Nkechi Okoro Carroll

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nkechi Okoro Carroll
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereNkechi Dezie
aha ezinụlọ yaCarroll Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAmerican English Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nhazi ederede, onye na-emeputa ihe onyoyo, showrunner Dezie

Nkechi Okoro Carroll bụ onye ode akwukwo, onye na emeputa ihe fim ma bụrụkwa onye na eso eme ihe nkiri . Ugbu a ọ bụ onye isi ọrụ na-emepụta ihe nkiri nke CW niile American . [1] [2] [3]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Carroll na New York, mana o biri n'ọtụtụ ebe dị iche iche mgbe ọ na-etolite, gụnyere Nigeria, Côte d'Ivoire, United States, na United Kingdom . [1] [4] [5] Ndị mụrụ ya bụ ndị Naịjirịa jere United States maka ịgụ akwụkwọ kọleji mana ha kpebiri ịnọ na obodo ahụ. [6] Nna ya bụ onye ọka iwu, mgbe Carroll dị afọ anọ, ezinụlọ ya kwagara Nigeria maka ọrụ nna ya. Mgbe ọ dị afọ asatọ, nne na nna Carroll kewara, ya na nne ya kwagara Côte d'Ivoire ka ha nọdu nso ụmụ nwanne nne ya. Mgbe ọ bi n'Africa, ọ na-ele ọtụtụ onyonyo, nke mere ka echiche ya banyere na ihe gbasara US. Kemgbe ọ bụ nwata, ọ chọrọ ịbụ onye edemede. E mechara ziga Carroll n'ụlọ akwụkwọ na Oxford, England ọ wee malite ịrụ na Oxford Youth Theater.

Carroll gara Mahadum Pennsylvania, ebe ọ natara asambodo BA na ndozi Akụnụba (Economics) na French na afọ 1998. [6] [5] N'oge ya na Penn, ọ bụ onye isi oche nke Association Ndị Mmụta nke Pan Africa ma mee ihe ngosi na African American Arts Alliance. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na kọleji, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye ọka akụ na ụba na Federal Reserve ma rụọ ọrụ na obere ihe nkiri na oge mgbede mgbe ahụ . Ọ na-asụ ọtụtụ asụsụ. [1]

Carroll nwetara akara ugo mmụta na akụnụba mba ụwa na Mahadum New York . [5]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Na 2004, Carroll na di ya hapụrụ New York wee kwaga Los Angeles iji chụọ ebum n'che Carroll maka ibụ onye edemede maka ihe nkiri na Hollywood. [6] Ọrụ izizi ya mbu bụ na The Finder . Mgbe ihe nkiri ahụ gwụchara mgbe otu oge gasịrị, Carroll sonyeere ndị edemede na ihe nkiri nyonyo Bones . Carroll rụrụ ọrụ dịka onye enyemaka onye nduzi ọrụ na Rosewood na The Resident . [1] [7] [5]

Na Machị 2014, Carroll weputara otu akpọrọ Black Women Who Brunch nke putara ndị inyom na-eri nri ụtụtụ na nri ehihie na-anọkọ ọnụ. Lena Waithe na Erika L. Johnson sonyere kwa na ndị bidoro otu a. Ezubere otu a iji jikọta ndị edemede ojii nwanyị na-arụ ọrụ na ụlọ ọrụ ihe nkiri. Ndị otu a na-ezukọkarị n'ụlọ Carroll. Ha na-enye ndi otu ha ndụmọdụ na akụrụngwa maka inwete ọrụ edemede maka ihe nkiri. Onye nta akụkọ Hollywood dere akụkọ banyere ndị otu ahụ na afọ 2018. Otu ahụ nwere mmadụ iri isii na abụọ n’oge ahụ, nkemere na foto ndị The Hollywood Reporter sere ha bụ foto kasị nwe nmadu n'ime ya n'oge ahụ.

