Our Bodies, Ourselves

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Our Bodies, Ourselves
ọrụ edemede
ụdịọrụ na-abụghị akụkọ ifo Dezie
mba osiNjikota Obodo Amerika Dezie
asụsụ eji dee ọrụBekee Dezie
afọ/ụbọchị mbipụta1971 Dezie

Our Bodies, Ourselves bụ akwụkwọ gbasara ahụike ụmụ nwanyị na mmekọahụ nke ụlọ ọrụ na-enweghị uru Our Codies Ourelves (nke a na'oge gara aga bụ Boston Women's Health Book Collective) mepụtara. Nke mbụ e bipụtara na afọ 1970, nwere ozi metụtara ọtụtụ akụkụ nke ahụike ụmụ nwanyị na mmekọahụ. Akwụkwọ ahụ bụ mgbanwe n'ihi na ọ na-agba ụmụ nwanyị ume ime emume mmekọahụ ha, gụnyere isiakwụkwọ gbasara ikike ịmụ nwa, mmekọahụ ụmụ agbọghọ, na nnwere onwe mmekọahụ.[1] Ịga n'ihu na ụmụ nwanyị na-etinye aka na ọchịchọ mmekọahụ ha n"ezie na'emegide akụkọ ifo a ma ama nke "ụmụ nwanyị dị ka ndị na -edo onwe ha na ndị anaghị arụ ọrụ," na "ndị ikom dị ike na onye na emekọrịta mmekọahụ.[2] Na afọ 2011, e bipụtara mbipụta akwụkwọ a nke kachasị ọhụrụ.

Ndị otu ụmụ nwanyị gburugburu ụwa sụgharịrị akwụkwọ ahụ ma gbanwee ya ma dị n'asụsụ iri atọ na atọ.[3] Ahịa maka akwụkwọ niile karịrị nde anọ.[4] Akwụkwọ akụkọ The New York Times akpọwo akwụkwọ ahụ "akwụkwọ kacha erepụ na America n'akụkụ niile nke ahụike ụmụ nwanyị" na "ihe gbasara ụmụnwaanyị".[5]

Ụdị ejiji[dezie | dezie ebe o si]

Akwụkwọ mbụ bụ ngwaahịa nke òtù ụmụ nwanyị ma a ka nwere ike ikwu na ọ na-egosipụta ụkpụrụ ya. A na-eburu ahụmahụ onwe onye nke ụmụ nwanyị n'uche ma na'ozuzu ya. Akwụkwọ ahụ na-ekwusi ike na ike site na ozi na mmụta, ọkachasị, ozi na'aka ụmụ nwanyị na ibe ha na akụkọ onwe ha n'ihi na "site n"ịkekọrịta nzaghachi anyị, anyị nwere ike ịmepụta ntọala nke nkatọ ihe ndị ọkachamara gwara anyị".[6]

Ihe nkiri[dezie | dezie ebe o si]

Ìgwè ụmụ nwanyị malitere ihe ngosi Our Bodies, Ourselves bụ akụkụ nke ihe ngosi She's Beautiful When She-s Angry, banyere ndị guzobere òtù ụmụnwaanyị nke oge a site na afọ 1966 ruo afọ 1971.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Edensibịa[dezie | dezie ebe o si]

  1. "Boston Women's Health Collective | Equality Archive", Equality Archive, 2015-11-03. Retrieved on 2017-03-09. (in en-US)
  2. Feminist Theory Reader
  3. Global Projects.
  4. Judy Norsigian, Vilunya Diskin, Paula Doress-Worters, Jane Pincus, Wendy Sanford, and Norma Swenson. "BWHBC and 'Our Bodies, Ourselves': A Brief History and Reflection. Journal of the American Medical Women’s Association, Winter 1999.
  5. Back cover.
  6. Boston Women's Health Book Collective (1994). "Our Bodies, Ourselves", in Schneir: Feminism in Our Time: The Essential Writings, World War II to the Present. New York: Vintage, 352, 357. ISBN 9780679745082. 

Ịgụ ihe ọzọ[dezie | dezie ebe o si]

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]