Ndị ojii nọ na Poland

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Africans in Poland
Afro-Polish
Total population

~5,000[1]

Regions with significant populations
Warsaw (Wola), Łódź, Wrocław, Gdańsk, Szczecin
Language(s)
Polish, French, English
Religion(s)
Islam, Roman Catholicism, Atheism

Ndị ojii nọ na Poland, nke a makwaara dị ka Afro-Poles ma ọ bụ Afro-Polish (Polish: ), bụ ụmụ amaala ma ọ bụ ndị bi na Poland bụ ndị agbụrụ Afrịka.

Akụkọ ntoala ihe mere eme[dezie | dezie ebe o si]

Mmalite nke obodo Afro-Polish gbanyere mkpọrọgwụ na njem ngafe agụmakwụkwọ na Polish People's Republic. Gọọmentị Oha kwadoro n'ụzọ siri ike mmegide ọchịchị na Afrịka dịka akụkụ nke iwu Soviet sara mbara. Site n'afọ 1950 ruo n'afọ 1980, ọtụtụ ndị Ojii kwagara Poland ịchụso agụmakwụkwọ ha. Ọ bụ ezie na ọtụtụ ụmụ akwụkwọ Afrịka nọ na Poland laghachiri obodo ha, ọtụtụ kpebiri ịnọgide na Poland ma nweta akwukwo nwa amaala. Obodo Afro-Polish nke oge a nwere ọtụtụ n'ime ndị Oji a na ụmụ ha.[2]

N'afọ 1955, e mere Emume Ụwa nke ise nke Ndị na eto eto na Ụmụ akwụkwọ na Warsaw. Ọ bụ ndị aka ekpe, ndị na-emegide imperialist World Federation of Democratic Youth haziri ememme ahụ, a kpọrọ ọtụtụ puku ndị nnọchiteanya si gburugburu ụwa, gụnyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Otu puku ndị Ojii. Ndị isi gomenti Oha nke Poland chọrọ igosipụta ịdị n'otu ma kwalite mmekọrịta mmadụ na ibe ya nye ndị Afrịka sitere na mba ndị a na-achị achị. Nke a bụ otu n'ime nzute mbụ nke ndị Poland na ndị na-abụghị ndị ọcha, na-esote ogwugwu nke ọdịbendị dị iche iche na agbụrụ dị iche iche nke abụọ Polish Republic na-esote Agha Ụwa nke Abụọ. E nyere ụlọ ọrụ mgbasa ozi Polish ọrụ nke idekọ ndị ọbịa ojii, nke malitere usoro na-aga n'ihu nke foto ndị nta akụkọ Poland na-egosi ndị ọbịa Ojii si Afrịka na ndị bi na Poland.[3]

Ụmụ amaala Afro-Polish ama ama ma ọ bụ ndị bi na ya[dezie | dezie ebe o si]

Ntụrụndụ na mgbasa ozi[dezie | dezie ebe o si]

  • Mamadou Diouf - onye egwu amụrụ na Senegal
  • Robert Gendy - Onye nta akuko na onye na- eme ihe onyonyo nke agbụrụ Ijipt
  • Sara James - onye na-agụ egwu amụrụ na Poland nke sitere Naijiria[4]
  • Patricia Kazadi - onye nwanyi na-eme ihe nkiri amụrụ na Poland nke sitere mba Congo
  • Omenaa Mensah - Onye nta akuko ihe onyonyo amụrụ na Poland nke sitere mba Ghana
  • August Agbola O'Browne - Onye na-aku egwu Jazz, onye otu ndị Poland na-eguzosike
  • Omar Sangare - Onye na- eme ihe nkiri si mba polish, burukwa Onye na- ede egwu akwụkwọ na- ahazikwa nkwago ihe nkiri.
  • Patrycja Soliman - Onye na-eme ihe nkiri, nna Ijipt
  • Aleksandra Szwed - onye nwanyi na-eme ihe nkiri amụrụ na Poland nke sitere na Naijiria
  • Ifi Ude - onye na-agụ egwu amụrụ na Naijiria

Ndị agha[dezie | dezie ebe o si]

  • Władysław Franciszek Jabłonowski - Onye amụrụ na Poland bụ Napoleonic General nke sitere n'agbụrụ Bekee na Afrịka

Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Ndị na- why maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya[dezie | dezie ebe o si]

  • Killion Munyama - onye amuru Na Zambia bu Onye otu Polish People's Party nke Sejm
  • John Godson - onye amụrụ na Naijiria bụ Civic Platform onye otu Sejm
  • Krystian Legierski - onye na-akwado LGBT, nna Mauritania

Ndị egwuregwu[dezie | dezie ebe o si]

  • Babatunde Aiyegbusi - onye amụrụ na Poland bụ onye na-agba mgba nke sitere na Naijiria
  • Michael Ameyaw - Onye egwuregwu bọọlụ nke si mba Ghana
  • Ishmael Baidoo - onye Ghana na-agba bọọlụ
  • Ferdinand Chi Fon - onye Kamerun onye egwuregwu bọọlụ lara ezumike nká
  • Martins Ekwueme - onye Naijiria na-agba bọọlụ
  • Sofia Ennaoui - Onye na-eme egwuregwu, nna Morocco
  • Kelechi Iheanacho - onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa
  • Benjamin Imeh - onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa
  • Maxwell Kalu - onye egwuregwu bọọlụ Naịjirịa
  • Thomas Kelati - Onye egwuregwu bọọlụ nke ihe ekete si Eritrea
  • Tafara Madembo - Onye egwuregwu bọọlụ nke agbụrụ Zimbabwe
  • Alain Ngamayama - Onye egwuregwu bọọlụ nke agbụrụ Congo
  • Emmanuel Olisadebe - onye egwuregwu bọọlụ amụrụ na Naijiria
  • Natalia Padilla - Onye egwuregwu bọọlụ nke agbụrụ Morocco
  • Artur Partyka - Onye bụbu onye na-awụli elu, nna Algeria
  • Yared Shegumo - Onye na-agba ọsọ dị anya amụrụ na Etiopia, onye ọkachamara na Marathon
  • Mouhamadou Traoré - onye Senegal na-agba bọọlụ
  • Stanley Udenkwor - Onye bụbu onye egwuregwu bọọlụ nke sitere na Naijiria
  • Izu Ugonoh - onye ọkpọ amụrụ na Poland nke sitere na Naijiria

Ndị ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

  • Abdulcadir Gabeire Farah - onye akụkọ ihe mere n' gboo amụrụ na Somalian na onye na-akwado mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
  • Maxwell Itoya - onye mbịarambịa Naijiria na Poland, onye e gburu na mwakpo ndị uwe ojii na ahịa flea.
  • Simon Mol - Onye Cameroon na-emegide ịkpa ókè agbụrụ e jidere maka I ima uma agbasa nje HIV
  • Eduard von Feuchtersleben - Injinia na onye edemede

Leekwa[dezie | dezie ebe o si]

 Igwe mmehe Poland

  • Murzyn
  • Murzynek Bambo

Ihe edeturu[dezie | dezie ebe o si]

 Usoro ihe edeturu

Edemsibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Valid documents".
  2. Poland: Sub-Saharan Africans and the struggle for acceptance. Minority Rights Group International. Retrieved on 2020-08-27.
  3. Afro-Poland: a revolutionary friendship, captured in rare photographs from 1955-1989. The Calvert Journal. Retrieved on 2020-08-27.
  4. Sara Egwu-James z "The Voice Kids" już tak nie wygląda. Dziewczyna przeszła metamorfozę (pl). plejadapl (2021-08-10). Retrieved on 2021-09-26.