Nnamdi Asomugha

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nnamdi Asomugha
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
obodo maka egwuregwuNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereNnamdi Dezie
aha ezinụlọ yaAsomugha Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya6 Julaị 1981 Dezie
Ebe ọmụmụLafayette Dezie
Dị/nwunyeKerry Washington Dezie
Asụsụ obodoBekee Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụAmerican football player, omee, onye nhazi ederede, onye na-emeputa ihe nkiiri Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụichecornerback Dezie
ebe agụmakwụkwọNarbonne High School, University of California, Berkeley, Bishop Montgomery High School, Leuzinger High School Dezie
Ebe obibiLos Angeles Dezie
onye nsonye òtù egwuregwuLas Vegas Raiders, Philadelphia Eagles, San Francisco 49ers, California Golden Bears football Dezie
ụdị egwuregwuAmerican football Dezie
Onye òtù nkeKappa Alpha Psi Dezie

Nnamdi Asomugha ( /n ɑː m d i Ɑː s əm w ɑː / NAHM -dee AH -səm-wah ; ụbọchị ọmụmụ ya bụ July 6, 1981) bụ onye na'eme ihe nkiri ka ọrụ ya. Ọ bukwa onye Nigeria na America. Ọ bụbu onye egwuregwu ụdị nke bọọlụ America . Ọ gbara bọọlụ kọleji maka Mahadum California, Berkeley, ebe anọ họrọ ya na agba nke mbụ n'afọ 2003 na NFL Draft 2003 site n'aka Oakland Raiders . Ọ gbakwara ndi Philadelphia Eagles na San Francisco 49ers bọọlụ. Ka'mgbe ọtụtụ afọ, a na-ewere ya dị ka otu n'ime ndi kachasị mma na ịgba ụdị bọọlụ ahụ na NFL . [1] [2] [3] [4] [5] [6] N'ime afọ iri na otu dị ka onye na-agba bọọlụ, a hoputara ya All-Pro ugboro anọ, gụnyere ugboro abụọ ka ndị otu mbụ na bọọlụ. A họrọ Asomugha dị ka onye otu Fox Sports NFL All-Decade Team 2000-2009 [7] na USA Today ' NFL All-Decade Team 2000s, [8] ma a na-ahụta ya dị ka otu n'ime ndị kasị ukwuu na Oakland Raiders oge niile. [9] [10] [11]

Nnamdi Asomugha

Asomugha nwetara otuto n'kwuputa dị oke egwu maka ihe nkiri ebe ogosipụtara onwe ya di ka Carl King na Crown Heights (2017). [12] [13] [14] Ahoputara ya di'ka inwe onyinye nke Independent Spirit Award for Best Supporting Male ya na NAACP Image Award maka Outstanding Supporting ya bu nkwado onye nwoke kacha buru opuruiche na'ime ihe nkiri na fim. [15] [16] Variety kpọrọ ya aha n’ime ndị asaa na-eme ihe nkiri n’afọ 2017. [17]

Mbido ndụ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Nnamdi Asomugha na Lafayette, Louisiana, ka onye Nigeria nne na nna ya bu ndi Igbo. [18] A zụrụ ya na Los Angeles, California. Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị Leuzinger na Lawndale, California na Bishop Montgomery High School na Torrance, California tupu ọ gaa na Nasbonne High School na Harbor City, California. Ọ na-egwu bọọlụ nke eji ukwu agba nya na nke a'na atunye na nkata.

Akwụkwọ kọleji[dezie | dezie ebe o si]

Nnamdi Asomugha na Oakland Raiders

Asomugha gara Mahadum California, Berkeley ebe obu otu onye ndị otu bọọlụ California Golden Bears . [19] N'ime oge o’nagba bọọlụ, ọ’kpara bọọlụ n‘ụzọ otu narị na iri asatọ na asaa, kwụsị ọdida ndi otu ya na ụzọ iri na itoolu, na ihe ndi ozo o mere iji mee ka ndi otu ha nwee mmeri. . Asomugha gụsịrị akwụkwọ na mbụ maka sayensị na nchịkwa azụmahịa . [20]

Ọrụ ọkachamara[dezie | dezie ebe o si]

Raiders Oakland[dezie | dezie ebe o si]

