Priscilla Nzimiro

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Priscilla Nzimiro
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Aha enyerePriscilla Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya30 Eprel 1923 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya22 Maachị 1951 Dezie
Ebe ọ nwụrụGlasgow Royal Infirmary Dezie
ŃnéMary Nzimiro Dezie
Ọrụ ọ na-arụphysician Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Glasgow Dezie

AdaAda Priscilla Nzimiro (a mụrụ n'ọnwa April dị n'ụbọchị iri atọ n'afọ 1923 nọrọ wee ruo ọnwa March n'ụbọchị iri abụọ na abụọ n' afọ 1951) bụ dọkịta a zụrụ azụ nke ọma, ezinaaụlọ sitere n' Oguta nke dị n' Imo State n'oge a . Ọ gara Mahadum nke di na Glasgow ma nweta Asambodo Bachelor Digrii maka ọzụzụ dibia oyibo Ọ nwetakwara nzere Bachelor Digrii n'ihe gbasara ịwa afọ nke ndị bekee na akpọ Surgery (MB ChB) na afọ 1950. Nzimiro bụ nwanyị mbụ n' Igbo niile ka gụọ ma nweta ọzụzụ dịka dọkịta. [1] [2] [3] E kwuru na Nzimiro nwụrụ ọnwụ ike ka ọ mere otu afọ ọ gụchara akụkwọ ma nweta ọzụzụ dika Dibia oyibo . [4]

Mmalite ndụ na agụmakwụkwọ[dezie | dezie ebe o si]

A mụrụ Priscilla Nzimiro na Port Harcourt , isi obodo Rivers State ugbu a n'ọnwa April dị n'ụbọchị iri atọ n' afọ 1923. Ọ bụ Ada Maazị Richard Nzimiro na nwunye ya Mary Nwametu Onumonu. Ụmụ nwanne ndị ọzọ bụ Richard, Ifediora na Nnamdi ha niile bụcha ụmụnwoke. [5] Nna ya so na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ rụrụ dika Meyọọ nke mbụ nke obodo Port Harcourt site n'afọ 1956 rue mgbe ọ nwụrụ n'afọ 1959. Nne ya, onye ahịa nke bara ọgaranya, na-ere mmanụ nri , nnu na ụfọdụ ihe esi Europe arụpụta. [6] Mary na Richard Nzimiro hụrịtara onwe ha mgbe Mary na-aga ụlọ akwụkwọ elementrị na St. Joseph's Girls 'Convent di na Asaba City ma lụọ ya n'afọ 1920 mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ. [1] [7]

Na 1945, Nzimiro debara aha na Mahadum Glasgow dị na Scotland maka agụmakwụkwọ na ọzụzụ dịka Dibia oyibo y . [5] Ọ gụsịrị akwụkwọ ma nweta MB ChB na 1950 wee ghọọ nwanyị mbụ n'ala Igbo bu dọkịta. [1] [2] [3]

Ka ọnwa March dị mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na abụọ n'afọ 1951, Nzimiro nwụrụ na Glasgow Royal Infirmary mgbe ọ dị afọ iri abụọ na asaa . [2] Ọnwụ ya bụ ihe a na atụghị anya tụmadị ọtụtụ mmadụ ọkachasị nne na nna ya, ndị ikwu na ibe nakwa ndị enyi ya. Akụkọ emesịrị nweta na-ekwu na ọnwụ ya maọbụ ihe gburu ya edoghaghị mmadụ anya. Nke a gosiri na ọ nwụghị onwụ Chi ya. [4] E yiri ya na Oguta ka ọnwa April di n'ụbochi iri abụọ na asaa n'afọ 1951. [2]

Mgbe Nzimiro nwụsịrị, William Wilberforce Academy (WWA), bụ otu n'ime ụlọ akwụkwọ abụọ Nne na Nna ya rụrụ n; Oguata n;afọ 1945 gbanwere aha ya zawazie Priscilla Memorial Grammar School. A mere nke a iji kwanyere ya ùgwù na idekọ ihe niile ọ rụpụtara n' ihe gbasara dibia oyibo. [6] Dika nwanyi dibia nke mbu nke si na mpaghara ya, Nzimiro kpaliri ọtụtụ mụọ ụmụ nwanyi ndị na-eto eto igụ ihe gbasara dibia oyibo . [8]

References[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 Igbo Women and Economic Transformation in Southeastern Nigeria, 1900–1960. 
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Gender, culture and development : essays in honour of Hon. Dame Victoria N. Akanwa. 
  3. 3.0 3.1 Ada Priscilla Nzimiro. Archived from the original on 7 August 2016. Retrieved on 2 July 2016.
  4. 4.0 4.1 Gallery of great Igbo people. Retrieved on 2 July 2016.
  5. 5.0 5.1 (2010) Gendering the African diaspora : women, culture, and historical change in the Caribbean and Nigerian hinterland. Indiana University Press. 
  6. 6.0 6.1 Nzimiro, Mary (1898–1993). Gale Research Inc. (1 January 2002). Archived from the original on 25 January 2013. Retrieved on 2 July 2016.Àtụ:Subscription required
  7. (2012) Dictionary of African biography. Oxford University Press. 
  8. (1974) The Conch, Volume 6. Conch Magazine Limited. Retrieved on 2 July 2016.