Oreoluwa Lesi

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Oreoluwa Lesi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaAsụsụ Yoruba, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụeconomist Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Essex, London School of Economics and Political Science, Harvard Extension School Dezie
ogo mmụtaBachelor of Economics, nzere masters Dezie
Ihe nriteOkayAfrica 100 Women Dezie

Oreoluwa Somolu Lesi bụ onye ọchụnta ego na-elekọta mmadụ onye mba Naijiria nke UK zụrụ azụ maka akụ na ụba na ọkachamara teknụzụ ozi. Ọ bụ onye hibere, nakwa onye isi oche nke Women's Technology Empowerment Center (W.TEC), otu na-adịghị akwụ ụgwọ nke na-enye ụmụ nwanyị na ụmụ agbọghọ ike na ọha mmadụ na akụ na ụba site na agụmakwụkwọ na teknụzụ ozi. [1] E hiwere W.TEC n'afọ 2008. Ọ bụ onye otu Ashoka na onye nnata nke Anita Borg Institute (ABIE) Change Agent Award. [2]

Ndụ Mmalite na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

Afọ ndị mbụ Lesi bụ ndị o biri na Nigeria. N'ebe nna onye injinia eletriki, ọ hụrụ teknụzụ n'anya site na nwata nke mere ka ọ mepụta ngwa ngwanrọ nke ejiri na-azụ ahịa akwụkwọ nne na nna ya. [3] [4]

Mgbe afọ ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị na Queen's College, Lagos gasịrị, [1] ọ gụrụ akwụkwọ diploma na mmemme kọmputa. [3] Ọ gakwara mba United Kingdom ebe ọ gụrụ gbasara akụnụba wee nweta nzere bachelọ na Economics na Mahadum Essex . Mgbe ọ nọ na mahadum, o hibere akwụkwọ edemede azụmahịa maka ụmụ akwụkwọ, nke ahụ kpalitere mkpamkpa mbụ banyere etu ụmụ nwanyị nwere ike isi jiri teknụzụ mepụta ohere nke akụ na ụba. [5]

O nwetakwara, nzere masta na nyocha, imewe na njikwa ozi site na London School of Economics and Political Science . Ọ gụrụ Applied Sciences na Harvard University Extension School [2] [6]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Oreoluwa rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ Education Development Center, Inc. na United States dị ka onye na-enyere aka na nyocha nakwa dịka onye na-arụ ọrụ nkà na ụzụ. [6] Ọ laghachiri Naijiria n'afọ 2005. [7] Na Naijiria, ọ rụrụ ọrụ na Lonadek Oil and Gas Consultancy ebe o jisiri ma lekọta otu CSR Initiative-2020 nke lekwasịrị anya na mmepe nka nke ndị ntorobịa na mpaghara sayensị na teknụzụ. [8] O hiwere W.TEC n'afọ 2008, mgbe teknụzụ adịghị egwu dịka ọ dị kemgbe ọtụtụ afọ. [9] Enwekwara ntakịrị mmata maka ọdịiche nwoke na nwanyị na teknụzụ yana ihe kpatara imechi ya ji dị mkpa na 2008, nke mere ka ọrụ ya sie ike karị. [5]

W.TEC na-achikọba ọtụtụ mmemme na steeti Lagos, Anambra na Kwara, nke gụnyere emume 'She Creates Camps' na W.TEC Academy (technology afterschool clubs) [5] [10] ma metụtala ụmụ agbọghọ na ndị nkuzi puku iri abụọ na asaa. [11] N'oge na-adịbeghị anya, W.TEC malitere ọrụ Inclusive Technology for All (IT4All) na mmekorita ya na Center Developmental Children. Ihe oru ngo a na-ewebata teknụzụ na echiche STEM sara mbara nye ụmụ akwụkwọ nwere nkwarụ nke mmepe. [12]

Ụfọdụ isi ihe dị mkpa na ọrụ ya na W.TEC gụnyere imekọ ihe ọnụ ya na Dr. Omobola Johnson nke ụlọọrụ Federal Ministry of Communication Technology na 2014 iji wulite otu òtù ụmụ agbọghọ na mba nke a na-akpọ Digital Girls Club, bụ nke e mere n'ụlọ akwụkwọ iri na abụọ na mpaghara ọ bụla wee gbasaa gaa n'ihu ma ruo n'ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ na Naịjirịa. Digital Girls Club gosipụtara usoro ọmụmụ gunyere ihe dị iche iche, bụ nke akwadoro na ọnụ ụzọ intanetị nke ndị nkuzi nwere ike ịnweta ma jiri n'ụlọ akwụkwọ ha dị iche iche. [5]

A kwanyere Oreoluwa ugwu dịka onye otu Ashoka na 2013. [3] Na 2009, ọ nwetara Anita Borg Change Agent Award. [2] [13]