Asomugha bụ onye egwu bọọlụ Cal nke abụọ a kpọọ na agba nke mbụ (31st overall) nke NFL 2003 nke ndị Oakland Raiders. A kwagara ya gaa n'akụkụ azụ na igba bọọlụ mana ọ gwuri bọọlụ ntakiri na oge abụọ na mbido ọrụ ya. Ọ ghọrọ onye mbido na afọ 2005 wee kpaa bọọlụ n‘ụzọ iri isii makwa mee nka naanị ya ụgboro iri ise na ise na ihe ndi ọzọ pụrụiche. [21]

N’afọ 2006, ọ nwetara mgbochi abụọ megide Cleveland Browns na ọrụ bọọlụ ọ'na agba. Ọ nwetakwara ihe mgbochi nke atọ ya ka izu anọ gachara megide ndị Pittsburgh Steelers ma weghachite ya yaadi iri abụọ na anọ maka ihe mgbaru ọsọ nke mbụ nke ọrụ ya. Agbanyeghị na otu ahụ tara ahụhụ n'oge 2-14, Ọrụ Asomugha n’afọ 2006 bụ nke kachasị mma n’ihi na ọ nwere mgbochi iri ise (nke na-niya me’re iri anọ na asatọ) na nnukwu ihe ndị ọzọ iji gosipụta na ọ dị mma na ịgba bọl. Ngụkọta nke ihe niile ọ na - eme tinye ya na nke abụọ na ndi kachasị elu na National Football League yana mmadụ anọ ndị ọzọ (gụnyere onye bụbu Oakland Raiders cornerback Charles Woodson ). Mgbe oge ahụ gasịrị, a akpọọ Asomugha ka ọ gaa Pro Bowl dị ka onye dị ka onye nnọchi anya onye ọzọ mana n'ihi oku ahu abịaghị n'oge, ọ nweghị ike ịga nnukwu egwuregwu ahu ana-eme kwa afọ. [22] Ọ nwetakwara onyinye ndi Oakland Raiders akpọrọ "nkwa na arụmọrụ kacha mma". Akpọ kwa ra ya otu onye egwuregwu bọọlụ kachasị di'mkpa . Na ọzọ, a họpụtara Asomugha ka onye otu Dr. Z Sports Illustrated 2006 All-Pro team [23] yana The Associated Press 2006 All-Pro Team .

A họtara Asomugha ka ọ bụrụ onye isi ndị otu Raiders na egwuregwu bọọlu n'afọ 2007. O gosiputara na ya bu dike siri ike ma mara egwuregwu ahu nke oma. Otu NFL scout gwara Pro Football Kwa Izu na a Asomugha na “ihe na-agbachitere onye ọ bụla na afọ iri gara aga” na 2007. Ọ gwụchara oge 2007 site na njiri 34 (32 solo), mgbochi 1 na nkwụsịtụ asaa ma aha ya bụ onye ọzọ 2008 Pro Bowl .

Asomugha bụbu onye nweere onwe ya, mana ndị Raiders debere akara aha pụrụ iche na Asomugha na Febụwarị 20, 2008. [24]

A họpụtara Asomugha di ka onye isi otu ọzọ tupu mmalite oge bọl 2008. Ọ gbara bọọlụ nke ọma na naanị Randy Moss na Tony Gonzalez na amara ya aka n'afọ ahụ. Onye isi nchịkwa New England Patriots Bill Belichick kwuru na Asomugha “bu dike zuru oke n'akụkụ ọ na agba bọọlụ ọ hụla n'afọ niile”. [25] Ọ gbara nnukwu bọọlụ n'afọ 2008. Ọ nwere onyinye "nkwa na ọmarịcha" nke ndi Oakland Raiders nke ugboro abụọ, akpọrọ ya onye otu egwuregwu 2008 Co- Kachasị bara uru yana Justin Fargas . A họtara Asomugha dị ka onye mbido maka 2009 Pro Bowl . A ahọrọ kwa ya na otu Sporting News 2008 All-Pro Team [26] yana ndị otu egwuregwu bọọlụ nke Pro Football Writer Association All-NFL maka afọ 2008. A họrọkwara Asomugha na Peter King 's Sports Illustrated 2008 All-Pro team [27] yana Associated Press 2008 All-Pro Team .

