Quincy Olasumbo Ayodele

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Quincy Olasumbo Ayodele
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha ezinụlọ yaAyodele Dezie
Ebe ọmụmụAbeokuta Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Yoruba Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụherbalist Dezie
ebe agụmakwụkwọMoshood Abiola Polytechnic Dezie
Ebe obibiLagos Dezie
Quincy Sumbo Ayodele
Born
NationalityNigerian
Occupation
  • Herbal medicine consultant
  • Entrepreneur
  • Banker
  • Herbal medicine researcher
Known forHerbal medicine and herbal slimmers
TitleChief Executive Officer

Quincy Sumbo Ayodele, nke a maara dị ka Quincy, bụ onye Naijiria na-ahụ maka iji mkpọrọgwụ na mkpaakwụkwọ were agwọ oria, onye ọchụnta ego, onye na-ahụ maka ọgwụgwọ ahịhịa na nlekọta anụ ahụ na onye isi oche nke Quincy Herbals, onye Naijiria na-ahụ maka nlekọta ahụike ahịhịa. [1] Ọ bụ onye kọmitii ọkachamara nke Òtù Ahụ Ike Mba Ụwa na mmepe nke ọgwụ ọdịnala na omume Africa. Ọ bụ onye na-akwado maka ntinye ọgwụ ọdịnala Africa n'ime usoro nlekọta ahụike.

Quincy bụ onye guzobere Herbal Slimmers and Weight Loss Association of Nigeria na ode akwukwọ nke mbu nke otu National Association of Nigerian Traditional Medicine Practitioners (NANTMP). O hibere otu a na-adịghị akwụ ụgwọ a kpọrọ Self-Employed Women Association of Nigeria (SEWAN), nke gbadoro anya na ịzụ ahịa ụmụ nwanyị. Tupu e hiwe Quincy Herbals, ọ bụ odeakwụkwọ na Societe Generale Bank Nigeria Limited ebe o mechara bụrụ onye enyemaka nke onye isi ụlọ akụ ahụ. [2]

Ndụ Mmalite na ọrụ[dezie | dezie ebe o si]

Amuru ya n'Abeokuta, isi obodo Ogun State, Nigeria n'ime ezinaụlọ nke Chief Amos Oluwole Sodimu. [3] Ọ nọrọ na nọrọ nne nna ya, Mabel Osunmi Sodimu n'ime obodo Olorunsogo mgbe nne na nna ya kwagara United Kingdom bụ onye ọ mụtara nkà ọgwụ mkpọrọgwụ na mkpaakwụkwọ n'aka ya . [2] Ọ gara African Church Primary School dị na Yambi Village na Comprehensive High School, Ayetoro nke di kwa na Ogun steeti tupu ọ gaa Ogun State Polytechnic maka nzere mana ọ hapụrụ ụlọ akwụkwọ ahụ tupu ule ikpeazụ ịga Pitman's Central College, London, ebe ọ nwetara nzere diploma. n'ọchịchị odeakwụkwọ. Ọ laghachiri Naijiria, sonye n'ọrụ Societe Generale Bank Nigeria Limited dịka odeakwụkwọ, ma mechaa bụrụ onye enyemaka nke onye isi ụlọ akụ ahụ. [4]

Ọ gbara arụkwaghịm ka o jere ozi ihe karịrị afọ iri na abụọ na ngalaba ụlọ akụ, o mere nke a ka o wee guzobe azụmahịa nke ya. Tupu o hiwe Quincy Herbals, o nwetara diplọma na nkà mmụta ọgwụ sitere na Nigerian College of Natural Medicine, ụlọ akwụkwọ mgbakwunye nke Federal Ministry of Science and Technology, Victoria Island, Lagos. Ọ gụkwara akwụkwọ gbasara ọrịa naturopathy na United States wee gaa ọtụtụ ọmụmụ ihe gbasara ọgwụgwọ ọdịnala na China. [4]

O ji pụkụ naira ise wee hiwe Quincy Herbals (dọla iri na asatọ na 6 Julaị 2016). A na-enweta ụfọdụ n'ime ego ahụ site na ire puff-puff. [5]

Quincy bụ onye kọmitii ọkachamara na otu World Health Organisation na mmepe nke ọgwụ ọdịnala na omume Africa. [1] Ọ bụ onye na-akwado maka ntinye ọgwụ ọdịnala Africa n'ime usoro nlekọta ahụike. Ọ bụ onye guzobere Herbal Slimmers and Weight Loss Association of Nigeria na onye ode akwukwọ nke mbu nke National Association of Nigerian Traditional Medicine Practitioners (NANTMP) [6] O guzobekwara otu nzukọ anaghị akwụ ụgwọ, Self-Employed Women Association of Nigeria. (SEWAN) nke na-elekwasị anya na ịzụ ahịa ụmụ nwanyị. [1] [7]

Ndụ onwe[dezie | dezie ebe o si]

Quincy lụrụ Engr. John Oladipo Ayodele. Ha nwere ụmụ atọ: Tobi Ayodele Keeney, onye nwetara nzere masta na nọọsụ na Mahadum Maryland, Baltimore, [8] Marita Tola Abdul na John Temi Ayodele. Ha nwekwara ụmụ ụmụ.

Hụkwa[dezie | dezie ebe o si]

Ebensidee[dezie | dezie ebe o si]

  1. 1.0 1.1 1.2 "I Talk to Weeds and Plant- Tradomedicine practitioner", The Nation, The Nation. Retrieved on 19 June 2016.
  2. 2.0 2.1 "My Beauty is Natural- Quincy", modernghana.com, modernghana. Retrieved on 19 June 2016.
  3. "Quincy buries Dad in grand style", mynewswatchtimesng.com, mynewswatchtimesng. Retrieved on 19 June 2016.
  4. 4.0 4.1 "My husband and I are inseparable - says Quincy", encomium.ng, encomium.ng. Retrieved on 19 June 2016.
  5. "Why am Succeeding in Business and Marriage-Quincy Ayodele", theyesng.com, theyesng. Retrieved on 19 June 2016.
  6. "I Take Slimming Garri Everyday - Quincy Ayodele", /timelineng.com, /timelineng. Retrieved on 19 June 2016.
  7. "Like dressing African Atires", newtelegraphonline.com, newtelegraphonline. Retrieved on 19 June 2016.
  8. Adetutu. "‘Why I didn’t consider colour in marriage’", The Nation News, The Nation News, May 3, 2015. Retrieved on July 11, 2016.

Njikọ mpụga[dezie | dezie ebe o si]