A na-amatakarị W.TEC maka ọrụ ya dị ka ọgbakọ ọsụ ụzọ n'ịgbalị imechi oghere nwoke na nwanyị na teknụzụ. W.TEC eritela ihe nrite dika 2019 EQUALS in Tech award (Skills category) [14] na 2019 Nigeria Internet Registration Association (NIRA) Presidential Award for Women's Development. [15] W.TEC pụtakwara dị ka onye mmeri nke WSIS 2020 (Access to Information and Knowledge Category). [16]

N'afọ 2019, onye mepụtara World Wide Web, Sir Tim Berners-Lee gara W.TEC, dịka akụkụ nke njem awa iri atọ iga obodo atọ gburugburu ụwa iji mee emume ncheta afọ iri atọ nke webụ. N'oge ọ gara W.TEC, ọ zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ndị so na mmemme W.TEC. [17] [18] Na Jenụwarị 2020, TIME gwara otu ndị ama ama isii (gụnyere Sir Tim Berners-Lee) ka ha degara onye na-eto eto ma ọ bụ ndị nke ha họọrọ akwụkwọ. Sir Berners-Lee họọrọ idegara ụmụ agbọghọ W.TEC ozi n'akwụkwọ ozi. [19]

Ihe nrite na nnabata[dezie | dezie ebe o si]

Oreoluwa enwetala ọtụtụ ihe nrite na nkwanye ugwu nke gụnyere:

  • OkayAfrica 100 Women for 2020[20]
  • One of the 5 Women Who Defined the Nigerian Tech Space in 2019 by Technext.ng[21]
  • 2018 Her Network Woman of the Year in Technology[22]
  • 2018 Leading Ladies Africa 100 Most Inspiring Women in Nigeria[23]
  • 2017 SME100 & Invicta Top 100 Female-Owned Businesses in Nigeria[24]
  • 2016 #YTech100 Special Recognition Award
  • 2016 YNaija!’s #YTech100 (Top 100 Young People in Technology of 2016)
  • 2014 Leadership Award from La Roche Leadership Foundation[25]
  • 2014 YNaija!’s 100 Top 100 Young People in Technology of 2014
  • Vision 2020 Youth Empowerment & Restoration Initiative Recognition Award – May 2010
  • 2009 Anita Borg Change Agent Award – Anita Borg Institute, Tucson AZ, U.S.A[26]
  • 2008 Systers Pass It On Award Winner – Anita Borg Institute[27]

Mmekọrịta[dezie | dezie ebe o si]

Oreoluwa anatawo mmekọrita ndị a:

  • 2020 ICANN 69 Fellow: A na-ekpughere ndị otu ICANN ọrụ nke ụlọ ọrụ Internet Corporation of Assigned Names & Numbers (ICANN), a na-ekenye ha onye ndụmọdụ, ha na-anatakwa ọzụzụ n'akụkụ dị iche iche nke ihe ọmụma na ụlọ nka tupu, n'oge, na mgbe nzukọ ọha ICANN gasịrịa.[28]
  • 2019 ICANN 66 Fellow[28]
  • 2014 Vital Voices Lead Fellow: The Vital Voices Lead Fellowship na-ejikọta, ma na-enye ụmụ nwanyị ọzụzụ, ma na-eme ka ahu ụmụ nwanyị pụrụ iche anya, bu ndi na-edu NGO na ụlọ ọrụ gburugburu ụwa. [29][30]
  • 2013 Ashoka Fellow: Ndị otu Ashoka bụ ndị ọchụnta ego a ma ama na mba ụwa. Ha na-akwado echiche ọhụrụ na-agbanwe usoro ọha mmadụ, na-enye uru maka onye ọ bụla na imeziwanye ndụ nke nde kwuru nde mmadụ.[31]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Ọ lụrụ Gboyega Lesi ma biri na Lagos . [32]

Mbipụta[dezie | dezie ebe o si]