Na Febrụwarị 19, 2009, ndị Raiders na Asomugha bịanyere aka na nkwekọrịta afọ atọ dị mgbagwoju anya nke mere ka ọ bụrụ onye na-akwụ ụgwọ ego kachasị ụgwọ na NFL niile. Afọ abụọ mbụ, ihe ruru ndeiri puku abụọ na asatọ, na narị ise puku dollar, bụ ego nke na anaghi etenye onna ụgwọ ya. N'arọ nke-atọ nke nkwekọrịta, ma ọ bụrụ na Oakland chọrọ ịka jiide nsomugha, ọ ghaghị ịkwụ ụgwọ ya na nkezi n'elu dika ụgwọ ana akwu ndi bọl di ka ya ma ọ bụ nde iri na isii, narị asatọ na iri asaa dollar nke ọ bụla kasi. Ọ bụrụ na ndị Raiders achoghị ime nke'a, Asomugha ga aghọrọ onye nweere onwe ya. [28]

N’ọnwa Ọgọstụ 2009, Oakland Tribune kpọrọ Asomugha n'otu n’ime ndị kachasị na Oakland Raiders oge niile. [29]

Mgbe ọgba sịrị bọọlụ megide ndị Houston Texans, onye isi nchịkwa Gary Kubiak ha kwuru na "Asomugha bụ onye kachasị mma na akụkụ ọ n'gba ahụla m na ịgba bọọlụ asọmpi a. Ọ buru nnukwu ibu, ọ na-agba ọsọ. Ọ bụ onye ọkpụkpọ pụrụ iche." Onye na-ahụ maka ịgbachitere Cleveland Browns Rob Ryan kwuru na "Nwoke ahụ enweghị atụ. O mere onwe ya onye nke kachasị na akụkụọ n'gba bọọlụ site na usoro ọrụ ya, na ụzọ o si elee ma mụta ihe na teepu bọọlụ ndị ọzọ gbara. " [30] Ekwuru ihe ndị a n'ihi nnukwu ihe Asomugha mere mgbe ọ na-egwu bọl.

Mgbe oge egwu bọọlụ 2009 ga chasi, a họpụtara Asomugha dị ka onye n'malite bọọlụ maka 2010 Pro Bowl . A họrọ Asomugha na Sporting News 2009 All-Pro Team (otu abụọ) yana Associated Press 2009 All-Pro Team (otu abụọ). Nke a gosi akara nke atọ ya na ndị otu Pro Bowl na All-Pro n’ọrụ afọ asaa ya na Oakland Raiders .

Na 2010, a họpụtara Asomugha ka ọ bụrụ onye otu Fox Fox 's [31] na USA Today ' NFL All-Decade Team. [8]

Asomugha gara n'ihu na-emeri egwuregwu n'aha ndi klọb ya n'ihi ụzọ dị mma isi na-egwu bọl. N'afọ 2010, ọ gbara bọl di'egwu. Ọ'daghị mbà na afọ ahụ cha cha. [32] "O nwere ike igba oke ọsọ pụrụ iche," onye nkuzi Seahawks Pete Carroll kwuru. "Ọ bụ ihe ị na-achọ ugbu a n'akụkụ akụrụngwa bọl ma dị mma dịka ị nwere ike ka nwoke." [33] Mgbe ọ na-agba ndị Kadịnal Arizona, onye dị ka onye na-elekọta ihe mgbaru ọsọ bu Pro Larry Fitzgerald kwuru, "Ihe ị hụrụ na teepu maka nwoke nke'a bu eziokwu, o nwere ukwu na-enweghị atụ na ụkwụ dị egwu na ọsọ, nke ahụ bụ oninye Chineke nyere ya ma ịdị ogologo ma nwee ike gbaa bọọlụ etu okwesiri.” [34] Mgbe oge egwuregwu bọọlụ 2010, a họọrọ Asomugha dị ka onye nmalite maka ihe ngosi nke 2011 Pro Bowl . A họrọ Asomugha na ESPN John Clayton '2010 All-Pro Team [35] ya'na Peter King ' Sports Illustrated 2010 All-Pro team. [36] Ahọrọ kwa ra Asomugha na ndi ama'áma Associated Press 2010 All-Pro Team, nke'a nke anọ nhọrọ dị ka ihe All-Pro .