Na 2018, Carroll sonyeere ndị ọrụ All American mgbe ihe omume nke ha ji nene ma ihe nkiri ahụ agadaba gasịrị. Ya na Eprel Blair, Greg Berlanti, na Sarah Schechtern rụkọrọ ọrụ mgbe ahụ. [8] [9] N'ọnwa Ọktọba n'afọ 2018, Carroll weghaara ọnọdụ dị ka onye isi ọrụ ngosi nke ihe nkiri ahụ, nochie Blair mgbe Blair kwụsịrị n'ọchịchị n'ihi nsogbu diri ihe onwe ya. [1] [4] [2] A hoputara Carroll maka onyinye onyonyo NAACP maka "Ederede pụrụ iche na usoro ihe nkiri" maka ihe nkiri America niile "Hussle & Motivate", mana n'ikpeazụ enwetaghị mmeri ahụ. [10] [11]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Carroll lụrụ onye nkụzi ụlọ akwụkwọ sekọndrị, Jonathan A. Carroll. Di na nwunye ahụ zutere na nkenke n'oge na Mahadum Pennsylvania, mana ha amaghị onwe ha nke ọma. Na nwa Eprel n'afọ 2000, ha abụọ hụrụ otu enyi ha na-eme ihe nkiri na Soul Cafe na New York City. Otu onye ibe ha na Mahadum Pennsylvania nke aha ya bụ John Legend sokwa na ihe nmenme ahụ ma bụrụ onye meghe egwuregwu. Nkechi so onye ọzọ ga ebe, ma na obere oge ya na Jonathan malitere bụrụ eny, ma mecha lụọ. Ha nwere umu nwoke abuo ma biri na Los Angeles ugbu a .

Carroll bụ Onye otu Kraịst. [12] Ọ nọ na ụlọ agbakwunye na World Trade Center ebe ụgbọ elu ndị ahụ dara n'ụlọ elu ha na ụbọchị iri na otu na ọnwa nke Septemba n'afọ 2001. O ji ukwu wee gafee Brooklyn Bridge mgbe ndị mmadu na agba ọsọndu n'ụbọchị ahụ. Carroll na-asụ ọtụtụ asụsụ. [1] Ihe ngosi onyonyo kachasị amasị ya bụ Buffy the Vampire Slayer . [6]

Ntụrụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 ‘All American’: Nkechi Okoro Carroll Tapped As New Showrunner As Creator April Blair Exits CW Series. Retrieved on 31 March 2020. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "Andreeva" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 The CW’s ‘All American’ pens a ‘love letter’ to Nipsey Hussle and South L.A.. Retrieved on 31 March 2020.
  3. ‘All American’ EPs On Season 2 Hopes After Netflix Bump For Bubble Series & Honoring Nipsey Hussle. Retrieved on 31 March 2020.
  4. 4.0 4.1 ‘All American’s’ New Boss: ‘We Want to Make Sure We’re Truthful’. Retrieved on 31 March 2020.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 Nkechi O. Carroll. Retrieved on 31 March 2020.
  6. 6.0 6.1 6.2 6.3 Running the Show. Retrieved on 31 March 2020.
  7. ABC Nabs Missing Person Drama ‘Found’ From Nkechi Okoro Carroll & Berlanti Productions As Put Pilot.
  8. ‘All American’ Casts Erica Peeples; Miguel Angel Garcia Joins ‘Deputy’. Deadline. Retrieved on 31 March 2020.
  9. 'All American' Season 3 Release Date: When is the Next Season Coming to the CW and Netflix?. Newsweek. Retrieved on 31 March 2020.
  10. NAACP Image Awards: Lizzo Named Entertainer Of The Year; ‘Just Mercy’, ‘Black-Ish’, ‘When They See Us’ Among Top Honorees – Full Winners List. Deadline. Retrieved on 31 March 2020.
  11. NAACP Winners 2020: The Complete List. Yahoo! Entertainment. Retrieved on 31 March 2020.
  12. "Interview with Nkechi Okoro, New York, New York, November 16, 2001". Retrieved on 2 April 2020.