Afọ Aha Ọrụ
2004 Ime ka mmụta n'ịntanetị kacha mma: Okwu mmalite maka mmụta na ịntanetị' Ebe mmepe agụmakwụkwọ [33]
2006 'Ịkọ akụkọ nke anyị: Ụmụ nwanyị Africa na-ede blọgụ maka mgbanwe mmekọrịta ọha' Akwụkwọ gbasara okike na mmepe [34]
2013 Redio maka mmepe ụmụ nwanyị na-enyocha mmekọrịta dị n'etiti nnweta na mmetụta Nokoko Institute of African Studies Carleton University Ottawa, Canada) 2013(3) [35]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 Vista. "We're empowering girls for IT devt – Oreoluwa Somolu", Vanguard Newspaper, 21 October 2012. Retrieved on 13 October 2016.
  2. 2.0 2.1 2.2 The Editor. Anita Borg Institute Announces 2009 Change Agent Award Winners. Business Wire Institut. Retrieved on 17 October 2016.
  3. 3.0 3.1 3.2 The Administrator. Ashoka Fellow. Ashoka. Retrieved on 14 October 2016.
  4. Raising Digital Women, The W-TEC Way (en-US). TechCabal (2014-07-21). Retrieved on 2020-04-15.
  5. 5.0 5.1 5.2 5.3 My Life In Tech: Oreoluwa Somolu-Lesi's Decade and More of Balancing Tech's Gender Scale (en-US). TechCabal (2019-05-07). Retrieved on 2020-04-15.
  6. 6.0 6.1 TechHerNG (2016-01-27). Oreoluwa Somolu Lesi: W.TEC founder (en-US). TECHHER. Retrieved on 2020-04-15.
  7. Bimbola Segun-Amag. CPAfrica Intervies Oreoluwa Somolu Lesi of Women's Technology Empowerment Centre. CPAfrica. Archived from the original on 1 April 2019. Retrieved on 14 October 2016.
  8. Innov8tiv.com (2019-04-07). Oreoluwa Lesi gave innov8tiv a walk through of how she found Women's Technology Empowerment Center (W.TEC) (en-US). Innov8tiv. Retrieved on 2020-04-15.
  9. Africa-ontherise. Exclusive Interview: Oreoluwa Somolu-Lesi, Executive Director, Women's Technology Empowerment Centre (W.TEC). Changing the AFrican Conversation. Retrieved on 14 October 2016.
  10. Group organises summer ICT training for girls (en-US). National Light (2019-09-12). Archived from the original on 2019-10-26. Retrieved on 2020-04-15.
  11. Together We: Are our sisters keepers!. preview.mailerlite.com. Retrieved on 2020-04-15.
  12. How to educate special needs children (en-US). Latest Nigeria News, Nigerian Newspapers, Politics (2019-05-01). Retrieved on 2020-04-15.
  13. Jerri. ABIE Award Winners, Change Agent. Anita Borg Institute. Retrieved on 17 October 2016.
  14. PRESS RELEASE EQUALS in Tech Awards celebrate five outstanding initiatives to promote digital gender equality (en). equals. Archived from the original on 2019-12-24. Retrieved on 2020-04-15.
  15. Nigeria Internet Registration Association. "2019 .NG Press Release", NIRA Press Release, July 8, 2019. Retrieved on April 15, 2020.
  16. WSIS Prizes 2020. www.itu.int. Retrieved on 2020-04-15.
  17. Tim Berners Lee Visits Lagos to Mark 30th Anniversary of the World Wide Web. Technext (2019-03-13). Retrieved on 2020-04-15.
  18. Berners-Lee (2019-03-13). Wonderful energy and creativity — girl power at W.TEC in Lagos — should inspire girls all over the world to get into tech #Web30 #ForTheWebpic.twitter.com/ARNGsG3a3k (en). @timberners_lee. Retrieved on 2020-04-15.
  19. Letters to Young People Who Inspire Us, By Six Prominent People (en). Time. Retrieved on 2020-04-15.
  20. OKAYAFRICA - 100 WOMEN (en-US). Archived from the original on 2020-04-16. Retrieved on 2022-04-05.
  21. 5 Women That Defined the Nigerian Tech Space in 2019 (2019-12-18).
  22. BellaNaija.com (2018-12-10). Chinwe Egwin, Ola Brown, Temie Giwa-Tubosun Honored at 2018 Her Network Woman of the Year Awards | Full List (en-US).
  23. Sola Sobowale, Ibidunni Ighodalo, Nkechi Eze…Here are Nigeria's Most Inspiring Women in 2018 – Leading Ladies Africa (en-GB).
  24. BellaNaija.com (2017-03-09). BellaNaija Listed on Invicta Africa & SME100 Nigeria's "100 Most Innovative Female-Owned Businesses in Nigeria" | See Full List (en-US).
  25. BellaNaija.com (2014-09-19). La Roche Leadership Foundation celebrates Tolu Ogunlesi, Ore Lesi, MI Abaga & More Inspiring Entrepreneurs in Lagos (en-US).
  26. Oreoluwa Somolu (en-US) (2009-10-11). Archived from the original on 2019-07-25. Retrieved on 2022-04-05.
  27. Oreoluwa S. (en-US) (2008-04-20).
  28. 28.0 28.1 Montréal 2019 Fellowship Participants - ICANN.
  29. VVLead (en).
  30. TechHer Spotlight (January 27, 2016).
  31. Oreoluwa Somolu (en-us).
  32. Odebiyi. Compliment your wife always. The Nation. Retrieved on 14 October 2016.
  33. Somolu, Oreoluwa. Making the Most Of On-line Learning: An Introduction to Learning on the Internet. Education Development Centre. Retrieved on 17 October 2016.
  34. Sweetman. Telling our own stories': African women blogging for social change. OXFAM. Retrieved on 17 October 2016.
  35. Oreoluwa. Radio for Women's Development Examining the Relationship between Access and Impact. Nokoko. Retrieved on 17 October 2016.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]