di ya Larry. Ha kwagara Johannesburg n'afọ 1973.[1] N'oge ọrụ ya, o mere ihe oyiyi nke ndị mmadụ gụnyere Lord Baden-Powell, Nelson Mandela, Oliver Tambo, ndị eze Zulu Shaka na Cetshwayo, Steve Biko, na Sir Seretse Khama.[1] Ọ nwụrụ n'afọ 2016.[1]