Paul F. Keene Jr.
| Ụdịekere | nwoke |
|---|---|
| Mba o sị | Njikota Obodo Amerika |
| Aha enyere | Paul |
| Aha ezinụlọ ya | Keene |
| Ụbọchị ọmụmụ ya | 24 Ọgọọst 1920 |
| Ebe ọmụmụ | Philadelphia |
| Ụbọchị ọnwụ ya | 26 Novemba 2009 |
| Ebe ọ nwụrụ | Philadelphia, Warrington Township |
| Ọrụ ọ na-arụ | onye ese, university teacher |
| Onye were ọrụ | Temple University, Bucks County Community College, The University of the Arts, Tyler School of Art |
| Ebe agụmakwụkwọ | The University of the Arts, Tyler School of Art, Académie Julian |
| Ebe obibi | Philadelphia, Haiti, Paris |
| Agbụrụ | Ndi Afrika nke Amerika |
| Omenkà faịlụ na | Smithsonian American Art and Portrait Gallery Library, National Gallery of Art Library |
| Onye òtù nke | Tuskegee Airmen |
| Suffix ọgbọ | L252247-F2 |
| Ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Paul Farwell Keene Jr. (Ubochí irí abụọ na anọ n'ọnwa Ọgọst 1920 rụo ụbọchị irí abụọ na isii n'ọnwa Nọvemba 2009) bụ ónyé na-ese ihe na ónyé nkuzi nke Philadelphia nke ọrụ ya nyeere aka mee ka ndị na-ese Black American pụta ìhè.[1]
Akụkọ ndụ
[dezie | dezie ebe o si]A mụrụ Keene n'ubochí irí abụọ na anọ n'ọnwa Ọgọst, 1920 na Philadelphia, Pennsylvania.[2] Ọ gàrà Philadelphia Museum School of Art, Tyler School of Art and Architecture, na Académie Julian.[3] Na 1944 Keene lụrụ Laura Mitchell.[4] Ọ rụrụ ọrụ na Tuskegee Airman n'oge Agha Ụwa nke Abụọ. Keene nwere ike ịmụ na Academie Julian na Paris n'okpuru G.I. Bill. Mgbè ọ nọ na Paris, Keene bụ onye guzobere Galerie Huit.[5]
N'afọ 1952, Keene gàrà Haiti ebe ọ gụrụ akwụkwọ ma kụzie n'okpuru John Hay Whitney fellowship.[3][5] N'afọ 1954 ọ laghachiri na United States wee malite ịkụzi na Philadelphia College of Art, ébé ọ kụziri ruo n'afọ 1968.[3] Site na 1968 rụo 1985 Keene kụziri na Bucks County Community College.[6]
N'afọ 1966, Keene sere ihe osise na Mahadum HBCU Johnson C. Smith na Charlotte, North Carolina. N'afọ 1971, Keene mepụtara ihe enyemaka màkà Fifty Ninth Street Baptist Church na Philadelphia. O nwèrè mmekọrịta afọ iri abụọ na Brandywine Workshop ma bụrụ ónyé natara Van Der Zee Award ha na 1990.[4]
Keene nwụrụ n'ubochí irí abụọ na isii Nọvemba, 2009, na Warrington, Pennsylvania.[2]
Ọrụ Keene dị na nchịkọta nke Philadelphia Museum of Art, Pennsylvania Academy of the Fine Arts, na James A. Michener Art Museum.[7][8][6]
E tinyere ọrụ Keene na ngosi 2015 We Speak: Black Artists na Philadelphia, 1920s-1970s na Woodmere Art Museum.[9]
Edensibia
[dezie | dezie ebe o si]- ↑ Paul Keene Jr.. AskArt. Retrieved on 13 June 2022.
- 1 2 Smith. Paul F. Keene Jr.. PMA LibGuides at Philadelphia Museum of Art. Retrieved on 13 June 2022.
- 1 2 3 Keene Jr., Paul F. (en-gb). Woodmere Art Museum. Retrieved on 13 June 2022.
- 1 2 Cook. Acclaimed artist's works raised racial awareness (en). Philadelphia Inquirer. Retrieved on 13 June 2022.
- 1 2 Paul F. Keene papers, circa 1940-1987 (en). Archives of American Art, Smithsonian Institution. Retrieved on 13 June 2022.
- 1 2 Paul F. Keene (EN). Bucks County Artists Database. Retrieved on 13 June 2022.
- ↑ Untitled (en). Philadelphia Museum of Art. Retrieved on 13 June 2022.
- ↑ Paul Farwell Keene Jr.. Pennsylvania Academy of the Fine Arts. Retrieved on 13 June 2022.
- ↑ We Speak: Black Artists in Philadelphia, 1920s-1970s (en-gb). Woodmere Art Museum. Retrieved on 13 June 2022.
Njikọ mpụga
[dezie | dezie ebe o si]- foto nke ọrụ Keene na Dolan Maxwell