Naomi Nhiwatiwa

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Naomi Nhiwatiwa
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyereNaomi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya15 Eprel 1941 Dezie
Ebe ọmụmụMutare Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya12 Eprel 2012 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịZimbabwe African National Union – Patriotic Front Dezie

Naomi Pasiharigutwi Nhiwatiwa (15 Eprel, na afọ 1941 na 12 Eprel, na afọ 2012) bụ onye na-agbachitere nnwere onwe na Zimbabwe na minista. N'afọ ndị 1990, ọ rụrụ ọrụ ogologo oge dị ka onye nduzi na World Health Organization na Brazzaville, Congo.[1][2][3]

Akụkọ ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na Umtali (nke a kpọrọ Mutare na afọ 1982), ọ gụrụ akwụkwọ na United States na Mahadum Steeti nke New York na Buffalo, nweta PhD na Intercultural and Diplomatic Communications na afọ 1979. Na ngwụcha afọ 1970, o sonyere na nzukọ mbụ nke ZANU-PF Women's League na Shai Shai na Mozambique. Ọ ghọrọ ọnụ na-ekwuru pati ahụ, na-achọsi ike ịkwalite nnwere onwe ụmụ nwanyị.[4] Mgbe nnwere onwe nke Zimbabwe gasịrị na afọ 1980, Nhiwatiwa bụ otu n'ime ụmụ nwanyị ise ghọrọ ndị omeiwu maka otu ZANUāPF na-achị. N'akụkụ osote onye isi ala Joice Mujuru na Victoria Chitepo, dị ka osote minista nke post na nkwukọrịta, ọ bụ otu n'ime ụmụ nwanyị ole na ole na Zimbabwe.[5]

N'afọ 1988, ọ hapụrụ gọọmentị Zimbabwe ka ọ bụrụ onye isi Unicef na Nairobi, Kenya. Ọ kwagara Brazzaville na afọ 1993 dị ka onye nduzi na-ahụ maka mmekọrịta mba ọzọ nke World Health Organization maka mpaghara Afrika. N'afọ 1998, ọ ghọrọ onye ndụmọdụ ukwu na United Nations na New York.[5]

Mgbe ọ lara ezumike nká na United Nations na afọ 2001, Nhiwatiwa ghọrọ onye ọrụ ebere, na-eguzobe Zerapath AIDS Orphanage na Harare. Ọ bụkwa onye ọkachamara nleta na Mahadum Pepperdine na California.[2]

Naomi Nhiwatiwa nwụrụ na South Bend, Indiana, na 12 Eprel, na afọ 2012.[1]

Ebenside[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Naomi P. Nhiwatiwa. Palmer Funeral Homes. Retrieved on 10 February 2016.
  2. 2.0 2.1 War hero Naomi Nhiwatiwa dies. New Zimbabwe (23 April 2012). Archived from the original on 16 February 2016. Retrieved on 10 February 2016.
  3. Mitchell (1980). African Nationalist Leaders in Zimbabwe: Who's who 1980. D. Mitchell, 88–. 
  4. Lyons (2004). Guns and Guerilla Girls: Women in the Zimbabwean National Liberation Struggle. Africa World Press, 112–. ISBN 978-1-59221-167-8. 
  5. 5.0 5.1 Naomi Nhiwatiwa dies in USA. The Herald (24 April 2012). Retrieved on 10 February 2016.

Àtụ:Members of the 1st Parliament of Zimbabwe