Philadelphia Eagles[dezie | dezie ebe o si]

Mgbe oge bọọlụ 2011 malitere, ewere Asomugha dị ka onye nweere onwe ya na ahịa. N’ọnwa Julaị n’afọ 2011, Asomugha na Philadelphia Eagles nwere nkwekọrịta afọ ise, nde iri isii, na nde iri abụọ na ise. [37] [38]

N’afọ 2011, ọ'kpara ike di'egwu na oru ya na akpọ ya aha di ka bụ onye nno chita anya ọzọ nke 2012 Pro Bowl . [39]

N'oge ọ nọ na Filadelfia, ndị otu ahụ gbalịsiri ike ime ihe di'iche. Asomugha mechara hapụ otu ahụ na njedebe nke oge bọl 2012 2012 mgbe ya na ndị otu ahụ enweghị ike ikwenye na nkwekọrịta ọzọ. [40]

San Francisco 49ers[dezie | dezie ebe o si]

Na Eprel 2, 2013, Asomugha na San Francisco 49ers, bịanyere aka na nkwekọrịta otu afọ nke ọ ga-enweta ụgwọ ọrụ nke nde $1.35 dollars ya na ohere iji nweta ihe ruru nde $1.65 dollars na nkwado.[41] Na November 4, 2013, otu ahụ gbaghaara Asomugha, wee hapụ ya na nkwekọrịta ahụ.[42]

Retirement[dezie | dezie ebe o si]

Na Disemba 26, 2013, Asomugha na ndi Oakland bịanyere aka na nkwekọrịta otu ụbọchị ka o wee nwee ike ịla ezumike nká dịka onye Raider.[43]

Na afọ 2016, Pro Football Focus kpọrọ Asomugha di ka onye ọkpụkpọ Oakland Raiders nke afọ iri gara aga. [44]

Ọrụ ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Asomugha malitere ọrụ ihe nkiri ọkachamara na afọ 2008 na CW Network sitcom <i id="mwAQQ">Egwuregwu ahụ (The Game)</i> . N'afọ 2009, ọ me're ihe nkiri ebe ọ buụrụ Ken Shaw na mmalite nke Friday Night Lights Season 4. [45] Na afọ 2010, ọ pụtara na ihe nkiri na TNT nke a'na akpọ Leverage dị ka Walle na Oge nke atọ na ihe omume akpọ kwa ra "The Scheherazade Job". [46]

N’afọ 2012, o mere ihe nkiri ngosipụta onyonyo akpọrọ Fire with Fire nke Bruce Willis, Rosario Dawson na Josh Duhamel bụ ndi akachasi hụ anya níme ya. O sonyekwara na ide, imepụta ma gosi obere ihe nkiri dị egwu akpọrọ Double Negative ya na onye ihe nkiri ọzọ, onye Australia Adam J. Yeend. Ihe ngosi ahụ bụ maka ihe me're na etiti abani abuọ na ndu onye Muslim, bụ onye America bụkwazi onye edemede na agba mbọ. [47]

Asomugha pụtakwa na ihe nkiri na atọ ọchi nke Will Ferrell akpr Funny or Die, na Roadside Attractions, Hello, My name is Doris na dị ka ya onwe ya na usoro ana eme na onyonyo Comedy Central akpọrọ Kroll Show, nke onye na egosi karisia bụ Nick Kroll . [48] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye na-eme ihe nkiri na Netflix na nke akpọrọ Beasts of No Nation .

N’afọ 2017, ọ rụpụtara ihe nkiri na Amazon Studios akpọrọ . Ọ bukwa onye akachasi hụ anya na ihe nkiri ahụ. [49] Crown Heights banyere kwa na asọmpi na Sundance Film Festival na Jenụwarị 23, 2017 na ngalaba US Dramatic category. Ihe nkiri ahụ natara nyocha ọma na Sundance Film Festival,[13][50] maa nwe nmeri dị ka ihe nkiri igwe ndi nmadu hụrụ na anya na ngalaba ahu ya nke bu Audience Award maka U.S. Dramatic Film.[51][52]

A hụta Asomugha dị ka otu n'ime ndị na-eme ihe nkiri nke Sundance Film Festiva 2017 . [53] [17] [14][54]

Ọrụ enyemaka[dezie | dezie ebe o si]

Asomugha bu onye isi oche ndi Asomugha Foundation . Asomugha Foundation na-arụ ọrụ mmemme abụọ: maka nwa mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ nọ na mkpa ( OWIN ) na Asomugha College enye'm aka maka ndị Ọkà Mmụta ( ACTS ).

