Osisi Ndị E Kpakọrịta

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Team Trees logo

Team Trees (nke a na-akpọ #TEAMTREES) bụ nchịkọta ego nke nwetara nde dollar US 20 tupu mmalite nke afọ 2020 ịkụ osisi nde 20. Ndị American YouTubers MrBeast na Mark Rober malitere atụmatụ ahụ, ndị YouTuber na-akwado ya.[1] Onyinye niile na-aga Arbor Day Foundation, otu na-akụ osisi nke na-ekwe nkwa ịkụ otu osisi maka dollar US ọ bụla nyere.[2] Arbor Day Foundation malitere ịkụ osisi na ọnwa Jenụwarị afọ 2020 ma na-eme atụmatụ ịkwụsị "ọ bụghị na ọnwa Disemba afọ 2022".[2][3] A na-eme atụmatụ na osisi nde 23 ga-ewe 210 km2 ( mi) nke ala, na-amị ihe dị ka nde tọn carbon 1.6 ma wepụ puku tọn 116 mmetọ site na ikuku.[4]

As of 29 Juunu 2023, oru ngo a ewelitela $24,438,806, karịa ebumnuche onye na-anakọta ego ịkụ osisi nde 20.  Dị ka a tụrụ anya ya, a kụọla ihe karịrị nde osisi iri abụọ .[5]

  Echiche ahụ malitere na ọnwa Mee ụbọchị iri abụo na anọ, n'afọ 2019, mgbe onye na-akwado ya tụrụ aro na Reddit na MrBeast (Jimmy Donaldson) kwesịrị ịkụ osisi nde 20 iji mee emume iru nde mmadụ 20 na YouTube.[6][3] Echiche ahụ gbasara na YouTube, Reddit, na Twitter, karịsịa n'ụdị memes.[2][3] Echiche a nwere ike ịbụ na ọ metụtara ọkụ ọhịa Amazon nke afọ 2019. Onye America YouTuber, onye injinia, na onye na-emepụta ihe Mark Rober sonyeere Donaldson iji malite nchịkọta ego. N'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2019, Donaldson bulite vidiyo YouTube na-akọwa atụmatụ ya, nke kwuru na ọ bụ ebe kachasị elu na ibe YouTube, ma mee ka ọtụtụ ndị YouTubers sonye n'òtù ahụ.[7][8][3][9]

A ga-akụ osisi ndị ahụ "n'oké ọhịa dịgasị iche iche n'ala ọha na eze na nke onwe n'ebe ndị nwere nnukwu mkpa" malite na ọnwa Jenụwarị n'afọ 2020. Ebumnuche bụ ka a kụọ ha "na-agaghị agafe ọnwa Disemba n'afọ 2022".[2][3]

  1. Williams. "YouTube star MrBeast wants to plant 20 million trees. As Of 1st Elon Musk, Jack Dorsey, and more helped him succeed.", CNN, October 30, 2019. Retrieved on October 30, 2019.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Alexander (October 25, 2019). MrBeast partners with more than 600 YouTubers, including PewDiePie and MKBHD, to plant 20 million trees. The Verge. Archived from the original on October 28, 2019. Retrieved on October 30, 2019. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "theverge1" defined multiple times with different content
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 Tenbarge (October 27, 2019). Here's why the top YouTubers from all corners of the platform are talking about planting 20 million trees for #TeamTrees. Insider. Retrieved on October 30, 2019. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "insider" defined multiple times with different content
  4. Impact of the Time for Trees Initiative. Arbor Day Foundation. Archived from the original on May 9, 2019. Retrieved on December 11, 2019.
  5. #teamtrees. Archived from the original on December 26, 2019.
  6. Please save us MrBeast. Reddit (May 24, 2019). Archived from the original on May 23, 2019. Retrieved on December 9, 2019.
  7. Planting 20,000,000 Trees, My Biggest Project Ever!. YouTube (October 25, 2019). Archived from the original on November 8, 2019. Retrieved on November 9, 2019.
  8. Cheok. "Musk Donates 1 Million Trees to Global Reforestation Campaign", Bloomberg News, October 31, 2019. Retrieved on November 19, 2019.
  9. Calma (October 25, 2019). Planting trees to take on climate change isn't as easy as YouTubers might think. The Verge. Archived from the original on October 30, 2019. Retrieved on November 19, 2019.