Nneka Abulokwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nneka Abulokwe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụLondon Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye ọchụ̀nta ego, technologist Dezie
ụdị ọrụ yapublic speaking, mentorship, empowerment Dezie
onye were ọrụSopra Steria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke ọdụ ụgbọ mmiri-harcourt, University of London, Cranfield University Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts, nzere masters, doctorate Dezie
Ebe obibiObodoézè Nà Ofú Dezie
Ihe nriteOnye isi nke Order nke Alaeze Ukwu Britain Dezie

Nneka Abulokwe, OBE ( / ŋneka ˈabuːlɔːkwei / ) bụ onye Naijiria si Britain amaara maka ọrụ ya dịka onye ochụnta ego banyere ọrụ nchịkwa dijitalụ. Ọ bụ onye gụzọbere na onye isi ụlọ ọrụ nke MicroMax Consulting, yana otu n'ime ndị ọkachamara Afro-Caribbean nọ na UK sonyere na kọmitii nke nzukọ dijitalụ kachasị elu. [1] Na 2019, onye isi ya bụ Queen Elizabeth II kwanyeere ya ugwu dịka onye ọrụ nke Alaeze Ukwu Britain (Officer of the British Empire (OBE)) maka ọrụ ya banyere azụmahia.[2] .

Mmalite ndu na mmuta[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ ya na London. Nna nna ya si Naijiria na nne ya si Jamaica ma o tolitere n'obodo Port Harcourt, Nigeria. Na 1991, o nwetara nzere bachelọ na mmuta ihe mere eme site na Mahadum Port Harcourt. O mechara nweta nzere mastas na Mahadum London ya na asambodo maka mmuta ọrụ ndụzi na azụmahia na Cranfield University School of Management. [3]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Abulokwe bu onye okike ihe ọhụrụ teknuzu, onye ochụnta ego banyere ọrụ nchịkwa dijitalụ na onye isi oche. O nwere ihe karịrị afọ iri abụọ na ise na ahụmịhe na ọrụ oyibo. Ọ bụ onye guzọbere na onye isi, MicroMax Consulting. [3] Na 2013, o sonyere na kọmitii/ndị isi oche nke Sopra Steria dị ka onye isi oche ha. [1] N’afọ 2017, Nneka ghọrọ onye isi oche, Board Nomination Committee Information Systems Audit and Control Association (ISACA). Dika onye isi oche nke ndi otu ahụ, o webatara usoro nhoputa ndi oru site na oru ndi ochichi. Ọ kwalitere ndị-iche na itinye oganihu n'etiti njikwa nke nzukọ a. Na 2020 a họpụtara ya dịka onye isi, Mahadum Cambridge.

Onyinye[dezie | dezie ebe o si]

Na 2019, a kwanyere ya ugwu dị ka onye isi nke Order of the British Empire site n'aka onye isi mba Britain; Queen Elizabeth II maka ọrụ Azụmaahịa ya. [4] [5][6] Na 2018, a họọrọ ya onye nke anọ na Financial Times Top 100 Black Asian Minority Ethnic (BAME) Tech Leaders. Ọ sokwa na ndepụta ikpeazụ nke Governance Professional of the Year 2018 Award site n'aka Governance Institute. [3] Na 2019, e gosipụtara Abulokwe na Power-list 100 dịka otu n'ime ndị isi ahịa azụmaahịa di ojii kachasị emetụta ọha, tinyekwa ya n'etiti ndị isi ojii 100 kachasị nwee mmetụta na UK. [7] Edepụtara Abulokwe n'ime mmadụ 100 kachasị si Afrika na Caribbean nke dị na UK. [8]

Ebe m si dee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Women in Business: Nneka Abulokwe.
  2. Dr Nneka Abulokwe awarded OBE by HM Queen Elizabeth II. Retrieved on 2020-01-06.
  3. 3.0 3.1 3.2 Dr Nneka Abulokwe awarded OBE by HM Queen Elizabeth II. Retrieved on 2019-12-18.
  4. Nneka ABULOKWE. Retrieved on 2019-12-19.
  5. Queen Elizabeth honours Nigerian-born entrepreneur, Abulokwe. Retrieved on 2019-12-18.
  6. "Dr Nneka Abulokwe awarded OBE by HM Queen Elizabeth II". Editor's Quill. 
  7. Meghan Markle and Stormzy named among Britain's most influential black people. Retrieved on 2020-01-06.
  8. "Zuckerberg's tech challenge 'pale and male'". Retrieved on 2019-12-18.