Nuzo Onoh

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nuzo Onoh
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Septemba 1962 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ Dezie
ebe agụmakwụkwọThe Mount School (York) Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Nuzo Onoh (a mụrụ n'ụbọchị nke iri abụọ na abụọ ọnwa Septemafọ ba 1962 bu onye odee Britain- Naijirịa . Ọ tolitere ka nwa ne nke atọ n'ime ụmụ asatọ nke Oriakụ Caroline Onoh nwụrụ anwụ, onye bụbụ onye isi nkuzi.gabigaraara agha Biafra na Naijiria (1967–70) ka ọ bụ nwata gbara ọagha, dụ [1]na mgbe ọ dị afọ iri na atọ, onye ụkọchukwu nọ n'obodo mere ka ọ chụpụ ajọ mmụọ n'ime ya.ya". N'ihemndị a ọ gabigarahụ a, ọ na-akwado ugbu a maka ịmatakwu banyere mmetọ ụmụaka n'ime obodo Africa. [2]

Agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Nuzo Onoh gara ụlọakwụkwọ Queen's School, dị na steeti Enugu obodo Naijiria, nakwa The Mount School, York, ụlọ akwụkwọ Quaker dị na York ebe ụmụ akwụkwọ na-ebi ebi, o mesịrị gakwuo ụlọakwụkwọ St Andrew's Tutorial College, Cambridge, England. Onoh nwere nzere iwu na nzere masta na ide ihe site na mahadum Warwick . [1]

Edemede[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ onye ọsụ ụzọ nke ngalaba egwu egwu nke mba Afrịka. [3] Akwụkwọ Onoh dere a na-akpọ The Reluctant Dead (2014) [4] na Unhallowed Graves (2015) [5] bụ mkpokọta akụkọ gbasara mmụọ nke na-egosipụta isi omenala, ọdịnala, nkwenye na nkwenkwe ụgha ndị Igbo n'ime ọnọdụ egwu. Ọ bụkwa ya bụ odee The Sleepless (2016) ya na Dead Corpse (2017). [6] [7] [8] Ọrụ Onoh apụtala ihe n'ọtụtụ akwụkwọ akụkọ dị iche iche, ka ọ dị ugbu a, ọ bụ naanị onye na-ede akụkọ ifo na-atụ egwu sitere na mba Afrịka e gosipụtara na Starburst, bụ akwụkwọ akụkọ ntụrụndụ kachasị ogologo n'ụwa. [9] [10] Edepụtara aha ya na akwụkwọ ntụaka 80 Black Women in Horror (Sumiko Saulson, 2017), akụkọ ya abanyela n'ọtụtụ akụkọ ihe mere eme, nke gụnyere Black Magic Women Anthology, nke na-akọwa akụkọ sitere n'aka ụfọdụ ndị edemede depụtara na 80 Black Women in Horror . Akụkọ na-emeri asọmpi ya aha ya bụ "Guardians", bụ nke egosipụtara na Nosetouch Asterisk Anthology, Vol 2, (2018) bụ ihe arụrụ arụ na akụkọ mbụ nke Africa Cosmic Horror bipụtara. [11] Ọrụ ya apụtala ihe na ọmụmụ agụmakwụkwọ, gụnyere "Routledge Handbook of African Literature". [12] Ọ pụtara ihe n'ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi dị iche iche, ebe ọ na-ekwurịta ihe odide ya pụrụ iche na Horror Africa dị ka ụdị. O deela ọtụtụ blọọgụ maka akwụkwọ akụkọ "female first". [13] [14] Akpọrọ Onoh dị ka otu n'ime ndị ode akwụkwọ egwu egwu ọhụrụ na obodo Britain nke na-eweta mgbanwe dị mma n'otú e si egosipụta agbụrụ ojii na obere obere na akụkọ ifo egwu. [15]

Onoh enyewokwa okwu na nkuzi ebe dị iche iche, nke gụnyere na Miskatonic Institute of Horror Studies. [16]

