Oraukwu, Anambra

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Oraukwu, Anambra
human settlement
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaAnambara Steeti Dezie
nhazi ọnọdụ6°5′0″N 6°58′0″E Dezie
Nkwekọrịtara oke alaAlor Dezie
Map

Oraukwu bụ obodo dị na Anambra Steeti, Nigeria. A na-akpọbu ya Ohaukwu. [1] Ọ bụ otu n'ime obodo ndị dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke Anambra steeti, ọ dịkwa ihe dịka  kilomita iri anọ n'ọwụwa anyanwụ Ọnịcha n'akụkụ okporo ụzọ ochie si Enugu gaba Ọnịcha. Ọ dị ihe dịka  kilomita iri abụọ n'ọdidaugwu nke senta okpuru ọchịchị Awka . Ndị bi na Ọraukwu gụnyere ụmụ amaala na ndị ọbịa si mpaghara dị iche iche na mba ahụ. Ụmụ amaala ahụ nwere ndị gụrụ akwụkwọ nke ukwuu na ndị ahịa bara ọgaranya na-agụghị akwụkwọ bụ ndị ahịa azụmaahịa mba ụwa. Onye na-ahazi ihe gbasara obodo ahụ bụ onye eze ọdịnala nke nwetara ikike steeti na ndị otu ya nakwa ndị isi otu obodo na ndị otu ndị a họpụtara nke ọma dịka iwu obodo siri dị. Oraukwu nwere ọtụtụ ndị ama ama bụ ndị nwere ọkwa n'akụkụ dị iche iche nke ndụ dịka na agụmakwụkwọ, azụmahịa na itinye ego n'ebe ọ ga-amuputa, nrụpụta ụlọ ọrụ wdg. A maara ha nke ọma maka izuputa na iwuli mmadụ nke ọma yana ọtụtụ mmepe akụrụngwa a na-ahụ anya bụ nke ọ bụ ụmụ amaala ji aka ha na-akwado.

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

  1. Cybo (en). Cybo. Retrieved on 2020-05-27.