Site na OWIN, Asomugha na ezinụlọ ya na-enye nri, ebe obibi, ọgwụ, ọzụzụ ọrụ, agụmakwụkwọ, yana mmụta nye ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei a na emekpa ahụ na Nigeria . Ugbu a, OWIN nwere ogige abụọ na Nigeria ma na-ezube ịgbasa na mba ndị ọzọ na Africa .

Na afọ 2006, Asomugha bidoro mmemme ỌRỤ. Kwa afọ, ọ na ahọrọ ụmụ akwụkwọ sitere ụlọ akwụkwọ di che iche na Bay Area na mpaghara Los Angeles soro ha ga njem kọleji na gburugburu mba ahụ. Otu n'ime nzukọ ndị o sonyere na inyere ya aka mee nka bụ East Oakland Youth Development Center, otu nzukọ 501 (c) (3) na Oakland, California . [55] N'ime afọ abụọ mbụ, Asomugha kpọọrọ ụmụ akwụkwọ gaa na Morehouse College, Spelman College, Georgia Institute of Technology, Mahadum Clark Atlanta, Mahadum Harvard, Massachusetts Institute of Technology, Mahadum Boston, Mahadum Brown na Mahadum Berklee . Maka nlegharị anya afọ 2009, Asomugha kpọọrọ ụmụ akwụkwọ gaa ụlọ akwụkwọ dị na New York City gụnyere NYU, Mahadum Columbia, Juilliard, Fashion Institute of Technology, Mahadum Fordham na Schoollọ Akwụkwọ Ọhụrụ . [56] Na afọ 2010, ACTS gbasaa rukwa na mpaghara ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Los Angeles. Maka nlegharị anya nke afọ 2010, ha gara ụlọ akwụkwọ dị na Washington DC gụnyere Mahadum Georgetown, Mahadum George Washington, Mahadum America, Mahadum Howard na Mahadum Maryland . Na afọ 2011, ACTS gawara New Orleans, LA. Ebe ndị a gara nleta bụ Mahadum Loyola, Mahadum Xavier nke Louisiana, Mahadum Southern, Mahadum Tulane na Mahadum Louisiana State . Ndị niile sonyere ndị njem ahụ gụsịrị akwụkwọ sekọndrị ma gakwa ụlọ agụmakwụkwọ ka elu.

Nnamdi Asomugha na Bill Clinton

Asomugha sonyere onye isi ala gara aga Bill Clinton, Matthew McConaughey, na Marie Tillman na Nzukọ Mgbakọ nke Mahadum Texas Global Initiative (CGI U) nke Mahadum Texas na Austin kwadoro iji kparịta maka mkpa ọrụ gburugburu ụwa di ya na ụmụ akwụkwọ inwe nkwu puta okwu. CGI U bụ ihe President Clinton malitere na ntorobịa ya iji kwado ụmụ akwụkwọ kọleji ka ha tinye aka ma mee ihe banyere ụfọdụ nsogbu di na ụwa niile siri ike na mpaghara dịka agụmakwụkwọ, ịda ogbenye na ahụike ụwa. Na CGI U, Asomugha gwara ndị isi ụmụ akwụkwọ karịrị otu puku na narị abụọ, ndị isi ụlọ akwụkwọ mahadum na ndị isi otu ndị ntorobịa gbasara mbọ ya na Nigeria na Oakland, CA. [57] Kwa afọ site na afọ 2009, ana akpọ Asomugha òkù di ka onye ọbịa na onye na sonye Clinton Global . [58] [59]

Ọzọkwa, Asomugha na-ekesara ndị na-abata ụlo akwụkwọ nri na afọ ọ bụla na Akwụkwọ sekọndrị na Narbonne na Los Angeles. Ọ na-enyekwa ndị egwuregwu bọọlụ na basketball akpụkpọ ụkwụ, nkwekọrịta o dere n'ime nkwado ya na Nike banyere inye aka.

