Nkwa-ỤMỤAGBỌGHỌ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Egwu Nkwa Ụmụagbọghọ
type of dance
obere ụdị nkefolk dance Dezie
mba/obodoNaijiria Dezie
nchekwa ngwa égwuịgba, Ikoro, Ekwe, Opi Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo Dezie

Nkwa Ụmụagbọghọ [1]bụ egwu e jiri mara ndi Ezi-inya, Ezi-Nwachi Ndibe na Afikpo North n'Ebonyi Steeti. O bu Egwu si n’ịgba mgba pụta. O nwere onye wụ Dịnta na- agba ntà. Ọ banye n’ ime ọfịa, na ọ banyere n’ ime ọfịa ije gbaa nta. ọ na-ejebukwa eje agba ntà ma o nwere mgbọshi o banyere ime ọhịa ije gba nta, ọ fụzie enwe ka ha na-agbazi mgba n'ime ọfịa ahụ ọ na-ene ha. Ha amahọdi na ọ na-ene ha, kwusizie ịgba nta ọ galị ịgba na- ene ha, negodezie ha, lọtazie be ya. Ka ọ bataziru beya, Ọ kpọro ụmụnwokeịa  na abọ bia na-egosizi ha ihe ọ fụgasara enwe a na-eme n’ ime ọfịa.

Megidezia, otu a ka eshizi bido ịgba mgba a ana-emezi. Emezie, ụmụokorobia abụọ pụtazie oge ịgba mgba, ha pụtazie, onye a puta, onye apụta, ha bịazie ịgba mgba, ofu onye ga amatu ibe ya n’ àlà. Ọdazie, onye ebee onye nwoke nke tụrụ nke matuzii nke a n’ala. Apụtazie amụrụzie shi ayi na onye shí n’ obodo anyị ma ọbụ na compoundụ anyị atụgonu mmadụ n’ ala. Ụmụagbọgọ zi shíkwa na ebe a onye a bi agbapụtazie na ogo ma o bu ama.    

Nkwa Umuagbogho

Apụtazie ebe ahụ biazie na-agbazi egwu na nwanne ha tuziri mmadụ, Ebe a ka Nkwa Ụmụagbọhọ si bidozie enwerezie nwayọ nwayọ na-emezi ya ruo taa.

Mgbe emechizere, alụchaziri agha na 1970, lọtazie, otu nwoke a na akpo Vincent Omerenwachi ma akpokwa ya a Omerasigo n’ Afikpo niile, biaziri jiri nwanyọ na-akuziziri ndị nwoke na ndị nwanyị. A na-akuziziri ụmụnwoke ka esi akụụ nkwa, maka ọ wụ ofu soso ofu ka a na-eme. A gbachahala nke ahụ, emekwaa, ebidokwa n’ íshí. O bu nwoke a jizi nwayọ na-ewebatazi ihe dịgasị iche iche.

O bu egwu ndị obodo a na-agba na ihe a na-akpọ n’ ishi ogo n’ ishi ogo. Ọ ruo mgbe a na-agba mgba, ndeee ndị ibe, ha ga-agba, ndi amaizu agbaa, ndị ọzọ a na-agba nke hà nwa. Ha gbachazie ndị obodo a bịakwa gbá nke ha. Emegide ozu ọnụ, ọwụrụ na-agbasigo mgba.

Ọ wụ nde Ụmụagbọghọ na agba ya. ọwụghị ụdị nde lugoro dị bu ndi mama na-agba. Nke a bu maka ụmụagbọhọ wụ ndị ahụ ha na ọkpụkpụ ha ka shiri ike maka ha alụbeghi dị ma o bu muo nwa. Kama ọ wụrụ na nwa otu n’ime ndi lugoro di bu ndi mama soo onye gbasiri mgba, tụọ mmadụ, o ga agbaputa kwa, biakwa tee égwu. A na-atụkwa mmadụ ego ma ya wụrụ na o tụọ mmadụ mgba. Nde nwoke anagha agba egwu a mana ha na-akụ ekwe ma ihe niile eji ágbá ya.

Na mbu, o bu na ọnwa iteolu ka a na ebido igba egwu a ruo iri na abụọ. Ugbu a, o nweghizi mgbe e ji agba ya. A na agba ya na mmeme ikuputa nwa, ịgba akwụkwọ, imepe ụlọ, eri ji, igba ọfaàlà, na ihe ndi ozo.

Egwu were usoro eji agba ya. A na abu uzo zi oge mgba na mbido. Ndi mgba ga-apụta, gba mgba. Ndi mgba a nwere ike buru madụ abuọ ma ọ bu atọ.   A gbachahala mgba ofu onye atụọ, ibe ya, ụmụnwanyị abiazie bia gba egwu. Egwu a na-agba bu nke a na-akpo Chakpuruegedem.

Agbacha chakpuruegedem, ụmụnwanyi agbaa Ọgalụzọ. A gbachaa Ọgalụzọ, abịa agbaa, enwere ike ha gbaa pim-pim. O nwekwara ike ha agbáa nke a na-akpo Nkwa Ụmụagbọhọ n’ ime nkwa Ụmụagbọghọ. Agbacha nke ahụ, ha wee bịa gbasie ofú ofu. A gbachaa ofu, ofu, gbachahala, onye-isi abiazie gba nke ya. E nwekwa nke a na-akpọ Ebini. Agbacha kwa, agba Ebini. Agbaa, wedezie egwu onye isi mechazie ihe niine, kpokotia ọnụ.

E nwere ejiji eji agba nkwa ụmụagbọghọ. Umuagbogho na agba ya na eyi mbelukwu, bịa kee akwa n’ara, kee nke ishi, na nke a akpo Ikanda. E tinyechazie  ya, e were nzu bekee, maa n’ ahụ, wee pụwazie. A na-ahọkwara nde na-eme njikere a, ọ wụghị madụ niile.

E nwere ngwa egwu eji ágbá nkwa umụagbọhọ. Ha dị asaa. Nke mbu wụ nke a na-akpọ Udu, a na-eme a na-ada gbum! gbum!, Gbum na enye nke na-ada, ọ na-adapụta. E nwee nke abụọ wụ nke a na-akpọ Eka-elu. A na-ewepụta, a na-agba, a na-eme, ọ na-eme kọ ọ na-eko. Nke atọ bu nke a na-akpọ Ikoro (talking drum). Ya nwa na-agwa ụmụnwanyi a ihe ha na-agba. Ọ dika ọ ya nwa na-agwa ha okwu. Ọ gwahala ha, lee ihe unu ga-agba, ha ewerezie nke a gbawa. O gwahala ha, nke a onye eka elu ewere ya nụ, onye eke ala nke anọ ewere we ya.

Igbo: Nke ano wụ eka-ali. Nke ise bu megereme. Nke isii bu ekwe. Osisi ka eji eme ya. Nke asaa bu udu. Ewepụgazie udu, dika iron, nde ozo zi nà ahia. Tupu ugbu a, ọ wụ nnọọ ihe dịka oshishi ka eji eme ya mana ka a na agbanwozi ihe dịgasị wa nnọọ, ihe dị iche kwa. O nwekwa ndị na-emegashi ya n’ Afikpo. Ha mebikwa, enwekwa ndị a ga ebugia, ha mezikwara ha. O nwekwa ndị na-eme ya n’ Abakiliki, o nwekwa nde na-eme ya na Enugwu.

[2]


Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]




Vidio[dezie | dezie ebe o si]







Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:NKWA_UMUAGHOGHO_DANCE.ogg
  2. A.I.D project (2023-2-4). Audiovisual Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.