Peter Okebukola

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Peter Okebukola
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoOkebukola Dezie
Aha enyerePeter Dezie
aha ọmaprofessor Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya17 Febụwarị 1951 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Asụsụ ọ na-edeBekee, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, onye nkuzi, docent, university teacher Dezie
Ọkwá o jionyeisi oche nwaanyi, Deputy Vice Chancellor Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Ibadan, Massachusetts Institute of Technology, Harvard University Dezie
agbụrụNdi Yoruba Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ájá ájá Dezie
Archive naMahadum National Open University nke Naijiria, Harvard University, National Association for Research in Science Teaching, Journal of Research in Science Teaching, Crawford University Dezie
Ihe nriteOffice of the Federal Register, UNESCO awards Dezie

Peter Akinola Okebukola Àtụ:Postnom (amụrụ 17 Febụwarị 1948) bụ onye gụrụ akwụkwọ ofụma, onye nnyocha na onye nchịkwa na Naịjirịa.[1] O ji ọkwá ọkammụta ọpụrụiche na ngalaba Computer Science Education na Mahadum Steeti Legọs (LASU) ma na-emerịsị ntinye na agụmakwụkwọ kemgbe afọ 1984.[2] Ọ na-eje ozi dịka onye isi kansụl na Mahadum Crawford[3] ma jide ọkwá onye isi oche nke Global University Network for Innovation (GUNi-Africa), netwọk na-akwalite ntinye ihe ọhụrụ nakwa ọrụ mmekọrịta ọha na eze na agụmakwụkwọ dị elu n'Afrịka.[4] Okebukola bụ onye natarala UNESCO Kalinga Prize for Communication of Science in 1992 — onye Afrịka izizi nwetara ụdịrị nkwanye ùgwù dị otu a maka ntinye pụtara ìhè na mgbasa ozi sayensị.[4]

Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Onye amụrụ na 17 Febụwarị 1948 na Ilesa, Steeti Osun, Naijiria, [5][6] Okebukola malitere njem agụmakwụkwọ ya na St. Malachy's College, Sapele, Delta State, wee nweta asambodo GCE Advanced Level na Remo Secondary School, Sagamu, Ogun State. n'afọ 1969.[4] Ọ gara Mahadum Ibadan, ebe ọ nwetara nzere bachelọ (B.Sc) n'afọ 1973, nzere masta (M.Sc) n'afọ 1979, na nzere ọkankuzi (Ph.D) n'afọ 1984 — ha niile na agụmakwụkwọ Sayensị. [5][7] Site n'ịnọgide n'isi ọmụmụ bayoloji edukeshọn, mmepe usoro ọmụmụ na nnwale, Okebukola kwalitere ǹkà ya site na ọzụzụ sayensị pụrụiche na teknụzụ na Massachusetts Institute of Technology (MIT) na Mahadum Harvard na Cambridge, USA.[4]

Ọrụ na Ime Nnyocha Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọrụ Ya[dezie | dezie ebe o si]

Okebukola malitere ịrụ ọrụ dị ka onye nlekọta akaụntụ n'ụlọ ọrụ Nigerian Explosives and Plastics Company, Legọs, n'afọ 1969.[4] N'ịgafe na nkega agụmakwụkwọ, o weere ọrụ nke onye nkuzi sayensị na Holy Saviour's College, Mushin, Legọs Naijiria, n'afọ 1970, na-aga n'ihu ịghọ onye isi nke ngalaba sayensị na Ososo Grammar School, Ososo, Naijiria, n'afọ 1973.[4] Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi nke ngalaba sayensị n'ụlọ akwụkwọ C.A.C. Teacher's College, Efon-Alaye, Naijiria, site n'afọ 1974 ruo 1978.[4] N'afọ 1978, o sonyeere Oyo State College of Education, Ilesa, Naijiria, dị ka onye isi nkuzi na mmụta sayensị, ebe ọ kụziri nkuzi na mmụta bayoloji, usoro ọmụmụ sayensị na nnyocha, na usoro nyocha nke agụmakwụkwọ.[4]