Nsọpụrụ[dezie | dezie ebe o si]

Maka mbọ'na agbasi ike mgbe niile n’ọrụ obodo, akpọrọ Asomugha aha di ka onye Home Depot Neighborhood MVP 2007

N’afọ 2008, enyere Asomugha onyinye nke Onyeisi alamaka ndi naénye aka na'efu na obodo. E'guzosi onyinye ike maka iji mata ndi America n’enye aka puruiche na iru oru obodo. [60]

Ndị otu ibe ya na NFL Players Association nabatala Asomugha ma họpụta ya na afọ 2005, 2006, 2007, 2008 na 2009 maka Onyinye Byron ‘Whizzer’ White maka nnukwu ọrụ ona arụ na n'ime obodo. N’afọ 2010, e nyere Asomugha na onyinye di'ka onye iri anọ na anọ nke Byron “Whizzer” White NFL Man of the Year, nke be ugwu kasị elu ana enye ndi NFL Players Association’s (NFLPA) [61]

Akpọrọ Asomugha aha maka e'gụnye ya na onyinye nnukwu ugwu nke Sports Illustrated oka egwuregwwu nke Afọ 2008. [62]

N'afọ 2009, akpọrọ Asomugha ma gụnye ya na "Dream Team for Public Service" nke Jefferson Awards maka Ọrụ Ọha . [63]

N'afọ 2010, emere Asomugha onye nnọchi anya United Way nke Bay Area UWBA, raara onwe ya nye ịmepụta mgbanwe na-adịgide adịgide ma hụ na ndị bi na mpaghara Bay niile nwere ohere iji nweta ihe eji ebi ezigbo ndu di ka: agụmakwụkwọ, ezigbo ọrụ na-enye ezi ego na ahụike.

N'afọ 2011, a kpọrọ Asomugha aha di ka otu n'ime ndị ruru eru atọ maka Walter Payton Man of the Year Award [64]

N'afọ 2012, Asomugha natara nturu ugo a kpọrọ 'Role Model of the Afọ' site n'aka Ndị Isi Okwu Mgbakọ Mba Nile na anọkọ maka ihe banyere amaala [65]

N’ọnwa Juun afọ iri abụọ na anọ n’afọ 2013, Asomugha lụrụ onye na-eme ihe nkiri Kerry Washington . [66] [67] [68] Di na nwunye ahụ nwere nwa nwanyị, Isabelle, amụrụ na 2014 [69] na nwa nwoke, Keleb, amụrụ na 2016.

Asomugha nwere ụdị ikpu ìsì akpọrọ deuteranomaly ma kwupụta nkaa na Juun afọ 2009 na mbipụta ESPN Magazine Ọ sịrị "Achọpụtara ya mgbe m dị ihe dị ka afọ asaa. Ọ metụtaghị egwuregwu bọl nna-egwuri n'ezie - enwere m ike ịmata ọdịiche dị n'etiti agba na agba ma'nke gbara ọchịchịrị. Naanị nsogbu nwere bu ịmara ihe dị iche n'etiti agba yiri onwe ha ọkachasị n'etiti agba ndị na-enwu gbaa. Ha niile na adim ka otu ihe. Enweghị nsogbu dị ka m na-egwu bọl n'ámá egwuregwu . " [70]

Asomugha bụ onye otu Kappa Alpha Psi .

