Peace Anyiam-Osigwe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Peace Anyiam-Osigwe
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Maachị 1969 Dezie
Ebe ọmụmụNkwerre Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya9 Jenụwarị 2023 Dezie
Ebe ọ nwụrụLagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụfilmmaker Dezie
ebe agụmakwụkwọOxford Brookes University Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1986 Dezie

Peace Anyiam-Osigwe (1969-2023), onye bụbu Peace Anyiam-Fiberesima MFR amụrụ n'abalị iri atọ n'ọnwa Maachi bụ onye Naịjirịa na-eme ihe nkiri na Onye isi ntụrụndụ nke akpọrọ "eze nwanyị nke ihe nkiri Nollywood". [1] O bu onye hiwere emume ihe nkiri n’uwa niile bụ, Africa Movie Academy Awards . Akwụkwọ akụkọ The Guardian dere na ọ bụ ọsụ ụzọ na-egosi ihe nkiri Nollywood na mmemme ihe nkiri mba ụwa. [2] Ọ duziri vidiyo egwu mbụ nke mmetụtara hip-hop bụ, P-Square . N’afọ 2012, gọọmentị Naịjirịa mere ya onye otu ‘Federal Republic ’ maka mgbalị ya na ụlọ ọrụ ihe nkiri/ntụrụndụ. [3] [4] Ọ bụ onye otu TED . [5]

Mmalite Ndụ[dezie | dezie ebe o si]

Anyiam-Osigwe amụrụ na abalị iri-ato nke onwa Maachi [6] O sitere na ezi ama ama bụ ezi Osigwe Anyiam-Osigwe dị na Nkwerre, Imo Steeti . Ọ bụ naanị nwa nwanyị n'ime ezinụlọ nwere ụmụaka asatọ. [7] O nwere asambodo Iwu na politikal sayensị na Mahadum Oxford Brookes . [8]

Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Awọdụ nke Afrika Moovi Akademi[dezie | dezie ebe o si]

Anyiam-Osigwe guzobere Africa Film Academy, otu na-achịkwa emume ihe nkiri kemgbe afọ 2005. Emere nturu ugo a ka ọ bụrụ otu n’ime onyinye kacha nwee ùgwù nye ndị Afrika nọ n’ememe ihe nkiri. Na mbipụta nke iri, ọ rịturu dị ka onye isi nke AMAAs. Na 2015, ọ malitere atumatu AfricaOne iji cheta ndị Afrika ngalaba ọrụ ntụrụndụ. [9]

Odide Ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Anyiam-Osigwe bụ odee nke abụ ederede. O nwere akwụkwọ ato nyere ya nkwalite. [5] N'ajụjụ ọnụ Alana Herro, ọ kọwara uri dịka otu n'ime ụzọ iji gosipụta nghọta ya na nghọta nke ihe gbara ya gburugburu. Tupu ọ banye mahadum, o bipụtara otu magazin akpọrọ, Clicks, nke edepụtara iji kwado ndị ojii na England. Ọrụ ya gbadoro ụkwụ na nkwado/nkwuchitere ọnụ.

onye nduzi ihe nkiri/TV[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ Anyiam-Osigwe na telivishọn malitere site na ihe omume mkparịta ụka bụ, Piece off my mind, nke na-elekwasị anya na mmeghachi omume ndị mmadụ na nsogbu obodo nke anaghị ahụkarị na mgbasa ozi. [5] Okwu ngosi ya gbadoro ụkwụ n'okwu gbasara ịkwuchitere ndị mmadụ n'otu n'otu ndị bụ ndị obodo anaghị elebakarị anya. O rụrụ aka n'usoro ihe nkiri Afrika, ịzụ ụmụaka na ịha nhatanha ụmụ nwanyị dịka mpaghara na-amasị ya na ihe nkiri na telivishọn. Na mbido egwu abụọ, ọrụ P-Square, Anyiam-Osigwe bụ onye lekọtara ha. Na 2016, o kwuru na ya na-anọchite Somkele Inyamah. [10]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Nwanne ya nwoke bụ, Michael, onye e gburu na 2014 bụ onye nhazi nchịkọta nke Osigwe Anyiam-Osigwe Foundation, otu na-anaghị achọ uru na-enyeghachi ndị Naijiria. [11] Ọ bụkwa onye nduzi, "Afrika Institute for Leadership Research and Development” na kansul jeneral nke Malawi na Naịjirịa. [12] Nne ya, Dorothy Chinyere Anyiam-Osigwe bụ onye nnata nke Office of the Order of the Niger site n’aka onye isi ala n’oge ahụ bụ, Olusegun Obasanjo maka ọrụ ebere ya na Naịjirịa. [13] Ya na di ya kewapụrụ [14]

Nrụtụaka[dezie | dezie ebe o si]

  1. Elizabeth Johnson. Female Narratives in Nollywood Melodramas. Lexington Books. 
  2. Chidera Muoka (13 March 2016). The Undiluted Creative: Peace Anyiam Osigwe. guardian.ng. Retrieved on 22 September 2016.
  3. Adeola Adeyemo (10 September 2012). 149 Nigerians to Receive Federal Government Award – Mike Adenuga, Teco Benson, Tony Elumelu, Sarah Sosan among Recipients. bellanaija.com. Retrieved on 22 September 2016.
  4. Full list of Nigerians shortlisted for National Honours. Channels TV (10 September 2012). Retrieved on 22 September 2016.
  5. 5.0 5.1 5.2 Alana Herro (22 October 2010). Fellows Friday with Peace Anyiam-Osigwe. ted.com. Retrieved on 22 September 2016.
  6. Celebrity Birthday: Peace Anyiam-Osigwe. nollywoodmindspace.com (30 March 2014). Retrieved on 22 September 2016.
  7. Adie Vanessa Offiong (9 May 2015). Peace Anyiam-Osigwe: Growing up in the midst of boys made me strong. dailytrust.com.ng. Archived from the original on 6 February 2017. Retrieved on 22 September 2016.
  8. Nigeria: Peace Anyiam Osigwe - I Left My Marriage With My Handbag and My Sanity. allAfrica.com (29 March 2014). Retrieved on 23 September 2016.
  9. Funsho Arogundade (15 September 2015). AMAA Founder, Peace Anyiam-Osigwe launches AFRICAONE. P.M. News. Retrieved on 22 September 2016.
  10. PEACE ANYIAM-OSIGWE RETURNS TO ARTISTE MANAGEMENT. thenationonlineng.net (17 September 2016). Retrieved on 24 September 2016.
  11. Michael Anyiam-Osigwe, brother of AMAA founder shot dead. premiumtimesng.com. Retrieved on 22 September 2016.
  12. Michael Anyiam-Osigwe Is Dead, Killed By Armed Robbers. saharareporters.com. Retrieved on 22 September 2016.
  13. CHIEF (MRS.) DOROTHY CHINYERE ANYIAM-OSIGWE (OON). Archived from the original on 23 September 2016. Retrieved on 22 September 2016.
  14. "Why my marriage crashed – Peace Anyiam-Osigwe". Retrieved on 22 September 2016.