Onoh na-ede gbasara ndị mmụọ, ndị mmụọ Afrịka na-abọ ọbọ ma nweekwa azụmaahịa ha na-emechabeghị, a na-eto ya dị ka "Eze nwanyị nke egwu egwu nke Afrịka". [17] Edemede ya bụ nke a kọwaara dị ka ọrụ nke "ezigbo anwansi na egwu", nke na-enyocha "ọnọdụ nkà ihe ọmụma nke na-akọwa eziokwu nke Afrịka na nke ndị ndị Afrịka na etiti ijikọ uwa ọnụ bụ nke ndị Ọdịda Anyanwụ Ụwa bụ isi sekpu ntị ya na ikpochapụ mgbọrọgwụ na omenala nke Afrịka kpamkpam." [17] Edemede na egosipụta ma ihe mara mma ma ihe na-atụ egwu dị n'Afrịka, ọkachasị, omenala Igbo, ọ naghị agbanarị n'ịgbaso okwu ihu abụọ nke okpukperechi, mmetọ ụmụaka, igbu mmadụ n'ememe, nkwenkwe ụgha dị ize ndụ, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị rụrụ arụ, ndị dibịa afa na ọnọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ na nsogbu. Omenala Afrịka sara mbara, ha niile nọ n'ọnọdụ egwu ụgha. [17] Akwụkwọ ya bụ The Sleepless, bụ akụkọ maka ndị mmụọ nke na-alụ ọgụ megide ma ịji ụmụaka achụ àjà ya na ihe na-atụ egwu nke Agha Biafra, bụ nke akọwara dị ka "ezigbo ụlọ ike nke ịkọ akụkọ egwu" [10] na dịka ọrụ nke "Gafere n'ezie eziokwu": [17] "Ihe na-egosi ọdịiche dị n'ụdị ya dị ka 'African Horror' bụ nyocha zuru ezu nke nkwenkwe ndị Africa banyere ihe omimi na nke mmụọ, nke na-ekpughe ọtụtụ ihe banyere "mba Afrịka n'ime onwe ya". [17]

Ezinụlọ[dezie | dezie ebe o si]

Onoh nwere ụmụ abụọ, Candice Onyeama (onye bụ odee ma bụrụkwa onye na-ahụ maka ihe nkiri) [18] na Jija Orka-Gyoh (nwa akwụkwọ).

Edemsibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Mcvie (11 March 2016). Here is my interview with Nuzo Onoh. authorsinterviews. Retrieved on 2 July 2018.
  2. McCrum (24 June 2016). Terrifying exorcism of writer accused of being POSSESSED by church pastor. Mirror.
  3. Sam-Duru (30 June 2015). Nigerian-British Nuzo pioneers new literary genre, Horror Books. Vanguard News. Retrieved on 16 November 2016.
  4. Onoh (1 May 2014). The Reluctant Dead (in English). Canaan-star publishing, UK. 
  5. Royce (11 July 2015). Unhallowed Graves – Book Review. Hellnotes. Retrieved on 16 November 2016.
  6. Onoh (31 October 2017). Dead Corpse (in English). Canaan-star publishing, UK. Àtụ:ASIN. 
  7. Ralph Fiennes, Nuzo Onoh, Gilberto Gil; The Arts Hour. BBC. BBC World Service.
  8. Dead Corpse by Nuzo Onoh. The Splits (2 January 2018). Retrieved on 2 July 2018.
  9. White (27 June 2016). Nuzo Onoh - THE SLEEPLESS. Starburst Magazine. Retrieved on 2 July 2018.
  10. 10.0 10.1 White (27 June 2016). THE SLEEPLESS. Starburst Magazine. Retrieved on 2 July 2018.
  11. 'my stories are mostly themed around vengeance.' An interview with Nuzo Onoh. (en-ZA). Short Story Day Africa. Retrieved on 2020-05-30.
  12. Handbook of African Literature
  13. Onoh (3 October 2017). 6 Beautiful African Death Rituals. Female First. Retrieved on 2 July 2018.
  14. Onoh (31 March 2016). An African Witchdoctor - The Good, The Bad and The Bumbling Idiot!. Female First. Retrieved on 2 July 2018.
  15. Sutherland (2 May 2017). Fascist Ghosts: Racism and the Far Right in British Horror, Part Three. Bookmarked. Archived from the original on 2 July 2018. Retrieved on 2 July 2018.
  16. Acclaimed writer Nuzo Onoh comes to Miskatonic London to present: AFRICAN HORROR: SHADES OF SUPERSTITION, April 11th @ the Horse Hospital - Diabolique Magazine.
  17. 17.0 17.1 17.2 17.3 17.4 Macheso (14 November 2016). Beyond the Magical and the Horrific: Reading Nuzo Onoh's The Sleepless. AfricanWriter. Retrieved on 2 July 2018.
  18. The British Urban Film Festival awards 2017 winners announced. Maroon News (10 September 2017). Archived from the original on 26 March 2018. Retrieved on 2 July 2018.