Nkwa-nwaite

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Egwu Nkwa-nwite
type of dance
obere ụdị nkeite egwu Dezie
nchekwa ngwa égwuUdu, Ekwe, Opi Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo, Ȯra Ebonyi Dezie
Nkwa-nwaite

Nkwa-nwaite[1] bụ egwu ndị Afikpo North Local Government Area n’Ebonyi Steeti. Egwu a bidoro n’afọ 1953 na aka ndị nwanyi kpokọtọrọ onwe ha ọnụ, hụrụ onwe ha n’anya. ọ bụrụ na e nwee nwanne ha na-eme omume, ha ga-aga sọro kwanyere onye ahụ ùgwù, nọnyere ya, kụọrọ ya egwu, nyere ya aka kpọnaa nwa ya na be di ya. Ihe a ka ha na-emeritere onwe ha. Enwekwa ka esiri nwe nnukwu mmadụ na-abịa n’ Afikpo, o bu ndị na agba egwu a ka a na-akpota ka ha mee ha nabata ma mee ha obi ụtọ.

Na mgbido, ọ bu Nkwà-nwaite ka eji akpona nwa nwanyị na be dị ya. ụmụnwanyị na agbakọlata bịa gbaa egwu. Ha gbachaa égwu ahụ mee ihe omume nọ n’ ime ya, akpọnaa nwagbogho ahu na be di ya. Na nke a, ana akwado nwa agbọghọ na-ala be dị ya. Akwado che ya, akpọpụtia. So oge i ga ahu ihu ya bu mgbe ọ nọ n'ime ụlọ nne ya. O si n’ ụlọ nne ya pụta, onweghi onye na-ahụzi ya anya ọzọ. Ụmụnwanyi agbakpuo ya. Ndị ọyị na nwanyị agbakpuo ya, e duru ya na ime nchuanwụ.  Ihe ọ na-eyi wụ Jigida were akwa kee n’ ara dịka onye na-aga wa ịgba nkwa-ụmụagbọghọ. O banye n'ime ebe ahụ, o nweghị onye ga-afu ya anya na agbanye na o na-aga n’okporo uzo tupu ruo ebe ahụ dị ya bi. O bu ukwu ka a na eji duru ya site na ulo nne ya ruo na ulo di ya. Erue n’ ebe ahụ, ụmụnwanyị agbasaa, e wee fụ ya anya. I fụzie ya, dị ya ọbịazie, bia ya ọma, kpọrọ ya baa. Abia nye umunwanyi dutere ya nri. Ha richa oriri ebe ahụ, onye ọ bụla alaa.

Ụmụnwoke anaghị eso eme nke n’ihi na ha nwere nke há. Ha na anọ nke ha na-aṅụ mmanya mana erikwa oriri.

E nwere ihe ndi eji aku Nkwa-nwaite. E nwere nke a na-akpọ ite. A na eji aka na-akụ ya. E nwere ekpele ma o bu achara. A na-atụkwasịa ekpele a n’ okwute puru iche wee na aku ya.[2] [3]

Mkpọpụta[dezie | dezie ebe o si]




Vidio[dezie | dezie ebe o si]







Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:Nkwa_Nwaite_dance.ogg
  2. A. I. D. Project (2023-02-04). English: Nkwa Nwaite is an igbo traditional women dance indigenous to the Afikpo people of Afikpo North LGA, Ebonyi State. This dance was formed by a group of women in 1953. This audiovisual was recorded in Afikpo North LGA, Ebonyi State on 27 September 2022. The video features a dance performance from the Nkwa-nwaite dance group and a story from Ibe Patricia Nnennaya in Afikpo Ebonyi State. The video was directed and produced for the Audiovisuals of Igbo Dances Project (AID) by Tunde Oladimeji, a notable documentary film maker in Nigeria.. Retrieved on 2023-03-12.
  3. A.I.D project (2023-2-4). Audiovisual Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.