Phantom Plague

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Phantom Plague
akwụkwọ

Phantom Plague: How Tuberculosis Shaped our History bụ akwụkwọ edemede na-abụghị akụkọ ifo nke afọ 2022 banyere akụkọ ihe mere eme nke ụkwara nta sitere n'aka onye nta akụkọ ahụike Vidya Krishnan.[1][2]

Ọ na-ekpuchi akụkọ ihe mere eme nke ụkwara nta sitere na narị afọ nke iri na itoolu, iri abụo, na mmalite nke iri abụọ na otu, site n'ịghọta mmalite ọrịa ahụ ruo na ahụike ọha na-eze nke oge a na ntinye aka ọgwụ. Akwụkwọ ahụ na-enyocha etu ọrụ ebere na'ụzọ na na - adịghị mma, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ịkpa ókè agbụrụ, na okwu na "ịkpa oke agbamume".

Akwụkwọ ahụ etoola ya site na New York Times, na nyocha nke Kirus.

Mmepụta[dezie | dezie ebe o si]

Krishnan dere akwụkwọ bụ Phantom Plague ihe karịrị afọ asaa, ya mere tupu na n'oge ọrịa COVID-19.[3]

Nchịkọta[dezie | dezie ebe o si]

Phantom Plague na-ekpuchi akụkọ ihe mere eme nke ụkwara nta na narị afọ nke iri na itoolu na mba New York City slums ruo n'oge India.[4][5] Ọ na-emegide mgbasa nke ụkwara nta site na obodo ndị jupụtara n'obodo ukwu, mana ọ na'ekwukwa banyere ndị ọrịa ụgbụgbọ ụbụrụ bara ọgaranya dị ka Mazi George Orwell, Franz Kafka, Eleanor Roosevelt, Frédéric Chopin, na ụmụnne nwanyị Brontë.[6][7]

Akwụkwọ ahụ na-edekọta ọgwụgwọ ndị mmadụ n'oge gara aga, ịnwa usoro ahụike ọha na eze, na ịrị elu nke ngwọta sayensị.[6][5] Ọ kpọtụrụ ọrụ Ignaz Semmelweis, Robert Kock, Joseph Lister, na Louis Pasteur aha iji kwalite nghọta mmadụ banyere ọrịa ndi na efe efe.[3] Ọ na-edekọ ịrị elu nke echiche nje, ojiji na iji ọgwụ nje eme ihe n'ụzọ na'ezighị ezi na mmetụta ọrịa na ọnọdụ ụlọ jupụtara na mgbasa ọrịa dị iche iche.[6] Ọ na-ekwu na atụmatụ nke World Health Organization na 25% nke ụwa nwere ụkwara nta.[6] Akwụkwọ ahụ na-ekwu maka ihe ize ndụ nke ụkwara nta n'eguzogide ọgwụ ọjọọ na mgbalị ndị na - dara ada iji belata mgbasa ngwa nke ọrịa ụgbụgbọ.[4][5]

  1. Tinsley. Two books on death and disease, but only one of them hits the mark (en). The Irish Times. Retrieved on 2022-02-13.
  2. Harper. "‘Phantom Plague’ Review: Tuberculosis Past, and Future", The Wall Street Journal, 18 Feb 2022.
  3. 3.0 3.1 Mandavilli. "Battling an Ancient Scourge", The New York Times, 2022-02-05. Retrieved on 2022-02-10. (in en-US) Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":3" defined multiple times with different content
  4. 4.0 4.1 Irwin (2022-01-09). 'The Phantom Plague' Looks at How Tuberculosis is Again a Threat Due to Unequal Medical Care (en-US). FangirlNation Magazine. Retrieved on 2022-01-17. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  5. 5.0 5.1 5.2 30 Best Epidemic Books of All Time (en). BookAuthority. Retrieved on 2022-01-17. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":1" defined multiple times with different content
  6. 6.0 6.1 6.2 6.3 PHANTOM PLAGUE | Kirkus Reviews (in en).  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":2" defined multiple times with different content
  7. Brink. "Before COVID, TB was the world's worst pathogen. It's still a 'monster' killer", NPR, 2022-02-13. Retrieved on 2022-02-13. (in en)