Mmekọrịta Okebukola ya na Mahadum Steeti Legọs (LASU) malitere n'afọ 1984 mgbe ọ malitere ọrụ dịka onye isi ngalaba mmụta sayensị.[8] N'ịbụ onye na-agbago n'ọkwá agụmakwụkwọ niile, ọ ghọrọ ọkammụta nke sayensị na mmụta kọmputa n'afọ 1989.[8] Usoro nkuzi ya gụnyere mmụta sayensị, mmụta kọmputa, mmụta gburugburu ebe obibi, mmụta nke hiwere isi n'ikuku, mmesi obi ike na agụmakwụkwọ dị elu, na nnyocha agụmakwụkwọ. Ọ chịkọtala ihe karịrị ụmụ akwụkwọ nzere ọkankuzi otu narị na ihe karịrị ụmụ akwụkwọ nzere mastas narị abụọ.[9] Ọ bụrụla onye isi ngalaba mmụta, onye isi ngalaba na-ahụ maka sayensị gburugburu ebe obibi, onye isi ụlọ ọrụ maka ọmụmụ ihe izugbe nke Naijiria, onye isi ụlọ ọrụ maka ọmụmụ atụmatụ, na onyeisi oche nke kọmitii ndị isi ngalaba.[9] N'afọ 2017, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye ọkàmmụta ama ama nke sayensị na mmụta kọmputa na LASU.[9]

Okebukola na-eje ozi dị ka onyeisi oche kansụl na Mahadum Crawford, ọnọdụ ọ nọrọla kemgbe afọ 2015. Ọzọkwa, ọ bụ onyeisi oche Board of Trustees na Mahadum Caleb, mahadum ọzọ mmadụ nkịtị nwe na Steeti Legọs, Naijiria. [9] Ọ bụ onye òtù bọọdụ ndị isi oche nke Mahadum Teknụzụ Bells, Mahadum Afe Babalola, na Mahadum National Open University of Nigeria.[9] Ọ na-edu Global University Network for Innovation (GUNi-Africa) kemgbe 2000 ma na-eje ozi dị ka onye isi oche nke Okebukola Science Foundation, otu na-abụghị ndị gọọmentị na-akwado mmụta sayensị na nyocha na Africa.[8]

Okebukola jere ozi dị ka onye ndụmọdụ na UNESCO, UNICEF, World Bank, UNDP, African Union, Association of Africa Universities, na International Council of Associations for Science Education.[8] O mere ntinye n'imepe usoro mmesi obi ike na nzere ntozu nke Pan-Afrika, nguzobe nke African Quality Rating Mechanism, na mmejuputa atumatu nke African Higher Education Harmonization Strategy.[8] Ọ bụbu onye na-edu ndú, na-enye ọzụzụ n'ịntanetị nye ihe karịrị mmadụ puku iri na ngalaba agụmakwụkwọ na mahadum iri isii na abụọ n'ófè Africa ma buru ụzọ na-eduzi mmemme e-learning maka ndị ọrụ gọọmenti etiti na Naijiria, gụnyere ihe karịrị ndị nsonye puku iri asaa. [10] Kemgbe afọ 1986, Okebukola enyela aka n'ime ka a mara maka sayensị nke ọma n'Africa.[11] O jeela ozi dị ka onye ndụmọdụ n'ọtụtụ mba Africa, na-enye aka na mmepe na mmejuputa atumatu maka ịkwalite mmụta sayensị na nzikọrịta ozi. Ọzọkwa, o mepụtala ma kwadoo ọtụtụ mmemme redio na telivishọn gbasara sayensị na teknụzụ, yana ọrụ ederede, gụnyere akwụkwọ na akụkọ gbasara mmụta sayensị na nzikọrịta ozi.[10]

Ime Nnyocha Ya[dezie | dezie ebe o si]

