Nwali Sylvester Ngwuta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ

Nwali Sylvester Ngwuta, CFR (abalị iri atọ, n'ọnwa atọ na afọ otu puku, narị iteolu na iri ise na otu ruo na abalị asaa, n'ọnwa atọ afọ puku abụo na iri abụọ na otu (30 Machị 1951 7 Maachị 2021) bụ onye ọka iwu Naijiria na onye ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Naịjirịa.[1][2][3] Ọ rụrụ ọrụ n'Ụlọikpe Kasị Elu site na afọ puku abụọ na iri na otu (2011) ruo mgbe ọ nwụrụ na afọ puku abụọ na iri abụo na otu (2021).[4]

Oge ọ malitere[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Justice Sylvester na afọ otu puku, narị iteolu na iri ise na otu (1951) na Amofia-Ukawu, mpaghara ọchịchị ime obodo Onicha nke Ebonyi Steetị, ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria.[5]

O nwetara nzere bachelọ na Iwu na Mahadum Obafemi Awolowo ma a kpọọ ya n'ụlọ ikpe, ụlọ ikpe Naijiria na afọ otu puku, narị iteolu na iri asaa na asatọ (1978) mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọ akwụkwọ iwu Naịjirịa.[6]

Ọrụ iwu[dezie | dezie ebe o si]

Justice Sylvester malitere ọrụ iwu ya na afọ otu puku, narị iteolu na iri asaa na asatọ (1978) dị ka onye ndụmọdụ steeti na Benue Steeti Ministry of Justice, n'otu afọ ahụ ka o guzobere ụlọ ọrụ ọka iwu nke ya. N'ọnwa iri n'afọ otu puku, narị iteolu na iri iteolu na ise (Ọktoba afọ 1995), a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye ọka ikpe nke ụlọ ikpe dị elu nke steeti Abia. N'abalị iri abụọ na abụọ n'ọnwa ise na afọ puku abụọ na iri na otu (Mee 2011), a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi oche nke ụlọ ikpe mkpegharị ikpe nke Naijiria ma nʼọnwe ise n'afọ puku abụọ na iri na atọ (Mee afọ 2013), a nhọpụta ya n "ụlọ ikpe kachasị elu nke Nigeria" dị ka onye ọka ikpe.[7]

Ọ bụ onye isi oche nke mkpebi nke Ụlọikpe Kasị Elu nke kwadoro Olusegun Mimiko dị ka gọvanọ a họpụtara na Ondo Steeti na ntuli aka gọvana nke onwa ise n'afọ puku abụo na iri na atọ (Mee 2013).[8] Ọ chịkwara mkpebi nke Ụlọikpe Kasị Elu nke kwadoro Kayode Fayemi dị ka gọvanọ a họpụtara na Ekiti Steeti na ntuli aka gọvana nke ọnwa isii n'afọ puku abụọ na iri na atọ (June 2013) ma ndị ọka ikpe Ibrahim Tanko Muhammad na Suleiman Galadima kwadokwara ya.[9] Ngalaba Na-ahụ Maka Nchebe nke Steeti (DSS) jidere ya na abaị asatọ n'ọnwa iri na afọ puku abụọ na iri na isii (8 Ọktoba 2016) maka ebubo iri ngo na nrụrụ aka.[10] Otú ọ dị, Ụlọikpe nke Code Tribunal (CCT) kpebiri na ọnwa ise n'afọ puku abụọ na iri na asatọ (Mee 2018) na ọ bụ naanị Kansụl Ikpe nke Mba nwere ike ikpebi ma Ngwata ga-eche ikpe ihu ma ọ bụghị.[11] Na ọnwa iteolu, n'afọ puku abụọ na iri na iteolu (Septemba 2019), Ngwuta maliteghachiri ọrụ ya dị ka onye ọka ikpe nke Ụlọikpe Kasị Elu mgbe a kwụsịtụrụ ya afọ atọ.[12]

Ndị otu[dezie | dezie ebe o si]

  • Onye otu, Nigerian Bar Association
  • Onye otu, International Bar Association
  • Onye otu, Nigerian Body of Benchers

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

  • Ndepụta ndị si Ebonyi Steeti

Ebemsidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. Supreme Court Justice Sylvester Ngwuta passes on (7 March 2021). Archived from the original on 7 March 2021. Retrieved on 21 May 2023.
  2. SC Upholds Fayose's Election, Says Impeachment Not Ground for Disqualification, Articles - THISDAY LIVE. thisdaylive.com. Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 2 May 2015.
  3. S-Court declines to sack Gov Dickson of Bayelsa State. newshunt.com (7 March 2015). Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 2 May 2015.
  4. Supreme Court Judge, Ngwuta dies. The Nation (7 March 2021). Retrieved on 7 March 2021.
  5. Supreme Court judge, Ngwuta, is dead | Premium Times Nigeria (en-GB) (2021-03-07). Retrieved on 2022-03-02.
  6. Hon. Justice Nwali Sylvester Ngwuta JSC, CFR. supremecourt.gov.ng. Retrieved on 30 April 2015.
  7. CJN abolishes plea bargain. Vanguard News (16 November 2011). Retrieved on 2 May 2015.
  8. Ondo guber: Mimiko wins. The Sun News. Retrieved on 1 April 2015.
  9. Ekiti: Supreme Court throws out Oni's appeal. The Sun News. Retrieved on 1 April 2015.
  10. Nigeria Webmaster. Archived from the original on 2016-10-12. Retrieved on 2023-05-21.
  11. Justice Ngwuta cleared of non-declaration of assets charges (15 May 2018).
  12. Supreme Court judge, Justice Ngwuta, who faced failed corruption cases resumes work (23 September 2019).