Akwụkwọ ọzọ ịga agụkwu[dezie | dezie ebe o si]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Benoit, Andy. "Best Cornerbacks in the NFL: The Top 10 List", The New York Times. Retrieved on November 28, 2010.
  2. "Nnamdi Asomugha misses practice". Retrieved on November 28, 2010.
  3. "Opponents fear Asomugha's rare talent". Retrieved on November 28, 2010.
  4. "Cornerback rankings: Asomugha is the best and still getting better", Sporting News. Retrieved on November 28, 2010.
  5. Corbett. "Nnamdi Asomugha: Tough name, but a shut-down game", USA Today. Retrieved on July 26, 2011.
  6. Matt Miller. B/R NFL 1,000: Top 100 Cornerbacks. Bleacher Report. Retrieved on November 3, 2015.
  7. Marvez. "NFL All-Decade team: 2000-2009", FoxSports.com. Retrieved on June 28, 2011.
  8. 8.0 8.1 "USA Today's NFL All-Decade Team", USA Today. Retrieved on September 11, 2010.
  9. "Countdown to excellence: Nos. 26-50 of Raiders' all-time greats", East Bay Times. Retrieved on November 3, 2015.
  10. Top 50 Oakland Raiders of All Time. Retrieved on August 16, 2019.
  11. Oakland Raiders 50 Greatest Players Franchise History. Retrieved on August 16, 2019.
  12. Patrick Ryan. "Sundance Winners: 'Crown Heights reigns victorious'", January 29, 2017. Retrieved on January 31, 2017.
  13. 13.0 13.1 Andrew Barker. "Sundance Film Review: 'Crown Heights'", January 23, 2017. Retrieved on January 31, 2017.
  14. 14.0 14.1 Steve Greene (January 12, 2017). 13 Talents Poised to Break Out At This Year's Festival. Indiewire. Retrieved on January 31, 2017.
  15. Anthony D'Alessandro (November 21, 2017). Spirit Award Nominations. Retrieved on November 21, 2017.
  16. NAACP Image Awards Nominees. Retrieved on November 20, 2017.
  17. 17.0 17.1 "7 Breakout Performers from Summer Movies in 2017". Retrieved on August 27, 2017.
  18. Player Profile: CB Nnamdi Asomugha. Raiders. Archived from the original on February 13, 2015. Retrieved on February 13, 2015.
  19. Nnamdi Asomugha. Sports Reference. Retrieved on November 23, 2017.
  20. https://calbears.com/news/2013/4/17/208198236.aspx?path=football
  21. Nnamdi Asomugha. Pro Football Reference. Retrieved on November 23, 2017.
  22. Pro Bowl is just flight of fantasy for Asomugha. ESPN. Retrieved on November 3, 2015.
  23. Zimmerman Chooses Asomugha. Archived from the original on October 26, 2012. Retrieved on July 11, 2016.
  24. Schefter, Adam (February 20, 2008). Raiders slap exclusive franchise tag on CB Asomugha. National Football League. Retrieved on June 28, 2011.
  25. Home - providencejournal.com - Providence, RI. Retrieved on November 3, 2015.
  26. Clifton Brown. "SN's NFL All-Pro Team", January 15, 2009. Retrieved on November 3, 2015.
  27. King, Peter. "SI.com's 2008 All-Pro Team: Youth movement dominates annual list", January 6, 2009.
  28. Shefter, Adam (February 19, 2009). Asomugha lands complex three-year deal with Raiders. National Football League. Retrieved on September 11, 2010.
  29. Monte Poole. "Countdown to excellence: Nos. 26-50 of Raiders' all-time greats", East Bay Times, August 8, 2009. Retrieved on November 3, 2015.
  30. Marcio Jose Sanchez (December 26, 2009). In the spotlight: Oakland Raiders cornerback Nnamdi Asomugha. Retrieved on September 11, 2010.
  31. Marvez, Alex (January 1, 2010). NFL All-Decade team: 2000-2009. FoxSports.com. Retrieved on June 28, 2011.
  32. Steve Corkran (December 26, 2010). Oakland Raiders notebook: Indianapolis Colts star receiver Reggie Wayne has little success due to healthy dose of cornerback Nnamdi Asomugha. Archived from the original on September 30, 2013. Retrieved on January 9, 2011.
  33. Farnsworth (October 27, 2010). One big matchup. Archived from the original on October 31, 2010. Retrieved on June 28, 2011.
  34. McDonald (September 25, 2010). Asomugha faces his mirror image. Ibabuzz.com. Archived from the original on September 30, 2011. Retrieved on June 28, 2011.