A na-ekwunyere Okebukola na ọ bụ ya malitere usoro mgbaso culture-techno-contextual (CTC) nke nkuzi na mmụta sayensị.[12] Usoro nkuzi a, nke ewepụtara na ngwụcha 1980s na mmalite 1990s, na-ejikọta omenala, teknụzụ na gburugburu ebe obibi n'ime nkuzi sayensị. Nnyocha Okebukola, gbanyere mkpọrọgwụ na nchọgharị mmetụta gburugburu ebe obibi na mmụta sayensị, na-egosipụtasi ike ịdị irè nke usoro mgbaso CTC n'ịkwalite mmasị ụmụ akwụkwọ, mkpali, imepụta ihe ahụrụ anya, na njigide na sayensị.[13]Àtụ:Edazuola nkwenye Okebukola na-akwado maka nnabata na ngbanwe nke usoro CTC na usoro ọmụmụ sayensị, akwụkwọ ọgụgụ, nkuzi nkuzi, na nlebanya.[13]

Pọtụfoliyo nnyocha nke Okebukola gụnyere mpaghara dị iche iche dị ka kọmpụta n'agụmakwụkwọ na ọmụmụ ihe n', ikuku (e-learning), mmụta site n'imekọ ihe ọnụ, atumatu metacognitive na mmụta sayensị, mmụta gburugburu ebe obibi, mmesi obi ike na agụmakwụkwọ ka elu, na nnwale agụmakwụkwọ.Àtụ:Cn Ihe omepụtara dịka onye gụrụ akwụkwọ ofụma gụnyere mbipụta nke ihe karịrị ọrụ otu narị na iri ise na mba ụwa yana ihe ngosi ọgbakọ mba na mba karịrị narị abụọ.[8] Okebukola bụrịsị onye odezi akwụkwọ ma ọ bụ onye òtù ndị ndezi akwụkwọ maka ọtụtụ akwụkwọ akụkọ mba na mba dị iche iche na sayensị, kọmpụta na agụmakwụkwọ gburugburu ebe obibi.[11]

Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya[dezie | dezie ebe o si]

Ọ natara ihe nrite afọ 1992 nke UNESCO Kalinga Prize for Communication of Science, [8], ihe nrite 1994 Distinguished Researcher Award sitere na òtù Science Teachers Association of Nigeria, na ihe nrite afọ 1997 nke Distinguished Researcher Award sitere na National Association for Environmental Education. [8]

  • Ihe nrite ọla edo afọ 1989 sitere na International Council of Associations for Science Education, nrite ọla edo nke afọ 1991 sitere na International Society for Technology in Education, na nrite ọla edo nke afọ 1993 sitere na International Association for the Evaluation of Educational Achievement.[8]
  • UNESCO Kalinga Prize maka Nkwukọrịta Sayensị, nke UNESCO nyere ya n'afọ 1992, na-mmata nke ntinye ya pụtara ìhè na mgbasa ozi sayensị. Okebukola bụ onye Africa mbụ nwetara ihe nrite a.[8]
  • Nrịgo mmụta sayensị na-asọpụrụ na Mahadum Jos, Naijiria (2000), Mahadum Ilorin, Naijiria (2001), Mahadum Uyo, Naijiria (2002), Mahadum Abuja, Naijiria (2003), na Mahadum Benin, Naijiria (2004).[14]
  • Ihe Nrite Officer of Order of the Federal Republic (OFR), nke onye isi ala Naijiria nyere ya n'afọ 2004.[9]

Ndụ Onwe Onye Ya[dezie | dezie ebe o si]

Okebukola lụrụ Olufunmilayo Okebukola, onye ọkammụta n'isi ọmụmụ sociology na onye bụbu onye isi ngalaba mmụta mmekọrịta ọha na eze na LASU.[6] Di na nwunye a nwere ụmụ anọ. Onye bụ onye òtù Kraịst, Okebukola na-ekpere Chi ya n'ụlọ ụka Redeemed Christian Church of God.[6]

Edensibia[dezie | dezie ebe o si]

Ebe Ha Si[dezie | dezie ebe o si]