Jump to content

Ndị Yombe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Yombe
Africa Yombe Diviners Mask Kimbell.jpg
Diviner's Mask
Total population
Regions with significant populations
Zambia, Republic of the Congo, the Democratic Republic of the Congo, Angola
Language(s)
Religion(s)

A na-akọwa ma ọ dịkarịa ala ìgwè ndị mmadụ abụọ n'Afrịka dị ka Ndị Yombe. Ha bi site ns mbụ na Zambia, Republic of the Congo, Democratic Republic of the Congo na Angola. Ndị maara ọrụ aka na ǹkà nke ọma, ndị ikom ha na-etinye aka n'ịkpa ákwà, ịkpụ ihe, na ịkpụ ụzụ, ebe ụmụ nwanyị ha na-emekwa ite ụrọ. Ndị a ma ama gụnyere Nkisi nkonde na ihe oyiyi nwanyị phemba.

Nkesa Ha[dezie | dezie ebe o si]

N'afọ 1981, e nwere ọnụ ọgụgụ nchịkọta ihe dịka mmadụ puku iri na ise nke ndị Yombe, bi n'ebe dị square 625 (1,620 km²). [1] Ìgwè a na-ezo aka na ndị mmadụ bi n'etiti ndị Tumbuka nke Zambia. [2]   Yombe bụ otu n'ime ìgwè mba ọzọ dị isii wakporo ndị Tumbuka mgbe afọ 1760 gasịrị. Ìgwè ọzọ, nke a na-akpọkwa Ndị Yombe, bi n'akụkụ ndịda ọdịda anyanwụ nke Republic of the Congo, ebe ndị ọzọ bi na Democratic Republic of the Congo na Angola. Ìgwè a na-ezo aka na ndị mmadụ n'etiti Kongo.

Omume mkpata akụ na ụba[dezie | dezie ebe o si]

Ndị Yombe na-etinye aka na mmepụta ugbo, na-akụ ihe ọkụkụ dị ka ùnèrè, ọka, àgwà, manioc, ahụekere, na ji. Ọ bụ ezie na ha na-akụ ha maka nri, ha na-erekwa ihe ọkụkụ ha n'ahịa. Ha na-azụ ewu, ezì na ọkụkọ ma na-egbu azụ na Osimiri Congo. Ndị maara ọrụ aka na ǹkà nke ọma, ndị ikom ha na-etinye aka n'ịkpa ákwà, ịkpụ ihe, na ịkpụ ụzụ, ebe ụmụ nwanyị ha na-emekwa ite ụrọ.[3]

Omume Omenala na okpukpe Ha[dezie | dezie ebe o si]

Ihe akpụrụ akpụ na Musée L, Louvain-la-Neuve

A maara ǹkà ha n'ihe osise nke ihe oyiyi na ihe oyiyi Yombe nke ọma, na ọ na-abụkarị ihe ndị dị ùgwù, ndị eze nọ ọdụ n'ocheeze, ma ọ bụ ihe oyiyi nwanyị phemba (nne). [3] A na-emekwa ihe oyiyi Nkisi nkonde, ihe nkpuchi na ịgbà maka ememe dị iche iche. [4] A maara ndị na-emere ha olili maka ihe ngosi ha yitechara ihe ndị dị ìrè.[5]

Chi kachasị elu nke Yombe bụ Ngoma Bunzi, onye si n'ebe a na-apụghị iru eru a na-akpọ Yulu. A na-akpọtụrụ ya site na Nzambi a Tsi (mmụọ ụwa) na Simbi (mmụọ osimiri). Ndị Yombe na-ewu ebe nsọ dị ka ihe ncheta maka ndị nna nna a ma ama, dị ka ndị isi obodo ndị nwere ikike pụrụ iche.[4] Ndị Yombe nke mgbago ugwu Zambia kwenyere na ndị mmadụ nwere njirimara atọ dị iche iche: nke anụ ahụ, nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na nke ime mmụọ. Ọnọdụ ha na-emetụta ụdị olili ozu nke a ga-enye ha.[6]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Database for Indigenous Cultural Evolution (DICE):Yombe Factsheet. University of Missouri. Archived from the original on 5 March 2017. Retrieved on 16 October 2016.
  2. Chondoka (16 December 2015). A History of the Tumbuka from 1400 to 1900. Xlibris Corporation. ISBN 978-1-4990-9628-6. 
  3. 3.0 3.1 Tribal African Art: Yombe. Zyama.com. Retrieved on 16 October 2016.
  4. 4.0 4.1 Yombe. Art & Life in Africa. Retrieved on 16 October 2016.
  5. Vogel (1981). For Spirits and Kings: African Art from the Paul and Ruth Tishman Collection. Metropolitan Museum of Art. ISBN 978-0-87099-267-4. 
  6. Fukuyama (28 July 1999). Integrating Spirituality into Multicultural Counseling. SAGE Publications. ISBN 978-1-5063-2072-4. 

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]

Mgbasa ozi metụtaraNdị Yombena Wikimedia CommonsÀtụ:Ethnic groups in AngolaÀtụ:Ethnic groups in the Democratic Republic of the CongoÀtụ:Ethnic groups in the Republic of the Congo