  35. Clayton (January 4, 2011). John Clayton's 2010 All-Pro team. Retrieved on June 28, 2011.
  36. King. "MMQB Mailbag: Revealing 2010 NFL awards ballot and all-pro team", Sports Illustrated, January 18, 2011. Retrieved on June 28, 2011.
  37. Nnamdi Asomugha agrees to five-year, $60 million deal with Philadelphia Eagles. ESPN. Retrieved on November 3, 2015.
  38. "Philadelphia Eagles swoop in and land Nnamdi Asomugha". Retrieved on July 29, 2011.
  39. On The Pro Bowl, Notes And More. Philadelphia Eagles. Archived from the original on September 24, 2015. Retrieved on November 3, 2015.
  40. End of Eagles' disappointing Asomugha era (March 12, 2013).
  41. Wesseling, Chris (April 2, 2013). Nnamdi Asomugha. Retrieved on April 2, 2013.
  42. 49ers Waive CB Nnamdi Asomugha. Archived from the original on November 4, 2013. Retrieved on November 4, 2013.
  43. Nnamdi Asomugha to retire after 11 seasons. Retrieved on July 11, 2016.
  44. Best Player From Every NFL Team Over Past Decade. Retrieved on August 25, 2016.
  45. Chris Littmann (October 6, 2009). Nnamdi Asomugha Appearing on Friday Night Lights. SportingNews.com. Archived from the original on October 5, 2009. Retrieved on November 7, 2009.
  46. Nnamdi Asomugha. Retrieved on November 3, 2015.
  47. Double Negative (2013). IMDb. Retrieved on November 3, 2015.
  48. Nnamdi Asomugha. IMDb. Retrieved on November 3, 2015.
  49. Keith Stanfield Will Play Unjustly Convicted Prisoner Colin Warner In Biopic. Retrieved on August 6, 2015.
  50. Sundance Film Review: 'Crown Heights'. Retrieved on February 4, 2017.
  51. Crown Heights Nets Sundance U.S. Dramatic Audience Award. Retrieved on January 31, 2017.
  52. Sundance Winners: 'Crown Heights reigns victorious'. Retrieved on January 31, 2017.
  53. 17 Breakout Actors, Writers and Directors from Sundance 2017. Retrieved on January 27, 2017.
  54. 8 Actors You'll See Everywhere Now, Probably. Retrieved on January 29, 2017.
  55. "Asomugha gives back to Oakland youth", May 1, 2008. Retrieved on January 26, 2018.
  56. Judge, Clark (April 22, 2009). Shutdown corner Asomugha opens new routes for Oakland kids. CBS Sports. Retrieved on June 28, 2011.
  57. We're sorry. There is no page with this URL.. Archived from the original on August 28, 2016. Retrieved on July 11, 2016.
  58. CGI University. Clinton Foundation. Archived from the original on February 6, 2015. Retrieved on November 3, 2015.
  59. CGI University. Clinton Foundation. Archived from the original on April 24, 2012. Retrieved on November 3, 2015.
  60. Raiders notes: Chiefs QB Thigpen's mobility is a threat - NFL. CBS Sports. Retrieved on September 11, 2010.
  61. Nnamdi Asomugha Honored With Byron Whizzer White Award. NFLPlayers.com. Archived from the original on September 8, 2010. Retrieved on September 11, 2010.
  62. Trotter, Jim. "My Sportsman: Nnamdi Asomugha", Sports Illustrated, November 7, 2008. Retrieved on June 28, 2011.
  63. Archive copy. Archived from the original on 2009-11-26. Retrieved on 2020-08-16.
  64. Idonije, Asomugha, Williams nominated for Man of the Year. National Football League. Retrieved on November 3, 2015.
  65. NCoC: Sorry. National Conference on Citizenship. Archived from the original on November 8, 2013. Retrieved on November 3, 2015.
  66. Kerry Washington Marries Football Player Nnamdi Asomugha. E! Online. E! (July 3, 2013). Retrieved on July 5, 2013.
  67. "Kerry Washington weds pro athlete Nnamdi Asomugha", CBS News, July 3, 2013.
  68. Nnamdi Asomugha secretly weds 'Scandal' star Kerry Washington. UPI. Retrieved on July 8, 2013.
  69. Kerry Washington Welcomes Baby Girl With Husband Nnamdi Asomugha. The Huffington Post (May 2, 2014).
  70. Asomugha, Nnamdi (June 25, 2009). Backup plan: Nnamdi Asomugha. ESPN. Retrieved on June 28, 2011.