Nzukọ Ọgọstụ

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Nzukọ Ọgọstụ

Nzukọ Ọgọstụ bụ ọgbakọ ndị ụmụ nwanyị Igbo na-eme kwa afo n'ọnwa Ọgọstụ, ọ bụ nnukwu mbata, ebe ụmụ nwanyị ndị bi na mba ndị ọzọ na-alaghachi n'obodo ndị dị ha izuta ndi nọ n'ụlọ wee kparịta ihe metụtara mmepe obodo, njikwa esemokwu, mmepe mmadụ, ọhaneze na aku n'uba, yana atumatu omenala. Nzukọ a bụ memme ụbọchị atọ nke ekewara ụzọ atọ, a na-eme nke mbụ na ọkwa obodo, nke abụọ n'ime obodo, nke atọ na ụka dị iche iche ebe a na-eme ekele iji gosipụta njedebe nke nzukọ ahụ. [1] [2]

Akụkọ[dezie | dezie ebe o si]

Nsogbu[dezie | dezie ebe o si]

N’afọ mgbe ebidosuru nzukọ nke ọnwa Ọgọstụ, ụmụ nwanyị bara ụba na ndị nwere ike na obodo, jiri nzukọ nke Ọgọstụ were ya n'awakpọ ụmụ nwanyị ndị ọzọ anya site na njikere akwa na ọla ha . Omume a mere ka ọtụtụ ụmụ nwanyị gharazie inwe mmasị ma mee ka ha ghara ịga, n'ihi nka mere ụfọdụ ụmụ nwanyi ji kwusi iga nzukọ a na ebe di iche-iche. Ọtụtụ alụm di na nwunye mgbasara maka ndị nwunye ikwanye di ha ọkụ ka ha nweta uwe na mkpuchi ọhụrụ maka Nzukọ Ọgọstụ. [3] Esemokwu a emere ejiri nwe mkpebi na ụmụ nwanyị kwesịrị ịpụta na otu udi akwa na uwe aga ahọputa, nke ga eme ka nrụgide na asọmpi hara idi. [4]

Ihe nkiri sinima[dezie | dezie ebe o si]

Egwuregwu akpọrọ “Nzukọ Ọgọstụ” bụ nke emere na 2018 n'egwuregwu ihe nkiri nke Lagos, njem egwuregwu ahụ gara n'ihu na steeti ndị ọzọ dị na Abuja na Anambra . [5] [6] Ewepụtakwara ihe nkiri akpọrọ “nzukọ Ọgọstụ” n’afọ 2014.

Hụ kwa[dezie | dezie ebe o si]

Kwuru[dezie | dezie ebe o si]